Igbo Mass Readings for December 7 2024, Satọde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 7 2024, Satọde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 30:19-21, 23-26
Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Osebụrụwa, Chineke, Onye nsọ nke Izrel ekwuo1a sị: Ee, ụnụ ndị Zayọn bi na Jerusalem; ụnụ agaghị ebekwa akwa ọzọ.
Ọ ga egosikwa ụnụ amara mgbe ọ nụrụ mkpu akwa ụnụ; ọ ga azọkwa ụnụ. Ọ bụ ezie na Chineke nyere ụnụ achịcha nke ntaramahụhụ, nakwa mmiri nke ịta ahụhụ, ma onye nkuzi ụnụ agaghị ezokwa onwe ya ọzọ, ụnụ ga-ahụ onye nkuzi ụnụ.
Ma ụnụ ga anụkwa okwu n’azụ ụnụ, nke na-asị, “Nke a bụ ụzọ, gabanụ na ya,” mgbe ụnụ tụgharịrị na-aka nri mọbụ n’aka ekpe ụnụ.
Ọ ga ezite mmiri ozuzo n’ebe ihe niile ụnụ kụrụ na-ala dị nakwa mkpụrụ nke ala mịpụtara, nke ga-aba ụba ma buokwa ibu.
N’ụbọchị ahụ ehi ụnụ ga-atakwa nri n’ebe ahịhịa bara ụba. Ma ehi ọrụ nakwa ịnyịnyaibu ụnụ nke na akọ ọrụ, ga erikwa ahịhịa dị ụtọ, dịkwa mma, bụ nke e ji ọgụ na ndụdụ kọpụta.
Mmiri ga agbapụta site n’elu ugwu ukwu na nke nta niile, n’ụbọchị nke oke ogbugbu mmadu, mgbe ụlọnche ha niile ga-ada.
Ihè ọnwa ga-achawa dịka nke anyanwụ, n’oge ahụ ìhè anyanwụ ga achawapụta okpukpu asaa dịka ìhè nke abalị asaa.
N’ụbọchị ahụ Osebụrụwa ga-ekechi ọnya ndị nke ya, ma gwọkwaa ha mmerụ ahụ nke ha nwetara site na-aka ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 147: 1-2.3-4. 5-6.
Azịza: Ngozi diri ndi niile chekwubere na ya.
1. Toonu Chineke, n’ihina ọ dị mma,
ọ dị mma ikwere Chineke ukwe;
o kwesiri ikwere ya ukwe otito n’ihina ọdị obi ebere.
Onyenweanyị, onye na-ewugharị Jerusalem;
ọ bụ ya kpọghachiri ụmụ Izrel ndị a dọọrọ n’agha. Azịza.
2. Ọ na-akasị ndị obi gbawara obi,
na-ekechikwa ọnya ha nile
Ọ maara ọnụọgụgụ kpakpando niile,
na enyekwa nke ọbụla aha ya. Azịza.
3. Chineke anyị dị ukwuu onye ji ike niile,
Amamihe ya enweghịkwa ngwụcha.
Onyenweany na-ebulite ndị umeala
ma na-ebuda ndị obi ọjọọ n’ala. Azịza.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
N’ihi na Osebụrụwa bụ ọka-ikpe anyị, ọ bụkwa onye ndụ anyị. Chineke bụ eze anyị, ọ ga-azọpụta anyị.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 9:35-10:1, 6-8
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu na-agagharị n’obodo na n’ogbe ha niile, na akụzi nkụzi n’ụlọ nzukọ ha, na ekwusa oziọma nke alaeze Chineke, na-agwọkwa ọrịa na nrịanrịa ha niile.
Mgbe ọ hụrụ ọtụtụ igwe mmadụ ahụ, ebere ha mere ya, n’ihina ha nọ na nsogbu.
Ha enweghịkwa onye enyemaka, ha dịka atụrụ, na- enweghị onye nche. Jesu wee gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Owuwe ihe ubi bara ụba, mana ndị ọrụ dị olemole.
Ya bụ, rịọnụ Dinwenụ nke owuwe ihe ubi ka o ziga ndị ọrụ n’ugbo ya.” Jesu kpọrọ ndị ụmụazụ ya iri na abụọ, nye ha ike ịchụpụ ajọ mmụọ na ịgwọ ọrịa na nrịanrịa niile dị icheiche.
O nyere ha iwu sị, “Kama jekwurunụ ụmụatụrụ furu efu nke ụlọ Izrel. Ka ụnụ na-aga, na-ekwunụ sị, “Alaeze eluigwe adịla nso.”
Gwọọnụ ndị ọrịa, kpolitenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ndị ekpenta ka ha dị ọcha, chụpụkwanụ ajọ mmụọ. Ụnụ natara n’efu, nyekwanụ n’efu.
Igbo Mass Readings for December 8 2024, Ụka nke Abụọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị
Igbo Mass Readings for December 7 2024, Satọde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.