Igbo Mass Readings for May 4 2024, Satọde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 4 2024, Satọde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 16:1-10
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
Pọl bịaruru Debe na Listra. N’ebe ahụ ka ọ hụrụ otu onye na-eso ụzọ Jesu, a na-akpọ Timoti. Nne ya bụ onye Juu nke kwere na Kristi. Nna ya bụ onye Grik.
Ụmụnna niile ndị nọ na Listra na Aịkonium gbara ezi ama maka Timoti. Ebe Pọl chọrọ ka Timoti soro ya n’ije, o biri ya ugwu, n’ihi na ndị Juu niile bi ebe ahụ maara na nna Timoti bụ onye Grik.
Mgbe ha nọ na njem n’obodo dị iche iche, ha nyefere n’aka ndị ụmụnna iwu ahụ ụmụazụ na ndị okenye nọ na Jerusalem nyere ha. Ndịozi ahụ dụkwara ha ọdụ ka ha jisie ike idobe ha.
Nke a mere ka nzukọ Kristi siwanye ike n’okwukwe ha. Ọnụ ọgụgụ ha na-abakwa ụba kwa ụbọchị. Ha siri n’ala Frijịa, na Galeshịa gafee, n’ihi na Mmụọ Nsọ gbochiri ha ikwu okwu Chineke na Eshịa.
Mgbe ha garuru n’oke ala Misịa, ha chọsiri ike ịga ozi na Bitinịa, ma Mmụọ nke Jesu ekweghị ha; ka ha si n’akụkụ Misịa gafee, ha garuru Troas. Pọl hụrụ ọhụ n’abalị, ebe otu nwoke, onye Masedonịa, guzo, na-arịọ ya sị: “Gafeta na Masedonịa, nyere anyị aka.”
Mgbe Pọl hụchara ọhụ nke a, anyị jikeere ngwangwa ịga Masedonịa, ebe anyị ji obi mara na Chineke akpọọla anyị ịgbasara ha oziọma.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 100: 1-2, 3, 5.
Azịza: Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ.
1. Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ,
werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu ya. Azịza
2. Maranụ na Onyenweanyị bụ Chineke,
ya kere anyị, Ọ bụkwa ya nwe anyị,
anyị bụ ndị nke ya, anyị bụkwa igwe atụrụ ya. Azịza
3. N’ihi na Onyenweanyị dị mma,
ịhụnaanya ya na-adị ebeebe,
ntụkwasịobi ya na-adịgide,
bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ. Azịza
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Ọ dị mkpa na Kristi ga-ata ahụhụ, sikwa na ndị nwụrụ anwụ bilie, wee banye n’ọchịchị nke ebube ya.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 15: 18-21.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Ọ bụrụ na ụwa akpọ ụnụ asị, chetakwanụ na o buru ụzọ kpọ m asị. Ọ bụrụ na ụnụ bụ ndị nke ụwa, ụwa ga-ahụ ụnụ n’anya dịka ndị nke ya.
Maka na ụnụ abụghị ndị nke ụwa, esiri m n’ụwa họpụta ụnụ; n’ihi nke a ụwa ga-akpọ ụnụ asị. Chetanụ ihe m gwara ụnụ, ohu anaghị aka onye nwe ya. Ọ bụrụ na ha sogburu m, ha ga-esogbukwa ụnụ.
Ọ bụrụ na ha dobere okwu m, ha ga-edobekwa nke ụnụ. Ihe ndị a niile ka ha ga-eme ụnụ n’ihi m, n’ihi na ha amaghị onye zitere m.
Igbo Mass readings for May 5 2024, Ụka Nke Isii N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ
Igbo Mass Readings for May 4 2024, Satọde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.