Igbo Mass Readings for Thursday of Fourth Week of Lent

THURSDAY: IZU UKA NKE ANO N’OGE AHUHU KRISTI.

EKPERE MMEGHE
Nna Onye ebere, mee ka opipja nke emume lenti anyj mee anyi ndi nke Gi na-erubere Gi isi. Mee ka jhunaanya no n’ime anyi puta ihè n’omume anyi ma duruokwa anyi n’anuri nke mbilite n’onwu. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi …

Ihe Ogugu nke mbu 32:7-14
Ihe ogugu ewetara n’Akwukwo Opupu
Yahweh wee si Mosis, “Gbadaba n’ihi na ndi ahu I si n’ala Ijipt duputa emeruola onwe ha. Ha ejehiela uzo na-egbughi oge obula wee hapu uzo ahu mu tuziiri ha aka, ha akpuolara onwe ha nwa ehi, na akporo ya isiala ma na achukwara ya aja na-asi, “Izrel leenu chi unu bu nke siri n’ala ljipt kpoputa unu.” Yahweh sikwara Mosis, “Ahula m umu Izrel, marakwanu na ha bu ndi isiike. Ugbu a, hapuzie m ka iwe m di oku rechapu ha; ma aga meme ka gi onwe gi buru nnukwu mba.” Ma Mosis rioro Yahweh Chineke si, O Yahweh, gini mere iwe gi na-eji adi oku n’ebe ndi nke gi I jiri ike nke aka gi di egwu kpoputa n’ala Ijipt no? Maka gini ka ndi Ijipt ga-eji kwuo si, ‘Ahaa, o bu maka ihe ojoo o buuru ha n’obi ka o ji raputa ha n’elu ugwu iji gbuo ha werekwa oku rechapu ha n’elu uwa? Biko ka iwe gi di oku dajuo, ka I ghara ime ndi nke gi ihe ojoo nke a. Chetakwa umuodibo gi Abraham, Aizik na Izrel bu ndi I jiri onwe gi nuoro iyi si, ‘Aga m amuba umu-umu ụnu ka ha dika kpakpando nke igwe ma nyekwa ha ala niile a m kwere na nkwa ka o buru nke ha ebeebe. Nke a mere ka Yahweh tugharia uche ya, chefuo ihe nke a o choro ime ndi nke ya.

ABUOMA NA AZIZA: PS:106:19-20, 21-22, 23.
Aziza: Cheta m O Oseburuwa! N’ihi jhu naanya i nwere n’ebe ndi nke gi no.

  1. Ha kpuru nwa ehi na Horeb.
    Ha kporo isiala nye arusi a piri api.
    si otu a were ebube na otito diiri Chineke,
    nye onyinyo ehi na-ata ahihia. Az./
  2. Ha chefuru Chineke nke zoputara ha,
    onye nke ruru oru di egwu n’ala Ijipt.
    Onye nke ruru oru itunaanya n’ala Ijipt,
    na ihe na-atuga egwu n’osimiri uhie. Az./
  3. Ya mere o jiri chee echiche ikochapu ha,
    O gara eme nke a, ma a si na Mosis,
    onye nke o hotara anochighi n’etiti ha
    wee medaa iwe ya di oku. Az./

MBEKU:
Az./
Mkpuru ahu bu okwu Chineke, Jesu bu ogha mkpuru, onye obula biakwutere m ga-adi ndu ebighiebi Az./

OZIOMA 5:31-47
Ihe ogugu ewetara na Ozioma di aso nke Jon dere.
Jesu gwara ndi Juu si: O buru na m na-agbara onwe m akaebe, ihe m na-ekwu abughi eziokwu. O di onye ozo nke na-agbara m akaebe, amakwa m na akaebe o na-agba banyere m bu eziokwu. Unu zigaara Jon ndi ozi, o wee gbaara eziokwu ahu akaebe. bughi na akaebe ahu, a na-agbara m sitere n’aka mmadu, kama ana m agwa unu ihe ndia, ka e wee gbaputa unu. Jon dika mpanaka nke a munyere na-enwu, na-amukekwa. Unu chokwara inuri onu n’ihè ya nwantakiri akaebe nke m nwere kariri nke Jon gbaara m, oge. Ma n’ihina oru niile m na-aru bu oru Nna m nyere m ka m ruo, bu ihe na-agbara m akaebe, na egosikwa na Nna m zitere m. Nna n’onwe ya, onye nke zitere m na-agbakwara m akaebe. Unu anubeghi olu ya, nke unu na-ahu oyiyi ya. Unu anaghikwa edobe okwu ya n’ime unu, n’ihi na unu ekwenyeghi n’onye ahu nke o zitere.
Unu na-enyocha ihe e dere n’Akwukwo Nso n’ihina unu na-eche na unu ga-esite na ha nweta ndu ebeebe, ma o bu ha na-agbara m akaebe, N’agbanyeghi nke a, unu achoghi ibiakwute m ka unu wee nwee ndu. Anaghi m anata otito nke mmadu. Amaara m na unu enweghi ihunaanya nke Chineke n’ime unu. Abiara m n’aha nke Nna m, unu anabataghi m, ma o buru na onye ozo abia n’aha nke aka ya, unu ga-anabata ya. Olee otu unu ga-esi kwere, unu ndi o na-ato uto inara otito nke mmadu ibe unu, ma unu anaghi agba mbo inata otito nke si sooso n’aka Chineke abia? Unu echela na m ga-ebo unu ebubo n’ihu Nna m. O bu Mosis, onye unu tukwasara obi, ga-ebo unu ebubo. O buru na unu kwenyere na Mosis, unu gara ekwenye na m, n’ihina Mosis dere banyere m n’Akwukwo Nso. O buru na unu ekwenyeghi n’ihe ndi o dere, olee otu unu ga-esi kwenye n’okwu m?”
EKPERE NHUNYE
Chineke ji ike niile, lekwasi anya n’adighi ike anyį. Mee ka aja nke a anyj na-ehunyere Gi ritere anyi obi di ocha na ike. Anyį na-ario Gi ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO
Dinwenu, mee ka sacramenti ndi a anyi natara wuchapu njo anyi ma tohapukwa anyi n’ikpe omuma, nihina njo anyi na-eme ka ahuhu na adakwasi anyi, mana nkwa nke nzoputa 1 kwere anyi na-ewetara anyi obi anuri. Anyi na-ario Gi ihe ndia site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.

error: Content is protected !!
Open chat
1
Catholic Lectionary
Hello 👋
How can I help you?