Igbo Mass Readings for July 20 2024, Satọde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 20 2024, Satọde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-5
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Micah
Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eche ihe ọjọọ n’obi ha na ndị niile na-edina n’akwa ha na-eche ajọ echiche. Ha anaghị echere ka chi bọọ tupu ha emewe ihe ọjọọ ebe ọ bụ na ha nwere ike ime otu a.
Ha ji aka ike anara mmadụ mbara ubi na ụlọ ebe obibi. Ha na-akpagbu mmadụ na ezinụụlọ ya, nwoke na ihe nketa ya. Ya bụ, Yahweh na-ekwu nke a: “Ugbu a ana m eche maka ahụhụ m ga-ata agbụrụ a, nke o nweghị onye ọbụla ga-agbalahụ.
Ụnụ agaghị enwe ike iwelite isi ụnụ mgbe o ruru, n’ihina oge ahụ ga-adị oke egwu n’ezie. Ụbọchị ahụ ha ga-eme ụnụ akaja, ha ga-agụrụ ụnụ egwu akwa na-asị: “A narala anyị ihe niile, e kerichaala ha ala ndị nke m.
O nweghị onye ọbụla nwere ike iweghachiri ha ya. E nyefeela mbara ubi anyị n’aka ndị meriri anyị n’agha. N’ihi nke a, ụnụ agaghị enwe onye ọbụla ga-atụpụtara ụnụ oke ọ bụla n’ime obodo nke Chineke.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 10:1-2, 3-4, 7-8, 14
Azịza: Onyenweanyị echezọkwala ndị ogbenye
1. Chineke maka gịnị ka i ji gba nkịtị?
Maka gịnị ka i ji ezonarị anyị ugbu a ihe siri ike?
Ngala ndị ajọ mmadụ na-akpagbu ndị ogbenye,
ha na-adaba na ajụ atụmaatụ ndị ajọ mmadụ. Azịza
2. Ndị ajọ mmadụ na-anya isi banyere ihe ọjọọ ha niile,
ndị anya ukwu na-ekwutọ Chineke,
ndị ajọ mmadụ na-elefu ya anya
Ndị ajọ mmadụ anaghị eche echiche maka Chineke
na ngala ha, ha na-ekwu sị,
na o nweghị Chineke ọbụla dịnụ. Azịza
3. Mmegbu na aghụghọ juru ya n’ọnụ
ajọ ihe na okwu rụrụ arụ jupụtara ya ire.
Ọ na-ezo onwe ya n’ọhịa achara
n’ebe ọ dịghị onye ga-ahụ ya, iji gbuo ndị ọ dịghị ihe ha mere.
Anya ya abụọ na-ewere nzuzo nyogide onye na-ahụjuanya. Azịza
4. Gị onwe gị ahụla mwute na uru dị n’ọnọdụ m
Ị naghị eleghara ya anya
nwa ogbenye na-atụkwasịobi na gị
Ọ bụ gị na-enyere ndị enwe nne, enwe nna aka. Azịza
MBEKU – 2 Tim 1:10
Alleluia, Alleluia:
Onye nzọpụta anyị Jesu Kristi mebiri ọnwụ, bịa wetara anyị ndụ site n’oziọma ahụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 12:14-21
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Nke a mere ndị Farisii jiri pụọ gbaba izu otu ha ga-esi gbuo ya. Jesu maara nzube ha, were si ebe ahụ pụọ. Ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya, ọ gwọrọ ha niile.
O nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ ndị ọzọ maka ya. Nke a bụ iji mezupụta ihe onye amụma Aịzaya kwuru sị: “Lee, onye a bụ nwodibo m, onye m họọrọ, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya na amasị m.
Mmụọ m ga-anọnyere ya, Ọ ga-ekwusara mba niile ikpe ziri ezi. Ya na mmadụ agaghị ese okwu, Ọ gaghị etisikwa mkpu ike, nke mmadụ na-anụ olu ya n’ama.
Ọ gaghị emegide ndị na-adịghị ike mọbụ menyụọ ọkụ na-anyụ anyụ, wee ruo mgbe o mere ka ikpe ziri ezi nwee mmeri. Ọ bụkwa n’aha ya ka mba niile ga-atụkwasịobi.”
Igbo Mass Readings for July 21 2024, Ụka nke Iri na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ
Igbo Mass Readings for July 20 2024, Satọde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.