Igbo Mass Readings for August 17 2024, Satọde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 17 2024, Satọde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:1-10, 13, 30-32

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel

Okwu nke Yahweh wee bịakwute m ọzọ sị, “Gịnị kpatara i ji na-atụ ilu a ugboro ugboro n’ala Izrel sị, ndị nna ataala mkpụrụ osisi na-achaghị acha, mọbụ ụmụ ha ka eze na-ejiji?”

Ka m na-adị ndụ, Ọ bụ Yahweh Chineke na-ekwu, agaghị atụkwa ilu a ọzọ n’ala Izrel. Lee mkpụrụ obi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, mkpụrụ obi ọbụla mehierenụ ga-anwụ.

Onye ọbụla bụ onye eziomume, na-emekwa ihe ziri ezi na ihe dị mma. Ọ bụrụkwa na ọ anaghị eri ihe n’elu ugwu mọbụ welite anya ya n’ebe arụsị niile nke Izrel dị;

o merụghị nwunye onye agbataobi ya mọbụ gakwuru nwaanyị mgbe ọ nọ n’oge ya; ọ naghị emegbu onye ọbụla, kama ọ na-enyeghachi onye o ji ụgwọ ihe ya, ọ naghị apụnarị mmadụ ihe ya n’ike, ma ọ na-enye onye agụụ na-agụ nri ya, na eyiwekwa onye gba ọtọ akwa, ọ naghị agbazinye ego n’ọmụrụ nwa, mọbụ nara ụma,

ọ na-ewepụ aka ya na mpụ, ọ na-ekpe ikpe ziri ezi n’etiti mmadụ na ibe ya, ọ na-aga ije n’ụkpụrụ m niile, ma kpachapụ anya n’idebe ihe niile m nyere n’iwu, onye dị otu a bụ onye eziomume, ọ ghaghị ịdị ndụ,

Ọ bụ Yahweh Chineke na ekwu. Ma ọ bụrụ na ọ mụtara nwa nke bụ onye ohi, onye na-akwafu ọbara, ọ na-agbazinye ego n’ọmụrụ nwa, na-anarakwa ụma; onye dị otu a ọ ga-adị ndụ?

O meela ihe arụ niile ndị a; ọ ga-anwụrịrị, ọbara ya ga-adịkwa ya n’isi. Ya mere, aga m ekpe ụnụ ikpe, ụlọ Izrel, onye ọbụla dịka ụzọ ya si dị. Ọ bụ Yahweh Chineke na-ekwu.

Chegharịanụ ma sịnụ na mmehie ụnụ pụta, ka ajọomume ghara ịbụ ihe mbibi ụnụ. Tụfuonụ mmehie ụnụ niile nke ụnụ mere megide m; nwetaranụ onwe ụnụ obi ọhụrụ na mmụọ ọhụrụ.

Gịnị kpatara ụnụ ji chọọ ịnwụ, O! ụlọ Izrel? N’ihina enweghị m mmasị n’ọnwụ onye ọbụla, Ọ bụ Yahweh Chineke na-ekwu; ya bụ tụgharịanụ ka ụnụ dị ndụ.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 51: 10-11, 12-13, 16-17.

Azịza: Chineke kenye obi dị ọcha n’ime m.

1. Chineke kenye obi dị ọcha n’ime m

tinye n’ime m mmụọ ọhụrụ na nke siri ike.

A chụpụkwala m n’ihu gị,

anapụkwala m mmụọ nsọ gị. Azịza

2. Nyeghachikwa m añụrị nke nzọpụta gị,

were ezi mmụọ gị chedo m.

Aga m akụziri ndị ajọ mmadụ ụzọ gị,

Ka ndị njọ lọghachita azụ n’ebe ị nọ. Azịza

3. Ị naghị enwe mmasị ọbụla n’aja,

Aja nsureọkụ anaghị atọ gị ụtọ,

Aja a na-achụrụ Chineke bụ obi gbawara agbawa,

Ị naghị ajụ obi gbawara agbawa na nke loghara elogha. Azịza

MBEKU – Ps 19:9

Alleluia, Alleluia:

Ịtụ egwu Onyenweanyị bụ ihe dị mma: ọ na-adị ebeebe; Ikpe nke Onyenweanyị bụ eziokwu; Ha niile kwụkwa ọtọ.

Alleluia

OZIỌMA – 19:13-15

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ahụ, ndị mmadụ kuteere Jesụ ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka wee kpeere ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba.

Jesu sịrị ha, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m, ụnụ egbochila ha, n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.” O bikwasara ha aka wee si n’ebe ahụ pụọ.

Igbo Mass Readings for August 18 2024, Ụka nke Iri Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ

Igbo Mass Readings for August 17 2024, Satọde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 11, 2022