Igbo Mass Readings for February 11 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 11 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:9-24

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis

Ma Yahweh Chineke kpọrọ nwoke ahụ jụọ ya sị, “Olee ebe ị nọ?” Ọ zara ya sị, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị n’ime ogige, ụjọ jidere m n’ihina agba m ọtọ, m wee zoo onwe m.

Ọ jụrụ ya sị, “onye gwara gị na ị gba ọtọ? Ị taala mkpụrụ osisi ahụ m nyere gị iwu ka ị ghara ịta?” Nwoke ahụ azaa ya, “Ọ bụ nwaanyị a ị kpọnyere m ka mụ na ya biri; o nyere m mkpụrụ osisi ahụ m taa”. N’oge a ka Yahweh Chineke jụrụ nwaanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe nke a i mere?”

Nwaanyị ahụ zara ya, “Agwọ ahụ rafuru m mụ ataa ya”. Mgbe ahụ ka Yahweh Chineke sịrị agwọ ahụ, “N’ihina i mere ihe nke a, a bụọla gị ọnụ karịa ụmụ anụmaanụ niile dị n’ọhịa na nke dị n’ụlo; Ị ga-eji afọ gị na-aga ije bịa na-ata aja ụbọchị niile nke ndụ gị.

Aga m eme ka iro dịrị n’etiti gị na nwaanyị a, na n’etiti ụmụ gị na nke ya; ọ ga-azọpịa gị isi ma ị ga-ata ya n’ụkwụ”. Ọ bịa gwa nwaanyị ahụ sị, “Aga m eme ka ahụhụ nke ịmụ nwa gị bawanye; site n’ihe mgbu ka ịga-amụ ụmụ.

Ọchịchọ gị ga-abụ maka di gị, ọ ga na-achị gị”. Ọ bịakwa gwa Adam sị, “N’ihina i gere ntị n’olu nwunye gị ma taa osiso ahụ m sị gị atala abụmọnụ ga-adịrị ala n’ihi gị, site n’ike ọrụ aka gị ka ị ga-eji enweta ihe oriri site na ya, ụbọchị niile nke ndụ gị.

Ọ ga-amịtara gị agamevu na osisi anamịrị. Ị ga na-erikwa ahịhịa dị n’ime ọhịa. Site n’osisi nke ihu gị ka ị ga-eji enweta nri gị, ruo mgbe ị ga-alọghachi n’ala ebe ọ bụ na ya ka i si pụta; ntụ ka ị bụ, na ntụ ka ị ga-alaghachị”.

Nwoke ahụ gụrụ nwunye ya Iiv, n’ihina ọ bụ nne ndị niile dị ndụ. Yahweh Chineke kwataara Adam na nwunye ya uwe e ji akpụkpọ anụ mee ka ha yiri. Oge ahụ Yahweh Chineke sịrị, “Ugbu a, nwoke a adịla ka otu n’ime anyị, n’ịmara iheọma na ihe ọjọọ, ya bụ, a gaghị ahapụ ya ka o setịa aka ya ghọrọ mkpụrụ osisi nke ndụ, taa ya ma dịkwa ndụ ebeebe”.

Yahweh Chineke ewee chụpụ ya site n’ogige nke Eden ka o gburiwe ala nke e si na ya kpụta ya. Ọ chụpụ nwoke ahụ n’ime ogige nke Eden ma were ndị mmụọọma ndị nche dochie n’ọwụwa anyanwụ nke ogige Eden, ha ji mmaagha na-acha ọkụ ọkụ, nke na-egbu bam bam ka ọ na-eche ụzọ e si aba n’ebe osisi nke ndụ ahụ dị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.: 90:2, 3-4, 5-6, 12-13.

Azịza: Onyenweanyị bido ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ Ị bụ ebe nchedo m.

1. Tupu I kee ugwu niile,

tupu i kee ụwa na ihe niile dị n’ime ya,

Ị dịrịị adị ebeebe ebeebe. Azịza

2. Ị na-akpọghachi mmadụ na ntụ

site n’ịgwa ya sị, “Leghachinụ ebe ụnụ si, ụmụ mmadụ”.

N’anya gị puku afọ dịka otu ụbọchị,

dịka ụnyahụ nke gaferelanụ, mọbụ otu nche abalị. Azịza

3. I zachapụla mmadụ site na nrọ;

Ha dịka ahịhịa na epulite n’ụtụtụ,

mịa ifuru ma kpọnwụọ n’oge mgbede. Azịza

4. Kụziere anyị ịmata ka ndụ anyị siri dị nkenke,

Ka anyị were si otu a bụrụ ndị maara ihe.

Onyenweanyị medoo obi, iwe gị ọ ga-adị ọkpụ?

Meere ụmụodibo gị ebere. Azịza

MBEKU – Matiu 4:4

Alleluia, Alleluia:

“Ọ bụghị naanị site na nri ka mmadụ si adị ndụ, kama site n’okwa ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta”.

Alleluia.                                        

OZIỌMA – 8:1-10

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

N’oge ahụ, oke igwe mmadụ zukọkwara ọzọ. Ha enweghị ihe ha ga eri. Jesu kpọketere ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ebere igwe mmadụ a na-eme m n’ihina mụ na ha anọọla mkpụrụ ụbọchị atọ ugbu a ha enweghị ihe ha ga-eri.

Ọ bụrụ na m asị ha laba n’ụlọ ha n’erighị ihe ọbụla ha ga-ada n’ụzọ, n’ihina ụfọdụ n’ime ha si ebe tere aka bịa. Ndị na-eso ụzọ ya zaghachiri ya sị, “Kedụ ka mmadụ ga-esi nweta ogbe achịcha ga-ezuru igwe mmadụ a n’ime ọzara?” Ọ jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka ụnụ nwere?”

Ha azaa sị, “Ogbe achịcha asaa.” Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. Ọ naara ogbe achịcha asaa ahụ; mgbe onyechara ekele, ọ nyawaa ha, nye ndị na-eso ya ka ha kesaara igwe mmadụ achịcha ahụ. Ha nwekwara azụ nta olemaole.

Jesu gọzikwara azụ nta olemaole ahụ nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha kesakwaa, nye igwe mmadụ ahụ. Igwe mmadụ ahụ riri, rijuo afọ, ha tụtụkọtara iberibe fọdụrụ afọ nke juru nkata asaa.

Ha ruru ihe dịka puku mmadụ anọ Jesu zụrụ nri. O wee zilaa ha. Ngwangwa Jesu na ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ụgbọmmiri gaba obodo a na-akpọ Dalmanuta.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for February 11 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 8, 2022