Igbo Mass Readings for January 11 2025, Satọde na-eso Ụka Epifani
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka January 11 2025, Satọde na-eso Ụka Epifani.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:14-21
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Jọn nke mbụ
Nke a bụ ntụkwasịobi anyị nwere na ya, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka uche ya si dị, Ọ na- ege anyị ntị. Ọ bụrụ na anyị ma na Ọ na ege anyị ntị n’ihe ọbụla anyị rịọrọ, anyị amara na anyị enwetala ihe niile anyị rịọrọ ya.
Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ nwanne ya ka ọ na-eme obere njọ, ọ ga-arịọrọ ya arịrịọ, Chineke ga-enye nwanne ya ahụ ndụ maka na njọ ahụ abụghị njọ ogbugbu.
E nwere njọ nke bụ nnukwu njọ. Anaghị m ekwu ka mmadụ kpee ekpere maka nke ahụ. Omume niile na-ezighị ezi bụ njọ. Mana e nwere nke na abụghị nnukwu njọ.
Anyị ma na onye ọbụla a mụrụ na Chineke anaghị eme njọ, n’ihi na Kristi Nwa nke Chukwu na-echekwa ya. Onyeiro ahụ anaghị emetụ ya aka. Anyị ma na anyị bụ ndị nke Chineke, mana ụwa niile nọ n’ike nke ajọ onye ahụ.
Anyị makwa na Nwa nke Chukwu abịala, o nyekwara anyị nghọta ịmata onye ahụ bụ Eziokwu. Anyị nọkwa n’ime onye ahụ bụ Eziokwu, n’ime Nwa ya bụ Jesu Kristi. Nke a bụ ezi Chineke ahụ na ndụ ebighịebi. Ụmụntakịrị, zerenụ ikpere arụsị.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 149:1-2, 3-4, 5-6, 9.
Azịza: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.
1. Kwerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,
ka ọgbakọ ndị kwere na ya kweere ya ukwe otito.
Ka Izrel ñụrịa ọñụ n’ihi onye kere ya,
ka ụmụ Zayọn ñụrịba n’ihi onye eze ha. Azịza
2. Ka ha were ịgba egwu too aha ya,
ka ha were ịgba na ụbọ akwara gbaara ya egwu.
N’ihi na Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.
O kpubela ndị umeala okpu nke mmeri. Azịza
3. Ka ndị nke ya ñụrịa na mmeri ha.
Ka ha daa n’ala n’ihu Chineke, na-eto ya oge niile.
Ka nnukwu ukwe otito Chineke jupụta n’ọnụ ha,
nke a bụ otito nke ndị nke ya kwere ekwe. Alleluia. Azịza
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
E kwusara ya na mba niile, onye ụwa niile kwere na ya. E buliri ya elu n’otito.
ALLELUIA.
OZIỌMA – 3:22-30.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Mgbe nke a gachara Jesu na ndị na-eso ụzọ ya gara n’ala Judia, ya na ha nọ ebe ahụ na-eme ndị mmadụ mmirichukwu. Jọn na-emekwa mmirichukwu n’Enọn nke dị Salim nso, n’ihi na nnukwu mmiri dị ebe ahụ.
Ndị mmadụ na-abịakwa. Jọn na-eme ha mmirichukwu. Mgbe ahụ a tụbabeghị Jọn n’ụlọ mkpọrọ. Nrụrịta ụka dapụtara n’etiti ndị na-eso ụzọ Jọn na otu onye Juu banyere ime ka ha dị ọcha.
Ha bịakwutere Jọn sị ya, “Rabaị (onye nkuzi) onye ahụ gị na ya nọrọla n’ofe Jọdan, nke ahụ Ị gbara akaebe maka ya, na-eme mmirichukwu ugbu a, mmadụ niile na-abịakwutekwa ya!”
Jọn zara sị: “Ọ dịghị onye nwere ike ịnata ihe ọbụla ma ọ bụrụ na Chineke enyeghị ya. Ụnụ onwe ụnụ ga-agbara m akaebe na m kwuru sị, “abụghị m Kristi ahụ, kama e zitere m ka m buru ya ụzọ bịa.
Nwoke lụrụ nwaanyị bụ ya nwe nwaanyị ọ lụrụ. Ihe enyi ya na-eme bụ ịnọnyere ya na-ege ntị n’ihe ọ na-ekwu. Ọ na-enwekwa añụrị n’ihina ọ na-anụ olu enyi ya nwoke lụrụ nwaanyị. Añụrị mụ ezuola oke ugbu a. Ọ ga na-abawanye, mụ onwe m ana-alọ ala.
Igbo Mass readings for January 12 2025, Emume Mmirichukwu nke Onyenweanyị
Igbo Mass Readings for January 11 2025, Satọde na-eso Ụka Epifani