Igbo Mass Readings for June 21 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 21 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:1-10
Ihe Ọgụgụg e wetara a’akwụkwọozi nke abụọ Pọl Deguara ndị Kọrịnt
Aghaghị m ịnya isi, ọ bụ ezie na ọ baghị uru. Ugbu a, aga m akọ ọhụ m hụrụ na ihe mkpughe dị icheiche nke Onyenweanyị kpugheere m. Amaara m otu nwoke bụ onye nke Kristi, onye e weliri elu n’eluigwe nke atọ, afọ iri na anọ gara aga.
Amaghị m ma ihe a o mere na mmadụ, mọbụ n’ọhụ, sọọsọ Chineke maara. Amatakwara m na e weliri nwoke a elu rigoro Paradaịs. Ọzọ, amaghị m ma ihe a o mere n’ihe, mọbụ n’ọhụ. Sọọsọ Chineke maara.
N’ebe ahụ nwoke ahụ nụrụ ihe ụfọdụ nke mmadụ na-apụghị ịkọ, na ihe nzuzo nke ọnụ na apụghị ikwu. Aga m eji mmadụ dị otu a nyaa isi.
Agaghị m anya isi maka onwe m, kama naanị n’ihe ndị na-egosi adịghị ike m. Ọ bụrụ na achọrụ m ịnya isi agaghị m anya isi ka onye nzuzu, n’ihina aga m ekwu naanị eziokwu Otu ọ dị, agaghị m anya isi ka onye ọbụla ghara ịgụ ọnọdụ m karịa ihe ọ hụrụ n’ime m, mọbụ karịa ihe ọ nụrụ n’ọnụ m.
Ka m ghara ịfụli onwe m elu karịa n’ihi ihe ịtụnaanya na oke mkpughe nke Chineke kpugheere m. E tinyere ihe mgbu n’anụahụ m ka ọ na-adụ m dịka ogwu.
Ihe mgbu a dị n’anụ ahụ m na-eti m aka dịka mmụọ nke Ekwensu, na-eme ka m ghara ịfụli onwe m elu karịa. Ugboro atọ ka m rịọrọ Dinwenụ ka o wepu ihe a n’ahụ m.
Mana ọ zara m sị, “Amara m eruorola gụ! N’ihina ike m na-apụta ihe mgbe ike mmadụ adịghị”. N’ihi nke a obi dị m ụtọ nke ukwu mgbe m na-anya isi n’ime adịghị ike m niile, ka ihe nke Kristi wee dakwasa m.
Ọ bụ n’ihi Kristi ka m na anọgide n’adịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isiike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasa dị icheiche. N’ihina mgbe m adịghị ike ka m na-enwe ike karịa.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 34:7-8, 9-10, 11-12
Azịza: Detu iri ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma!
1. Mmụọọma nke Onyenweanyị na-echedo
ndị na-atụ ya egwu nche, Ọ na-azọpụta ha
Detu ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma!
Añụrị na-adịrị onye gbabara n’Onyenweanyị.
Azịza: Detu iri ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma!
2. Ụnụ ndị nsọ niile, tụọnụ Onyenweanyị egwu
n’ihina ndị niile na-atụ Onyenweanyị egwu
enweghị ihe na-akpa ha.
Agụụ nwere ike gụọ ụmụ ọdụm
mana iheọma anaghị akọ
n’ebe ndị na-achọ Onyenweanyị nọ.
Azịza: Detu iri ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma!
3. Bịanụ ụmụ ntakịrị, geenụ m ntị,
aga m akụziri ụnụ ịtụ egwu Onyenweanyị
Olee onye n’ime ụnụ chọrọ ibiru ndụ ya n’isi,
Onye nke chọ ogologo ndụ na iheọma?
Azịza: Detu iri ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma!
MBEKU – Jemis 1:18
Alleluia, Alleluịa:
Onyenweanyị jiri okwu nke eziokwu ahụ mee ka anyị pụta iche. Meekwa ka anyị bụrụ ndị mkpụrụ mbụ nke ihe o kere eke.
Alleluia.
OZIỌMA – 6:24-34
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “O nweghị onye pụrụ ịgbara nnaukwu abụọ odibo; n’ihina ọ ga-akpọ otu asị hụ nke ọzọ n’anya, mọbụ ọ ga asọpụrụ otu lelịa nke ọzọ.
Ụnụ apụghị ịbụ odibo Chineke na akụ nke ụwa. “Ana m agwa ụnụ eziokwu, ụnụ echegbula onwe ụnụ banyere ndụ ụnụ, ihe ụnụ ga-eri, mọbụ nke ụnụ ga-añụ, mọbụ banyere ahụ ụnụ; ihe ụnụ ga-eyi n’ahụ?
Ọ bụ na ndụ akarịghị ihe oriri, ka ọ bụ na ahụ akarịghị ihe a na-eyi n’ahụ. Leenụ ụmụ nnụnụ nke igwe, ha anaghị akọ ugbo, ha anaghịkwa ewe ihe ubi nke ha na-akpọkọba ihe n’ọba, ma Nna ụnụ nke eluigwe na-azụ ha.
Ọ bụ na ụnụ abaghị uru karịa ha? Kedụ onye n’ime ụnụ pụrụ ịtụkwasị ihe na ndụ ya site n’ichegbu onwe ya? Gịnị mere ụnụ ji echegbu onwe ụnụ banyere uwe ụnụ ga-eyi n’ahụ?
Leenụ okooko dị n’ubi ka ha si eto: ha anaghị arụ ọrụ, nke ha na-ekwe akwa. Ma agwa m ụnụ, ọbụladị Solomọn, na ikeike eze ya niile, amarughị mma ka otu n’ime okooko ndị a.
Ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa dị n’ubi mma, nke dị ndụ taa, echi a tụnye ya n’ọkụ, ọ bụ na ọ gaghị eyikwasị ụnụ uwe karịa, ụnụ ndị obere okwukwe?
Ya bụ, ụnụ echegbula onwe ụnụ sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri? Mọbụ gịnị ka anyị ga-añụ? Mọbụ gịnị ka anyị ga-eyi n’ahụ?
N’ihina ndị mba ọzọ na-achọ ihe ndị a niile, ma Nna ụnụ nke bi n’eluigwe maara na ihe ndị a dị ụnụ mkpa. Ma burunụ ụzọ chọba alaeze Chineke na eziomume ya, ihe ndị a niile ga-abụkwa nke ụnụ.
Ya bụ, ụnụ echegbula onwe ụnụ banyere ihe echi ga-eweta, n’ihina echi ga-echere onwe ya banyere mkpa nke dịịrị ya. Nsogbu ụbọchị ezuola maka ụbọchị ahụ.
Igbo Mass Readings for June 22 2025, Ụka Ahụ na Ọbara Kristi – Afọ nke Atọ
Igbo Mass Readings for June 21 2025, Satọde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.