Igbo Mass Readings for January 19 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 19 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:25-28; 8:1-6
Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru
N’ihi nke a, Jesu nwere ike ịzọpụta ndị niile si n’aka ya abịakwute Chineke mgbe niile, ebe ọ bụ na ọ na-adị ndụ mgbe niile, na-arịọtara ha arịrịọ. Ọ bụ ihe ziri ezie na anyị ga-enwe ụdị onye nnukwu ụkọchukwu ahụ, onye dị nsọ, na-enweghị ntụpọ nke ọ na-enwe atụtụ njọ.
E si n’etiti ndị njọ kewapụta ya, ka ọ dị elu karịa eluigwe niile. Ọ dịghị ya mkpa ịchụ aja kwa ụbọchị n’ihi njọ ya niile na n’ihi njọ nke ndịọzọ dịka ndị ụkọchukwu mgbe ochie.
O mere nke a otu mgbe site n’iji onwe ya chụọ aja zuru ezu. N’ezie, iwu na-ahọpụta ndị mmadụ n’adịghị ike ka ha bụrụ nnukwu ụkọchukwu. Ma okwu nke ịñụ iyi ahụ nke na-esote iwu, họpụtara Nwa ahụ, onye e mere ka o zuo oke ebeebe.
Isiokwu nke ihe anyị na-ekwu bụ nke a: anyị nwere nnukwu ụkọchukwu dị otu a: onye na-anọdụ n’aka nri nke ocheeze onye kacha elu n’eluigwe. Onye na-efe ofufe n’ebensọ na n’ezi ụlọikwu nke na-abụghị mmadụ rụrụ, kama ọ bụ Yahweh rụrụ ya.
N’ihina a na-echi onyeisi nchụaja ọbụla ka ọ na-eche onyinye na aja dị icheiche n’ihu Chineke. Ya bụ na ọ dịịrị mkpa na onye ụkọchukwu aghaghị inwe ihe ọ ga-eji na-achụaja.
Ọ bụrụ na ọ nọ n’ụwa, ọ gaghị abụ ụkọchukwu ma ọlị, ebe ọ bụ na e nwere ụkọchukwu ndị na-achụaja dịka iwu si dị. Ha na-egosị nñomi na onyinyo ebensọ nke eluigwe n’ihina mgbe Mosis na-achọ ịrụ ụlọikwu ahụ, Chineke dụrụ ya ọdụ sị, “Hụ na i mere ihe niile n’usoro ahụ e gosịrị gị n’elu ugwu”.
Ma otu ọ dị Kristi natara ọrụ onye nchụaja nke dị elu karịa nke ochie dịka ọgbụgbandụ ọhụrụ ahụ nke o dobere dịka onye ogbugbo n’etiti Chineke na mmadụ si kara mma, n’ihina e dobere ya na nkwa ahụ kacha mma.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 40:7-8, 8-9, 10, 17
Aziza: Anọ m ebe a, a bịara m ime uche gị
1. Ị naghị achọ ịchụ aja mọbụ ihe nrunye kama ntị ghe oghe
Ị naghị achọ ịchụ aja nsureọkụ mọbụ aja maka njọ.
Kama ekwuru m sị, “Anọ m ebe a, ana m abịa”.
N’ime akwụkwọ iwu e dere na m tosịrị ime uche gị
Chineke m, ahụrụ m iwu gị n’anya,
Eji m obi m niile hụ ya n’anya. Azịza
2. Ekwupụtala m eziomume nke Onyenweanyị na nnukwu ọgbakọ.
Lee, emechighị m ọnụ m, ị maara nke a O! Onyenweanyị. Azịza
3. Ka ha jupụta na-añụrị bụ ndị niile na-achọ gị
Ka ha na-ekwu oge niile sị, Onyenweanyị dị ukwuu. Azịza
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Ana m eche Onyenweanyị, mkpụrụobi m na-eche ya, na nkwa ya ka m nwere nchekwube.
Alleluia.
OZIỌMA – 3:7-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Jesu na ndị na-eso ụzọ ya siri ebe ahụ pụọ, gaa n’akụkụ osimiri. Oke igwe mmadụ siri na Galili sobe ya; sikwa na Judia, na Jerusalem, Idumịa na ala dị n’ofe osimiri Jọdan, ruo obodo ndị dị Taya na Sidọn nso, mgbe ha nụrụ ihe niile o mere.
Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha doziere ya otu ụgbọ mmiri, ka oke igwe mmadụ ahụ ghara ịkpagbu ya; n’ihina ọ gwọọla ọtụtụ mmadụ, nke mere na ndị niile nwere ọrịa dị icheiche ji achọsi ike ka ha metụ ya aka.
Ma oge ọbụla ndị mmụọ ọjọọ ji hụrụ ya, ha na-ada n’ala n’ihu ya na-eti mkpu sị, “Ị bụ Nwa Chineke!” Jesu nyesiri ha iwu ike ka ha ghara ime ka a mata ya.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.