Igbo Mass Readings for March 23 2024, Satọde Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 23 2024, Satọde Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 37:21-28
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Izikel
Otu a ka Yahweh Chineke kwuru: Lee aga m akpọkọta ụmụ Izrel niile site n’obodo ndịọzọ ebe niile ha gbasara, aga m akpọbata ha n’ala nke ha; aga m eme ha otu mba n’ime ala ahụ n’elu ugwu niile nke Izrel, otu eze ga-achị ha niile, ha agaghịkwa abụ obodo abụọ ọzọ, ha agaghị ekewa ọzọ bụrụ alaeze abụọ.
Ha agaghị emerụkwa onwe ha ọzọ site n’ikpere arụsị na ọtụtụ ihe arụ ha ndịọzọ, ma ọ bụ site na njehie ha ọbụla, kama aga m azọpụta ha site na ndaghachi azụ niile nke ha jiri mehie m, aga m asacha ha, ha ga-abụ ndị nke m, m ga-abụ Chineke ha.
“Nwodibo m Devid ga-abụrụ ha eze, ha niile ga-enwe naanị otu onye ncheatụrụ. Ha ga-eso ụkpụrụ m niile ma kpachara anya n’idobe ntụziaka m niile.
Ha ga-ebi n’ala ahụ ebe nnanna ha biri, nke m nyere nwodibo m Jekọb; ha na ụmụ ha, na ụmụụmụ ha ga-ebi ebe ahụ ebeebe, Devid nwodibo m ga-abụkwa eze ha ebeebe.
Mụ na ha ga-agba ndụ nke udo, ọ ga-abụ ọgbụgbandụ ebeebe nke mụ na ha, aga m agọzi ha, meekwa ka ha bawanye n’ọnụọgụgụ, aga m edobe ebe nsọ m n’etiti ha ebeebe.
Ebe obibi m ga-adịnyere ha, aga m abụ Chineke ha, ha ga-abụ ndị nke m. Mgbe ebe nsọ m ga-adị n’etiti ha, mba niile ga-amata na mụ onwe m bụ Chineke edoola Izrel nsọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Jer. 31:10,11-12, 13.
Azịza: Onyenweanyị ga-echekwa anyị dịka onye ncheatụrụ si eche atụrụ ya.
1. “Geenụ ntị n’okwu nke Yahweh, ụnụ mba niile,
meenụ ka a nụ ya n’ụwa niile,
kwuonụ sị na onye nke kposara Izrel,
ga-ekpokọtakwa ya ọnọ ọzọ,
ọ ga-echekwa ya dịka onye ncheatụrụ si echekwaba igwe atụrụ ya. Azịza
2. Maka na Yahweh agbapụtala Jekọb,
mee ka o nwere onwe ya n’aka ndị na-akpagbu ya.
Ha ga-abịa bụọ abụ na-adasi ụda ike n’elu Zayọn.
Ha ga na-egbuke site n’afọọma na ịmamma Chineke,
maka mkpụrụ osisi ihe oriri dị iche-iche, mmanya na mmanụ,
na ụmụ ewu na atụrụ na igwe anụ ndịọzọ. Azịza
3. Mgbe ahụ ụmụagbọhọ ga-agba egwu ọñụ,
ụmụokorobịa na ndị okenye ga-ejupụtakwa n’añụrị.
Aga m agbanwe iru ụjụ ha ma mee ka ha nwee añụrị,
aga m atasị ha obi were obi añụrị gbanwee ahụhụ ha. Azịza
MBEKU – Ps. 130:5,7.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Ana m eche Onyenweanyị, n’ihi na ịhụnaanya ya dị ọkpụ, n’ime ya ka nnukwu nzọpụta dị.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 1:45-57.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị nsọ nke Jọn dere.
Mgbe ọtụtụ ndị Juu so Meri bịa n’ili ebe ahụ hụrụ ihe Jesu mere, ha kwenyere na ya. Ụfọdụ n’ime ha jekwuru ndị Farisii kọọrọ ha ihe Jesu mere. Nke a mere, ndị isi nchụaja na ndị Farisii ji kpọọ nnọkọikpe ha na-atule sị, “Gịnị ka anyị ga-eme?
N’ihina nwoke a na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube. Ọ bụrụ na anyị hapụ ya otu a mmadụ niile ga-ekwere na ya. Ndị Rom ga-abịakwa mebie ma Ebe Nsọ anyị ma obodo anyị.”
Ma otu onye n’ime ha aha ya bụ Kaịfas, bụ onye isi nchụaja n’afọ abụ sịrị ha, “Ụnụ amaghị ihe ọbụla. Ụnụ aghọtaghị na ọ kara ụnụ mma na otu onye ga-anwụ n’ihi mmadụ niile, ka obodo niile ghara ịla n’iyi.”
O kwughị nke a site n’onwe ya, kama, ebe ọ bụ onye isi nchụaja n’afọ ahụ, o buru amụma na Jesu gaje ịnwụ n’ọnọdụ ndị Juu. Ọ bụghị sọọsọ ndị Juu, kama ka ha kpokọta ụmụ Chineke ndị gbasara n’ebe niile.
Bido n’ụbọchị ahụ ndị Juu gbabara izu otu ha ga-esi gbuo Jesu. N’ihi nke a, Jesu anaghịzi agagharị ebe ọha ndị Juu ga-ahụ ya. Kama o siri n’ebe ahụ pụọ, gaa n’obodo ebe nke dị n’akụkụ ọzara, ruo obodo a na-akpọ Ifrem.
Ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụrụ n’ebe ahụ. Mgbe emume Ngabiga ruru nso, ọtụtụ si n’obodo gbagobe Jerusalem tupu emume Ngabiga ka ha wee doo onwe ha ọcha.
Ha na-achọ Jesu, na-ajụrịta ibe ha mgbe ha guzo n’ụlọnsọ sị, “Gịnị ka ụnụ na-eche? Ụnụ na-eche na ọ gaghị abịa n’emume a?” Ndị isi nchụaja na ndị Farisii enyelarị iwu ka onye ọbụla maara ebe Jesu nọ, mee ka ha mara ka ha wee jide ya.
Igbo Mass readings for March 24 2024, Ụka Igu (Ọmụ) Nkwụ – Afọ nke Abụọ
Igbo Mass Readings for March 23 2024, Satọde Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.