Igbo Mass Readings for June 10 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 10 2023, Satọde n’ime Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:1, 5-15, 20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Tobit
Mgbe oriri agbamakwụkwọ a bịara n’isi njedebe, Tobit kpọrọ nwa ya Tobiyas sị ya, “Nwa m, hụ na a kwụrụ nwoke a duru gị gaa njem ụgwọ, ọbụladị karịa ole anyị na ya kwuru”. Ọ kpọrọ mmụọozi ahụ sị ya, “Were ọkara ihe niile ụnụ jiri lọta”.
Mgbe ahụ mmụọozi akpọpụta ha abụọ iche sị ha: “Toonụ Chineke ma nyekwa ya ekele; bulienụ ya elu ma nyekwa ya ekele n’ihu ihe niile e kere eke maka iheọma O meere ụnụ. Ọ dị mma ito Chineke, ibuli aha ya elu, na ikwupụta akaọru ya n’ụzọ ziri ezi. Atụfula oge n’inye Chineke ekele.
Ọ dị mma i zobe izu nzuzo nke onyeeze, ma o kwesiri ka a gbasaa ọrụebube nke Chineke. Na-eme iheọma ka ihe ọjọọ ghara ịdakwasa gị. “Ekpere dị mma ma e tinyere ya ibuọnụ, inye onyinye obiebere na eziomume. Obere onyinye nke onye eziomume ka mma karịa ọtụtụ onyinye nke onye ajọomume.
Ọ ka maa mma inye onyinye ebere karịa ịkpakọwa akụnụụba. N’ihina onyinye ebere na-azọpụta mmadụ n’ọnwụ, na-asachapụkwa njọ. Ndị na-arụ ọrụebere, na-eme eziomume ga-enweta ndụ n’uju; mana ndị na eme njọ kpọrọ ndụ ha asị.
“Agaghị m ezoro ụnụ ihe ọbụla, ekwuola m ya na mbụ sị, Ọ dị mma izobe izu nzuzo nke onyeeze, ma o kwesịrị ka a gbasaa ọrụebube nke Chineke’. Mgbe gị na nwunye nwa gị Sara kpere ekpere, ọ bụ mụ bugara ekpere ụnụ n’ihu Onye kacha nsọ; mgbe ị na eli ndị nwụrụ anwụ, a nọnyekwaara m gị.
Mgbe ị na-eleghị anya n’azụ ịhapụ nri gị ịga lie ndị nwụrụ anwụ, ahụrụ m eziomume gị ma nọnyekwaara gị. Ya mere Chineke jiri zite m ka gwọọ gị na nwunye nwa gị Sara.
Abụ m Rafel, otu n’ime ndị mmụọọma asaa ahụ, na ebuga ekpere ndị nsọ niile n’ihu ebube nke Onye kacha nsọ. Ugbu a nyenụ Chineke ekele, n’ihi ana m alakwuru onye nke zitere m. Depụtanụ ihe niile merenụ n’ime akwụkwọ”.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Tobit 13:2,6
Azịza: Ngọzị dịrị Chineke Onye dị ebeebe.
1. Chineke na-enye ntaramahụhụ, na-egosịkwa ebere;
Ọ na-eduba mmadụ n’ala mmụọ,
na-akpọpụtakwa ya,
O nweghị onye ọbụla nwere ike ịgbanahụ ya. Azịza
2. Chetanụ ihe ọma Chineke meere ụnụ,
ma jirinụ obi ụnụ niile nye ya ekele.
Toonụ Osebụrụwa nke eziomume,
bulienụ eze dị ụwatụwa elu. Azịza
3. Ana m enye ya ekele n’ala a, ebe m bụ ohu,
ana m egosipụtakwa ike na ebube ya n’ala ndị ome njọ. Azịza
4. Chegharịanụ ụnụ ndị ome njọ, ma mebenụ eziomume n’ihu ya.
Ikekwe ọ ga-anabata ụnụ, ma meere ụnụ ebere. Azịza
MBEKU – Ps. 119:18
Alleluia, Alleluia:
Onyenweanyị, meghee anya m, ka m wee hụ ihe ịtụnaanya dị n’iwu gị.
Alleluia.
OZIỌMA – 12:38-44
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
N’ime nkuzi ya, ọ gwara igwe mmadụ ahụ sị, “kpacharanụ anya maka ụfọdụ n’ime ndị odeakwụkwọ, ndị ọ na-atọ ụtọ ịkpagharị n’uwe mwụda, na ịnara ekele pụrụ iche n’ọma ahịa, ịnọ n’ihu oche n’ụlọnzukọ, na ịnọ n’isi oche ebe ọbụla oriri na ọñụñụ dara.
Ha na ekpekwa ogologo ekpere ka e wee jaa ha mma. Amamikpe nke ha ga akacha”. N’ime ụlọnsọ, Jesu nọdụrụ ala na ncherịta ihu nke ebe a na edebe igbe onyinye na-ele otu ndị mmadụ si na-etinye ego n’igbe. Ọtụtụ ndị ọgaranya tinyere ọkpụrụkpụ ego.
Ma otu nwaanyị ajadụ nke dara ogbenye bịara tunye ntakịrị mkpụrụ ego ọlaọkụ abụọ nke pụtara otu kobo. Jesu wee kpọkọta ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “N’ezie agwa m ụnụ, nwaanyị ajadụ a dara ogbenye tinyere ego karịa ndị niile tinyere ego n’igbe ahụ.
N’ihina ha niile si na nnukwu akụnụụba ha nye ntakịrị onyinye, ma nwaanyị a nyechara ihe niile o nwere”.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.