Igbo Mass Readings for February 18 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 18 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:1-7
Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru
Okwukwe bụ mmasiobiike banyere ihe ndị a na-ele anya ha. Ihe ndị were anya na ha dị ma a hụghị ha anya. Ọ bụ site n’okwukwe ka ndị mgbe ochie ji nata nkwado, dị asọ.
Site n’okwukwe ka ha ji mara na Chineke ji okwu ọnụ wee kee ụwa, nke mere na e mebere ihe a na-ahụ anya site n’ihe a na-anaghị ahụ anya.
Site n’okwukwe ka Ebel ji chụnyere Chineke aja dị mma karịa nke Ken, nke e si na ya gunye ya n’onye eziomume. Chineke gbara akaebe maka nke a site n’ịnara onyinye ya.
Ọ bụ ezie na ọnwụrụ, ma site n’okwukwe ya, ọ ka na ekwu okwu. Ọ bụkwa site n’okwukwe ka e ji bugoo Enok n’eluigwe n’anwụghị anwụ. O nweghị onye hụrụ ya n’ihina Chineke akpọrọla ya.
Tupu a kpọrọ ya, e kwupụtara na o mere ihe masịrị Chineke. E wepụ okwukwe, ọ bụ ihe nyiri omume ime ihe na-amasị Chineke.
N’ihina onye ọbụla ga-abịa Chineke nso ga-ekwerịrị na ọ dị, na-akwụkwa ndị na-achọ ya ụgwọ. Site n’okwukwe, Noah, onye nke Chineke dọrọ aka na ntị gbasara ihe ndị a na-ahụbeghị anya gere ntị ma ruo ụgbọ maka nzọpụta nke ezinụụlọ ya.
Site na nke a, ọ mara ụwa ikpe ma bịa bụrụ onye nketa nke eziomume sitere n’okwukwe.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.: 145:233, 4-5, 10-11.
Azịza: Aga m enye gị otito, Chineke bụ eze m, aga m eto aha gị ruo mgbe ehighịebi.
1. Ụbọchị niile, aga m eto gị,
aga m eto aha gị ruo mgbe ebighịebi.
Onyenweanyị dị ukwuu, kwesịkwa inye otito niile,
ebube ya dị omimi karịkwara nghọta. Azịza
2. Aga m na-eto akaọrụ gị site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ,
na-ekwupụtakwa ọrụ ebube gị.
Aga m ekwupụta otito na ebube gị,
aga m atụgharị uche m n’ọrụ ebube gị niile. Azịza
3. Onyenweanyị, ihe niile i kere ga-ekele gị,
ndị kwere na gị ga-agọzi gị.
Ha ga-ekwupụta ebube nke alaeze gị,
ma kwupụtakwa ịdị ike. Azịza
MBEKU – Jon 8:12
Alleluia, Alleluia:
Abụ m ihe nke ụwa, onye ọbụla na-eso m agaghị aga n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ihe nke ndụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 9:2-13
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Mgbe ụbọchị isii gachara Jesu kpọọrọ Pita na Jemis na Jọn, duru ha rigoro otu ugwu dị elu. Ha nọdụrụ iche naanị ha. Jesu nwoghara n’ihu ha. Uwe ya niile na-egbuke egbuke, na-acha oke ọcha, otu ọsaakwa ọbụla nọ n’ụwa na-apụghị ime ka ha dị.
Elaịja na Mosis pụtakwara n’etiti ha, ha na Jesu na-akparịta ụka. Pita sịrị Jesu, “Onyenkuzi, ọ dị mma na anyị nọ ebe a; ka anyị rụọ ụlọikwu atọ; otu maka gị, otu maka Mosis, otu maka Elaịja”.
Pita kwuru nke a ebe ọ bụ na ọ maghị ihe ọ ga-ekwu n’ihina oke egwu ji ya na ndị na-eso ụzọ Jesu mmadụ abụọ ndị ọzọ.
Urukpu wee kpugide ha, olu sikwa n’urukpu ahụ sị, “Onye a bụ nwa m, m hụrụ n’anya geenụ ya ntị”. Ozigbo ahụ ha legharịrị anya gburugburu. Ha ahụghịkwa onye ọbụla ọzọ ha na ha nọ belụsọ Jesu.
Mgbe ha si n’elu ugwu na-arịdata, Jesu dọsiri ha aka na ntị ike, ka ha ghara ikọrọ onye ọbụla ihe ha hụrụ, ruo mgbe Nwa nke mmadụ bilitechara n’ọnwụ.
Ha zobere okwu a n’etiti onwe ha, na-ajụrịkọta onwe ha ihe ọ pụtara bụ isi na ndị nwụrụ anwụ bilie. Ha jụrụ Jesu sị, “Gịnị mere ndị odeakwụkwọ ji na-ekwu na Elaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?”
Jesu sịrị ha, “Elaịja bu ụzọ, idozi ihe niile otu ha dị na mbụ. Ma gịnị mere e ji dee ya n’Akwụkwọ Nsọ na Nwa nke mmadụ aghaghị ịta ọtụtụ ahụhụ, a ghaghịkwa ime ya akaja?
Ma ana m agwa ụnụ na Elaịja abịala, ha mekwara ya otu masịrị ha, dịka e dere banyere ya”.
ha ga-ahụ ọchịchị nke Chineke ka ọ bịara n’ike”.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.