Igbo Mass Readings for February 29 2024, Tọọzde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka February 29 2024, Tọọzde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:5-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye Amụma Jeremaya
Yahweh kwuru sị, “Ọmụma ikpe dịịrị onye nke tụkwasara obi na mmadụ, onye chekwubere naanị n’ike aka mmadụ, onye obi ya jụrụ Chineke. Dịka obere osisi nke puru n’ịkpa enweghị iheọma ga- esi na ya pụta.
Ọ ga-anọ n’ala kpọrọ nkụ nke ịkpa ahụ, n’ala nnụ mmadụ ebighị. “Ngọzi dịrị onye ahụ nwere nchekwube na Chineke, onye nchekwube ya bụ na Yahweh.
Ọ dịka osisi a kụrụ n’akụkụ mmiri, nke gbanyere mgbọrọgwụ na mmiri, ọ naghị atụ egwu ọkọchị n’ihina akwụkwọ ya na-adị ndụ mgbe niile. Ọ dịghịkwa atụ egwu n’oge ụkọ mmiri, ọ na-amị mkpụrụ oge niile.”
Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile, o jupụtakwara n’ajọ ihe, onye ga-aghọtalị ihe dị ya n’ime? “Mụnwa Yahweh na-enyocha obi na-atụlekwa echiche iji kwụọ onye ọbụla ụgwọ dịka ọrụ ya siri dị.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 1:1-2, 3, 4, 6.
Azịza: Añụrị ga-adịrị ndị tụkwasara obi na Dinwenụ.
1. Añụrị ga-adịrị nwoke ahụ nke anaghị eso ndụmọdụ onye ajọ omume,
ma ọ bụ na-akwụgharị n’ụzọ ndị ome njọ,
ma ọ bụ nọdụ n’otu ndị na-ekwutọ Chineke;
Kama ọ na-enwe añụrị n’ebe iwu Onyenweanyị dị;
ma na-achịgharị iwu ya n’obi ya ehihie na abalị. Azịza
2. Ọ dịka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,
nke na-amịpụta mkpụrụ ya n’oge ya,
nke akwụkwọ ya anaghị akpọnwụ akpọnwụ,
ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. Azịza
3. Ọ dịghị otu a n’ebe ndị ajọ mmadụ nọ;
Mba, n’ihina ha dịka afụrụ ọka nke ikuku na-ebugharị.
N’ihi na Onyenweanyị na-echekwaba ụzọ ndị eziomume,
mana ụzọ ndị ajọ mmadụ na-eduba n’ịla n’iyi. Azịza
MBEKU – Jọn 11: 25, 26.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ, onye ọbụla kwere na m, agaghị anwụ ma ọlị.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 16:19-31
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị Farisee sị: “Ọ dị otu onye ọgaranya nke na-eyi akwa uhie-uhie na ezi akwa ọcha onye na-anọ n’oriri na ọñụñụ ụbọchị niile. O nwere otu ogbenye ọnya juru n’ahụ, a na-akpọ Lazarọs nke na-atọgbọ n’ọnụ ụzọ ama ya. Ihe dị ya mkpa bụ iri iperipe nri si n’oche nri eze dapụ.
Ọ bụladị ụmụ nkịta na-abịa aracha ya ọnya. Mgbe ogbenye a nwụrụ ndị mmụọọma buuru ya buga n’akụkụ Abraham n’ala mmụọ, ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya.
Mgbe ọ nọ n’ọkụmmụọ na-ahụju anya o letịrị anya hụ Abraham n’ebe dị anya ka Lazarọs nọ n’akụkụ ya. O tiri mkpu sị: ‘Nna anyị Abraham, biko, mere m ebere.
Zitenụ Lazarọs ka o detụ ọnụ mkpịsịaka ya na mmiri mejụọ ire m, n’ihina anọ m n’ahụ-ụfụ n’etiti ire ọkụ nke a. Abraham zara ya sị ‘Nwa m, cheta na mgbe ị nọ n’ụwa, i nwetara ezi ihe nke gị, n’otu aka ahụ Lazarọs nwetara sọsọ ahụhụ.
Ma ugbu a, a na-akasị ya obi n’ebe a, ma gị onwe gị nọ n’ahụ-ụfụ. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, e mere ka oke olulu dị n’etiti anyị na ụnụ, ka ndị chọrọ I si ebe a bịakwute ụnụ ghara inwe ike, ka onye ọbụla gharakwa I si ebe ahụ bịakwute anyị.
Ọ rịọkwara sị, ‘Ebe ọ dị otu a, biko, arịọ m gị ka i ziga ya n’ụlọ nna m, n’ihi na enwere m ụmụnne ise ka ọ dọọ ha aka na ntị ka ha onwe ha ghara ị bata n’ebe mmekpahụ a.’
Abraham zakwara ya sị, ‘Ha nwere iwu Mosis na ndị amụma, ha gee ha ntị. Ma ọgaranya ahụ zara ya sị, Ee, nna anyị Abraham, a sị na otu onye ga-esi n’ala ndị nwụrụ anwụ gakwuru ha, ha ga-echegharị.
Abraham gwakwara ya sị, Ọ bụrụ na ha anụghị olu Mosis na nke ndị amụma, ha agaghị echegharị, ọbụladị ma otu onye si n’ala ndị nwụrụ anwụ bịa gwa ha.
Igbo Mass Readings for March 1 2024, Fraịde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
Igbo Mass Readings for February 29 2024, Tọọzde Izuụka nke Abụọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.