Igbo Mass Readings for February 19 2028, Satọde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 19 2028, Satọde n’ime Izuụka nke Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-10
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Jemis
Ụmụnna m! ọtụtụ n’ime ụnụ abụkwala ndị nkuzi. Ụnụ maara na anyị bụ ndị nkuzi ga-anata ikpe buru ibu karịa. N’ihina anyị niile na-emehie ọtụtụ mgbe.
Ọ bụrụ na onye ọbụla anaghị emehie n’okwu, onye ahụ bụ onye tozuru oke bụrụkwa onye pụrụ ịkwa ahụ ya niile nga. Ọ bụrụ na anyị ekechie ịnyịnyaibu anyị ọnụ ka o rubere anyị isi anyị na-eduru ya gaa ebe anyị chọrọ. Tụlekwanụ ụgbọmmiri!
Ọ bụ ezie na ọ buru ibu nke ukwu, oke ifufe na-efegharịkwa ya. Onyeisi ụgbọ na-eji naanị ụmara isi ụgbọ dịkarịsịrị nta na-agbagharị ya, mee ka ọ gaa ebe ọbụla ọ chọrọ. Otu a ka ire dị.
Ọ bụ ezie na ọ bụ ihe nta dị n’ahụ, ọ na-anyafe isi oke, banyere ihe buru ibu. Leenụ oke ọhịa otu ọ ha ibu! Naanị ire ọkụ ntakịrị na-atụnye ya ọkụ! Ire n’onwe ya bụ ọkụ ọ bụkwa ụwa nke juru na mmejọ.
Ire na-efesa ahụ niile ntụpọ. Ọ na-amụnye ọkụ nregbu n’ogologo ndụ mmadụ. Ọ na-amụnye ihe ọkụ site n’ọkụ ala mmụọ. Mmadụ nwere ike ịzụ ụmụ anụ ọhịa dị icheiche, anụ ufe, anụ na-akpụ akpụ, na anụ ndị bi na mmiri.
Ọ dịbeghị onye ọbụla n’etiti mmadụ, pụrụ ịzụta ire, ajọ ihe anaghị ezu ike. O jupụtara na nsi na-egbu egbu! Ire ka anyị ji eto Onyenweanyị, na Nna anyị.
Otu ire ahụ ka anyị jikwa abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, ndị Chincke kere n’oyiyi nke ya. N’otu ọnụ ahụ ka ngọzi na ọbụbụ ọnụ si apụta. Ụmụnna! O kwesịghị ka ọ dị otu a!
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 12:1-2,3-4, 6-7
Azịza: Onyenweanyị Gị ga echekwaba anyị
1. Zọpụta m Osebụrụwa, ndị eziomume adịghịkwa,
ndị kwesịrị ntụkwasịobi agwụla n’elu ụwa.
Ha niile na-asịrị onwe ha asị
ha na-agba asịrị ma na-enwekwa ire abụọ. Azịza
2. Ka Onyenweanyị bepụ ire asịrị ọbụla,
mọbụ nke na-etu ọnụ,
Nke na-ekwu sị, Ike anyị dị n’ire anyị,
ire anyị dị nkọ o nweghị onye ga-ejide anyị. Azịza
3. Okwu nke Onyenweanyị enweghị ntụpọ
Ọ dịka ọlaọcha a ñụchara n’ọkụ ugboro asaa.
Osebụrụwa chekwaba anyị n’aka ndịiro anyị. Azịza
MBEKU – Jon 8:12
Alleluia, Alleluia:
Abụ m ihe nke ụwa, onye ọbụla na-eso m agaghị aga n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ihe nke ndụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 9:2-13
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Mgbe ụbọchị isii gachara Jesu kpọọrọ Pita na Jemis na Jọn, duru ha rigoro otu ugwu dị elu. Ha nọdụrụ iche naanị ha. Jesu nwoghara n’ihu ha. Uwe ya niile na-egbuke egbuke, na-acha oke ọcha, otu ọsaakwa ọbụla nọ n’ụwa na-apụghị ime ka ha dị.
Elaịja na Mosis pụtakwara n’etiti ha, ha na Jesu na-akparịta ụka. Pita sịrị Jesu, “Onyenkuzi, ọ dị mma na anyị nọ ebe a; ka anyị rụọ ụlọikwu atọ; otu maka gị, otu maka Mosis, otu maka Elaịja”.
Pita kwuru nke a ebe ọ bụ na ọ maghị ihe ọ ga-ekwu n’ihina oke egwu ji ya na ndị na-eso ụzọ Jesu mmadụ abụọ ndị ọzọ. Urukpu wee kpugide ha, olu sikwa n’urukpu ahụ sị, “Onye a bụ nwa m, m hụrụ n’anya geenụ ya ntị”.
Ozigbo ahụ ha legharịrị anya gburugburu. Ha ahụghịkwa onye ọbụla ọzọ ha na ha nọ belụsọ Jesu. Mgbe ha si n’elu ugwu na-arịdata, Jesu dọsiri ha aka na ntị ike, ka ha ghara ikọrọ onye ọbụla ihe ha hụrụ, ruo mgbe Nwa nke mmadụ bilitechara n’ọnwụ.
Ha zobere okwu a n’etiti onwe ha, na-ajụrịkọta onwe ha ihe ọ pụtara bụ isi na ndị nwụrụ anwụ bilie. Ha jụrụ Jesu sị, “Gịnị mere ndị odeakwụkwọ ji na-ekwu na Elaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?”
Jesu sịrị ha, “Elaịja bu ụzọ, idozi ihe niile otu ha dị na mbụ. Ma gịnị mere e ji dee ya n’Akwụkwọ Nsọ na Nwa nke mmadụ aghaghị ịta ọtụtụ ahụhụ, a ghaghịkwa ime ya akaja?
Ma ana m agwa ụnụ na Elaịja abịala, ha mekwara ya otu masịrị ha, dịka e dere banyere ya”.
ha ga-ahụ ọchịchị nke Chineke ka ọ bịara n’ike”.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.