Igbo Mass Readings for February 10 2024, Satọde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 10 2024, Satọde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:26-32; 13:33-34

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Ndịeze nke mbụ

Jeroboam chere n’obi ya sị, “Ka ihe si dịrị, alaeze a ga-alaghachiri ụlọ Devid. Ọ bụrụ na ndị a na-agbago n’ụlọnsọ nke Yahweh dị na Jerusalem ịchụrụ ya aja, obi ha ga-atụgharị ebe Rehoboam eze nke Juda.”

Ha ga-egbu m wee laghachikwuru Rehoboam eze Juda. Mgbe eze chechara nke a, o were ọlaedo kpụọ ụmụ chi abụọ, gwa ụmụ Izreel, “Nke a bụ Chineke ụnụ, onye kpọpụtara ụnụ n’ljipt.”

O dobere otu na Betel dobe nke ọzọ na Dan. Nke a wee bụrụ ihe ọjọọ, n’ihina ndị mmadụ na-aga na nke dị na Betel na nke ọzọ dị ebee dị anya n’agbụrụ Dan.

Jeroboam wugasịkwara ụlọ n’ebe dị elu were si n’etiti ndị mmadụ họpụta ndị ụkọchukwu ndị esighị n’agbụrụ Levaị. Jeroboam hiwekwara mmemme a ga na-eme mgbe ọnwa asatọ gbara abalị iri na ise, dịka emume a ana-eme na Juda.

Ọ chụnyeere ụmụ chi ndị ahụ ọ kpụrụ aja, na Betel, dobekwa na ya ndị nchụaja n’ebe dị elu ahụ o wuru. Mgbe nke a gachara Jeroboam esighị n’ụzọ ọjọọ ya pụta kama ọ na-eme onye ọbụla chọrọ ịbụ Ụkọchukwu, ụkọchukwu maka ebe ndị ahụ dị elu. Ihe nke a wee bụụrụ ezinụụlọ Jerobam mmehie nke mere ka a kwatuo ma kpochapụ ya n’elu ụwa.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 106:6-7, 19-20, 21-22

Azịza: Onyenweanyị cheta anyị n’ihi ịhụnaanya i nwere n’ebe ndị nke gị nọ.

1. Anyị na nna anyị ha emehiela,

anyị emeela ihe ọjọọ; ikpe mara anyị;

Mgbe nnanna anyị ha nọ n’ljipt

ha aghọtaghị ọrụ ebube gị. Azịza

2. Ha kpụrụ nwa chi na Horeb.

Ha kpọrọ isi ala nye arụsị a pịrị apị,

si otu a were ebube na otito dịịrị Chineke,

nye onyinyo ehi na-ata ahịhịa. Azịza

3. Ha chefuru Chineke nke zọpụtara ha,

onye nke rụrụ ọrụ dị egwu n’ala ljipt

Onye nke rụrụ ọrụ ịtụnaanya n’ala ljipt,

na ihe na-atụga egwu n’osimiri uhie. Azịza

MBEKU – Matiu 4:4

Alleluia, Alleluia:

“Ọ bụghị naanị site na nri ka mmadụ si adị ndụ, kama site n’okwa ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta”.

Alleluia.                                        

OZIỌMA – 8:1-10

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

N’oge ahụ, oke igwe mmadụ zukọkwara ọzọ. Ha enweghị ihe ha ga eri. Jesu kpọketere ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ebere igwe mmadụ a na-eme m n’ihina mụ na ha anọọla mkpụrụ ụbọchị atọ ugbu a ha enweghị ihe ha ga-eri.

Ọ bụrụ na m asị ha laba n’ụlọ ha n’erighị ihe ọbụla ha ga-ada n’ụzọ, n’ihina ụfọdụ n’ime ha si ebe tere aka bịa. Ndị na-eso ụzọ ya zaghachiri ya sị, “Kedụ ka mmadụ ga-esi nweta ogbe achịcha ga-ezuru igwe mmadụ a n’ime ọzara?”

Ọ jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka ụnụ nwere?” Ha azaa sị, “Ogbe achịcha asaa.” Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. Ọ naara ogbe achịcha asaa ahụ; mgbe onyechara ekele, ọ nyawaa ha, nye ndị na-eso ya ka ha kesaara igwe mmadụ achịcha ahụ. Ha nwekwara azụ nta olemaole.

Jesu gọzikwara azụ nta olemaole ahụ nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha kesakwaa, nye igwe mmadụ ahụ. Igwe mmadụ ahụ riri, rijuo afọ, ha tụtụkọtara iberibe fọdụrụ afọ nke juru nkata asaa.

Ha ruru ihe dịka puku mmadụ anọ Jesu zụrụ nri. O wee zilaa ha. Ngwangwa Jesu na ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ụgbọmmiri gaba obodo a na-akpọ Dalmanuta.

Igbo Mass Readings for February 11 2024, Ụka nke Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ

Igbo Mass Readings for February 10 2024, Satọde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 8, 2022