Igbo Mass Readings for June 8 2024, Satọde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 8 2024, Satọde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:1-8
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi nke Abụọ Pọl degaara Timoti
Ana m adọ gị aka na ntị n’ihu nke Chineke na Jesu Kristi, onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. Ma site n’ọbịbịa ya n’alaeze ya, kwusaa oziọma.
Dị uchu n’ọrụ a, ma ọ dị mma ma ọ dị njọ, ma mmiri ọ na-ezo ma anwụ ọ na-acha. Mee ka ha kwenye, baara ha mba ma gbakwaa ha ume.
Adala mba n’inwe ndidi na nkuzi. N’ihina oge na abịa mgbe ndị mmadụ na-agaghị anagide ezi nkuzi, ma site na ntị ịkọọkọ ha nwere, ha ga-ekpokọtara onwe ha ndị nkuzi ga-akụziri ha ihe ga-amasị ha.
Ha ga-agbakụta eziokwu azụ ma na-awagharị n’akụkọ na-enweghị isi. Banyere gị onwe gị, guzosie ike mgbe niile. Na-edi ahụhụ na-arụkwa ọrụ gị dịka onye oziọma. Na-emejupụta ihe kwesiri ọrụ gị.
Adị m njikere ruo n’iji m chụọ aja, oge ụla m ezuola. Alụọla m ezigbo ọgụ, agbaruola m ọsọ ahụ n’isi, akwụdosiela m ike n’okwukwe.
Site ugbu a e doberela m okpu eze nke eziomume, nke Onyenweanyị, ezi onye ọkaikpe ga-enye m n’ụbọchị ahụ. Ọ bụghị naanị m ka ọ ga-enye okpu eze ahụ, ọ ga-enyekwa ya ndị niile ji ịhụnaanya na-eche ọbịbịa ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 71:8-9, 14-15, 16-17, 22
Azịza: Aga m ekwupụta ike nke nzọpụta gị
1. Ọnụ m jupụtara n’otito nke gị
ogologo ụbọchị niile.
Ajụkwala m ugbu a m bụ agadi,
mọbụ gbahapụ m ugbu a ike na-agwụ m, Azịza
2. Ana m ekwe nkwa na-echekwube na gị,
aga m eto gị karịa.
Ọnụ m ga-ekwupụta eziomume gị
na ike nke nzọpụta gị ụbọchị niile. Azịza
3. Aga m abịa n’ike nke Onyenweanyị
wee cheta ikpe nkwụmọtọ gị sọọsọ nke gị
O Chineke, I kuziiri m bido na nwata m,
aga m na-ekwupụta ọrụ ebube gị. Azịza
4. Ana m ekwe nkwa na aga m eji ụbọ akwara were kelee gị.
Chineke m onye kwesịrị ịtụkwasịobi oge niile,
Aga m eji une too aha gị,
onye dị nsọ nke Izrel. Azịza
MBEKU – Ps. 119:18
Alleluia, Alleluia:
Onyenweanyị, meghee anya m, ka m wee hụ ihe ịtụnaanya dị n’iwu gị.
Alleluia.
OZIỌMA – 12:38-44
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
N’ime nkuzi ya, ọ gwara igwe mmadụ ahụ sị, “kpacharanụ anya maka ụfọdụ n’ime ndị odeakwụkwọ, ndị ọ na-atọ ụtọ ịkpagharị n’uwe mwụda, na ịnara ekele pụrụ iche n’ọma ahịa, ịnọ n’ihu oche n’ụlọnzukọ, na ịnọ n’isi oche ebe ọbụla oriri na ọñụñụ dara.
Ha na ekpekwa ogologo ekpere ka e wee jaa ha mma. Amamikpe nke ha ga akacha”. N’ime ụlọnsọ, Jesu nọdụrụ ala na ncherịta ihu nke ebe a na edebe igbe onyinye na-ele otu ndị mmadụ si na-etinye ego n’igbe. Ọtụtụ ndị ọgaranya tinyere ọkpụrụkpụ ego.
Ma otu nwaanyị ajadụ nke dara ogbenye bịara tunye ntakịrị mkpụrụ ego ọlaọkụ abụọ nke pụtara otu kobo.
Jesu wee kpọkọta ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “N’ezie agwa m ụnụ, nwaanyị ajadụ a dara ogbenye tinyere ego karịa ndị niile tinyere ego n’igbe ahụ.
N’ihina ha niile si na nnukwu akụnụụba ha nye ntakịrị onyinye, ma nwaanyị a nyechara ihe niile o nwere”.
Igbo Mass Readings for June 9 2024, Ụka nke Iri n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ
Igbo Mass Readings for June 8 2024, Satọde Izuụka nke Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.