Igbo Mass Readings for Saturday Izuukwu nke Mbilite N’onwu Kristi

SATURDAY: N’IZUUKWU NKE MBILITE N’ONWU KRISTI.

EKPERE MMEGHE
Nna nke ihunaanya, site na nhukwasi nke amara Gi I na-amuba n’onu ogugu ndi kwere na Gi. Chekwaba einuulo Gi. Nye ndi niile ejiri mmirichukwu mugharia ndu na-enweghi njedebe. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi…

Ihe Ogugu nke mbu. 4:13-21
Ihe ogugu ewetara n’Oru Ndiozi
Mgbe ndi nchuaja na ndi okenye huru na Pita na Jon na ekwusi okwu ike, n’atughi egwu obula choputakwa na ha bu ndi na-amaghi akwukwo, ndi mmadi nkiti, ihe a juru ha anya; ma ha ghotara n’otu oge ahu na ha na Jesu anoola. Ma ebe ha huru nwoke ahu e mere ka ukwu ya di mma ka o guzo n’akuku Pita na Jon ihere ekweghi ha kpee ihe obula kpegide ndi ozi ahu.
Mgbe ha gwara ndi ozi ahu ka ha puo n’ezi, ha gbaritara izu n’etiti onwe ha si, “Gini ka anyi ga eme ndi a?” Onye obula bi na Jerusalem anula na Chineke aruola oru itunaanya di otu a site n’aka ha. Anyi apughikwa igopu ya. Iji mee ka o ghara idi na-agbasa, na-aga n’ihu n’etiti ndi mmadu, ka anyi dosie ha aka na nti ike, ka ha ghara idi na agwa onye obula okwuchukwu n’aha Jesu, bido ugbu a gaba. Nke a mere haji kpobata ndi ozi ahu n’ihu nzuko nye ha iwu ka ha ghara ikwu ma o bu ikuzi ihe obula n’aha Jesu. Pita na Jon zara ha si, “Kpebienu n’onwe unu, ma o bu ihe ziri ezi n’anya Chineke ige unu nti karja ige Chineke nti. N’ihina anyi onwe anyi aghaghi ikwusa ihe anyi huru na nke anyi nuru.” Ndi nzuko ahu dokwara ha aka n’nti ozo, hapu ha ka ha laa. Ha ahughikwa uzo obula ha ga-esi taa ha ahuhu n’ihina oha ndi mmadu na-enye Chineke otito maka oru ebube ha ruru.

ABUOMA NA AZIZA: Ps 118:14-15, 26-18,19-21.
Aziza: Ana m ekele Gi n’ihina I nula olu m.

  1. Nyenu Onyenweanyi ekele n’ihina O di mma,
    ihunaanya ya enweghi njedebe.
    Onyenweanyi bu ike m na ukwe m;
    Ya bukwa onye nzoputa m.
    A na-enwe mkpu onu na nke mmeri
    n’ulo ndi eziomume. Az./
  2. Aka nri Onyenweanyi na-enwe mmeri,
    Aka nri Onyenweanyi ekulitele m.
    Mba, agaghi m anwu, aga m adi ndu,
    iguputa akaoru niile nke Onyenweanyi.
    O bu ezie na Onyenweanyi ataala m ahuhu nke ukwuu
    ma O nyefebeghi m n’aka onwu. Az./
  3. Megheere muzo nke eziomume
    ka m bata bia nye Onyenweanyi ekele.
    Nke a bu onuuzo nke Onyenweanyi,
    ebe ndi eziomume ga-esi bata.
    Ana m ekele gi n’ihina I nula olu m,
    I bukwa onye nzoputa m. Az./

ALLELUIA ALLELUIA:
Taa bu ubochi ahu Onyenweanyi mere, ka anyi nwee anuri ka obi di anyi uto na ya.
ALLELUIA.

OZIOMA: 16:9-15
Ihe ogugu ewetara n’Ozioma di aso nke Mak dere:
Mgbe Jesu si n’onwu bilite n’isi ututu nke ubochi mbu nke izuuka, o buru uzo gosi onwe ya Meri onye Magdala, onye ahu o chupuru mmuo ojoo asaa n’ime ya. O puru gaa kooro ndi ha na Jesu na-ano na mbu ebe ha na-eru uju na-ebekwa akwa. Ma mgbe ha nuru na o di ndu, na Meri onye Magdala ahukwala ya, ha ekwetaghi na akuko a bu eziokwu. Mgbe nke a gachara, Jesu gosikwara ndi na-eso uzo ya mmadu abuo onwe ya n’udi ozo ka ha na-abanye n’ime obodo. Ha laghachiri azu kooro ndi ozo ma ha ekwetaghi n’ihe ha kwuru. Ka e mechara o gosikwara onwe ya ndi na-eso uzo ya mmadu iri na otu ka ha no n’oche nri.
O tara ha uta maka ekweghi ekwe na mkpochi obi ha n’ihina ha ekwetaghi ihe ndi huru ya mgbe o bilitechara n’onwu kooro ha. O gwara ha si, “Gaanu n’uwa niile, kwusaaranu ihe niile e kere eke ozioma.

EKPERE NHUNYE
Dinwenu, nye anyi anuri nke sitere n’ihe omimi nke Ista. Mee ka oganihu aja nke onyinye nke ejiri mee ka anyi di ohuru wetara anyi anuri nke di ebighi ebi. Anyi na-ario Gi ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO
Dinwenu, lekwasi ndi nke Gi anya-ebere, ma site n’ihe omimi nke Ista wetara anyi otito nke mbilite n’onwu. Anyi na-ario Gi ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.

error: Content is protected !!
Open chat
1
Catholic Lectionary
Hello 👋
How can I help you?