Igbo Mass Readings for May 11 2024, Satọde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 11 2024, Satọde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:23-28
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi
Mgbe ọ nọchara nwa oge na Antiọk, Pọl biliri gaa ebe dị iche-iche n’ala Galeshịa na Frijịa, na-eme ka okwukwe ndị na-eso ụzọ Jesu sie ike. N’oge a, otu onye Juu, a mụrụ n’Elegzandrịa, aha ya bụ Apọlọs, bịaruru n’obodo Efesus.
Nwoke a bụ onye ọka okwu, bụrụkwa onye maara ihe edere n’Akwụkwọ Nsọ nke ukwuu. Tupu ọ bịa, o nweela ndị kuzirila ya ụzọ nke Dinwenụ. O jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akuzi nke ọma ihe niile banyere Jesu.
Ma ihe ọ ma maka ya mgbe ahụ bụ naanị mmirichukwu nke Jọn. Ọ malitere na-ekwu okwu, n’atụghị egwu, n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Ma mgbe Prisila na Akwila nụrụ okwuchukwu ya, ha kpọọrọ ya laa n’ụlọ, kọwaara ya nke ọma, ihe niile banyere ụzọ nke Chukwu.
Mgbe Apọlọs kpebiri ịga biri n’ala Akaya, ndị ụmụnna gbara ya ume, ma dee akwụkwọozi nye ndị na-eso ụzọ Jesu, ndị bi n’ebe ahụ, ka ha nabata ya nke ọma.
O nyeere ndị niile nọ n’ebe ahụ aka nke ukwuu, bụ ndị kwerenụ site n’amara nke Chineke. N’ihina o ji oke ịrụ ụka merie ndị Juu n’ihu ọha, sitekwa n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi ha na Jesu bụ Kristi ahụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 47:2-3,8-9, 10.
Azịza: Chineke bụ eze nke ụwa niile.
1. Ndị mmadụ niile kụọnụ aka ụnụ,
were mkpu ọñụ tikuo Chineke.
N’ihina Onyenweanyị onye kacha dị elu ka anyị ga-atụrụ egwu,
ọ bụ nnukwu eze nke na-achị ụwa niile. Azịza
2. Chineke bụ eze nke ụwa niile,
werenụ ukwe abụọma kweere ya ukwe otito,
Chineke bụ eze na-achị mba niile,
Ọ nọ n’oche eze ya dị nsọ. Azịza
3. Ndị ndu nke ụwa niile ezukọọla,
dịka ndị nke Chineke Abraham.
Ụta nke ndị agha nke ụwa bụ nke Chineke,
Chineke bụ onye kacha dị elu. Azịza
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Esi m na nna m pụta wee bịa n’ụwa, ugbu a a na m ahapụ ụwa na-alakwurukwa Nna m.”
ALLELUIA.
OZIỌMA – 16:23-28.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Ma ana m agwa ụnụ eziokwu, ọ bụrụ na ụnụ arịọ Nna m ihe ọbụla n’aha m, ọ ga-enye ya ụnụ. Ma ruo ugbu a, o nwebeghị ihe ọbụla ụnụ rịọrọ n’aha m.
Rịọnụ ụnụ ga-arịọta, ka ọñụ ụnụ wee zuo oke.” Agwala m ụnụ ihe ndị a n’ilu ma oge na-abịa mgbe m na-agaghị agwakwa ụnụ okwu n’ilu. Kama aga m agwa ụnụ ihe niile gbasara Nna m n’ụzọ na- agaghị agbagwoju ụnụ anya.
N’ụbọchị ahụ ụnụ ga-arịọ ya ihe n’aha m, anaghị m asị ụnụ na-aga m arịọ Nna m ihe n’ihi ụnụ. Nna m n’onwe ya hụrụ ụnụ n’anya. Ọ hụrụ ụnụ n’anya n’ihi na ụnụ hụrụ m n’anya, kwerekwa na m si n’ebe Chineke nọ bịa.
Esi m na Nna m pụta wee bịa n’ụwa. Ugbu a ana m ahapụ ụwa na alakwurukwa Nna m.”
Igbo Mass readings for May 12 2024, Ụka Nke Asaa N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ
Igbo Mass Readings for May 11 2024, Satọde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.