Connect with us
JUMIA TECH WEEK

Second Week of Lent - Igbo

Igbo Mass Readings for March 2 2024, Satọde Izuụka nke Abụọ n’Oge Lent

Published

on

Igbo Mass Readings for March 2 2024, Satọde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 2 2024, Satọde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:14-15, 18-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Maịka

Jiri mkpara onye nche atụrụ chịga ndị nke gị n’ebe ahịhịa ha ga-eri dị, duokwa igwe atụrụ a bụ ihe nketa gị, bụ ndị bi n’ime okeọhịa a, ala anaghị amịta mkpụrụ.

Mee ka ha taa nri n’obodo Bashan na Giled dịka na mgbe ochie. Dịka n’ụbọchị ahụ ụnụ siri n’ljipt pụta, aga m egosi ha ihe ịtụnaanya. Kedụ chi a ga-eji tụnyere gị n’ịgbaghara njọ na ileghara mmehie ndị nke ya anya?

Ọ naghị anọgide n’iwu ebighịebi, kama ọ na-enwe mmasị n’igosi ịhụnaanya dị ọkpụ. Ọ ga-egosi anyị ebere ya ọzọkwa, kpochapụ mmehie anyị niile, tụnye njọ anyị niile n’ala-ala osimiri. Ị ga-egosi Jekọb ntụkwasịobi, gosịkwa Abraham ịhụnaaya gị dị ọkpụ dịka I si ñụọrọ nna anyị ha n’iyi site na mgbe ochie.

Advertisement

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 103:1-2,3-4,9- 10,11-12.

Azịza: Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya.

1. Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m,

gọzie aha ya dị nsọ,

ihe niile dị n’ime m!

Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m,

Advertisement

echezọkwala obi ebere ya niile. Azịza

2. Nke o ji gbaghara njọ gị niile,

ma gwọọ ọrịa gị niile,

nke o ji si n’olulu zọpụta ndụ gị,

nke o ji were ịhụnaaya na obi ebere kpube gị okpu eze. Azịza

Advertisement

3. Iwe ya anaghị adị ebeebe,

ịkpọ asị ya na-adị sọ nwa ntịntị oge,

Ọ naghị emeso anyị, ọ naghị ata anyị ahụhụ,

dịka amamikpe anyị na njọ anyị si dị. Azịza

4. Dịka eluigwe siri dị elu n’ebe ụwa dị,

Advertisement

otu ahụ ka ịhụnaanya ya siri dị ukwuu

 n’ebe ndị na-atụrụ ya egwu nọ.

Ọ na-ewepụ njọ anyị n’ebe anyị nọ,

karịa otu ọwụwaanyanwụ si dị anya n’ọdịda ya. Azịza

MBEKU

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Advertisement

Bịaghachinụ azụ n’ebe Osebụrụwa Chineke ụnụ nọ, n’ihi na ọ dị ebere nwekwa obiọma.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 15:1-3, 11-32

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Mgbe ahụ, ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị ome njọ bịakwutere Jesu ịnụrụ okwu ya. Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ tamuru na-asị, “Nwoke a na-anabata ndị ome-njọ sorokwa ha na-eri ihe.”

Jesu wee jiri ụkabụilu a gwa ha okwu sị, “Otu nwoke nwere ụmụnwoke abụọ. Nke nta n’ime ha sịrị nna ha, ‘Nnaa, kee ihe gị niile ugbu a, nye m nke m.’

Advertisement

Nna ha kekwaara mmadụ abụọ a ihe o nwere. Ka ụbọchị olemaole gachara, nke nta n’ime ha kpokọtachara ihe niile o nwere gaa n’obodo ọzọ dị anya, n’ebe ahụ ka o mefuchara ihe niile o nwere site n’ibi ndụ nzuzu.

Mgbe o mefuchara ihe niile, oke ụnwụ dara n’obodo ahụ, ọ malite ịnọ n’ụkọ. Ọ gara nọnyere otu onye obodo ahụ, onye zigara ya na ubi ya ịzụ ezi. Ọ gaara amasị ya iri nri ụmụezi ahụ rifọrọ, mana o nweghị onye nyere ya ihe ọbụla.

Mgbe ọ matara onwe ya, ọ sịrị, ‘Mmadụ ole bụ ndị ọrụ ngo nọ n’ubi nna m na-eri, na-añụ, na-eme ihe oriri otu dị ha mma, ma anọ m ebe a na-anwụ n’agụụ!

Aga m ebili, lakwuru nna m, aga m asị ya: Nna, e mmehiela m megide eluigwe, megidekwa gị, etosịghị m ka a kpọkwaa m nwa gị ọzọ, na-akpaso m agwa dịka otu n’ime ndị ọrụ gị.’

O biliri lakwuru nna ya. Ma mgbe ọ ka nọ ebe dị anya, nna ya hụrụ ya, nwee obi ebere n’ebe ọ nọ, gbara ọsọ, makụọ ya, susukwaa ya ọnụ. Nwa ahụ sịrị ya, ‘Nna m, emehiela m megide eluigwe ma megidekwa gị, etosịghị m ka a kpọkwa m nwa gị ọzọ.

Advertisement

Mana nna ya sịrị ụmụodibo ya, ‘Meenụ ọsịsọ, chịpụtanụ uwe mwụda kacha mma, yibenụ ya, gbawanụ ya mgba-aka na akpụkpọ-ụkwụ; kpụpụtanụ nwa ehi gbara abụba, gbuonụ ya, ka anyị kpọọnụ oriri, nwekwaa añụrị.

N’ihi na nwa m nke a anwụọlarịị, bịa dịkwa ndụ ọzọ, o fukwara efu, e wee hụ ya. Ha bidoro ñụrịba ọñụ.’ “Ma mgbe nke a na-eme, nwa nwoke ahụ nke okenye nọ n’ubi.

Mgbe ọ bịaruru nso n’ụlọ, ọ nụrụ ụda egwu na-akụnụ. Ọ kpọrọ otu nwodibo nna ya, jụọ ya ihe na-emenụ. Ọ zara ya sị, ‘Nwanne gị nwoke alọtala, nna gị egbuola nwa ehi ahụ gbara abụba, n’ihi na ọ lọtara n’udo na ahụike.’

Iwe were ya, nke na ọ chọghịkwa ịbanye n’ụlọ. Nna ya pụtara rịọ ya. Mana ọ sịrị nna ya, ‘Lee, ọtụtụ afọ ndị a ka m nọ na-agbara gị odibo, o nweghị mgbe m nupụrụ isi n’iwu gị, o nweghị mgbe ị kpụnyere m, ọ bụladị nwa ewu, ka mụ na ndị enyi m rie, ma ñụrịkwaa.

Mana mgbe nwa gị nke a lọtara, onye ya na ụmụnwaanyị akwụna ripịachara ihe niile i nwere, i gbuuru ya nwa ehi ahụ gbara abụba.’ Nna ya sịrị ya, ‘Nwa m mụ na gị nọ mgbe niile, ihe niile m nwere bụ nke gị. O kwesịrị ekwesị ka anyị kpọọ oriri ma ñụrịkwaa, maka na nwanne gị anwụọlarịị ma dịkwa ndụ ọzọ, o fukwara efu, e were hụkwa ya.”

Advertisement

Igbo Mass readings for March 3 2024, Ụka nke Atọ N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Abụọ

Igbo Mass Readings for March 2 2024, Satọde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

Continue Reading
Advertisement

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.