Igbo Mass Readings for January 18 2024, Tọọzde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 18 2024, Tọọzde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:6-9; 19:1-7
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ mbụ nke Samuel
Mgbe Devid gbuchara Goliat, ya na ndịagha Izrel na-alọta, ụmụ nwaanyị obodo Izrel niile pụtara izute Sọl. Ha ji abụ na egwu; na-akpọ ụbọ, na-egbu opi. N’egwu ọñụ ha, ha na-agụ sị, Sọl gburu puku kwuru puku, Devid egbuo iri puku kwuru iri puku.
Abụ a were Sọl iwe nke ukwuu. O wee sị, “Ugbu a, ha enyela Devid iri puku kwuru iru puku, nye m naanị puku kwuru paku. Gịnị ọzọ fọdụrụ na-abụghị inyekwu ya ocheeze m!” Ya mere Sọl bidoro na-enwere Devid anyaụfụ, na-enyo ya enyo bido ụbọchị ahụ gaba.
Sọl gwara nwa ya Jonatan na ndịodibo ya niile ebumnuuche ya igbu Devid. Ma Jonatan hụrụ Devid n’anya nke ukwuu, nke mere na ọgwara Devid sị, “Nna m na-achọ igbu gị.
Ya mere, kpachara anya n’ụtụtụ echi. Zoo onwe gị n’otu ebe nzuzo, nọdụkwa m’ebe ahụ. Aga m apụ, guzo n’akụkụ nna m n’ọhịa ebe ahụ ị ga-ezo. Aga m agwakwa ya okwu maka gị. Ihe ọbụla m chọpụtara aga m eme ka ị mara.”
Jonatan toro Devid n’ihu nna ya Sọl, sị, “Emekwala odibo gị bụ Devid ihe ọjọọ, n’ihina ọ dịghị ihe ọbụla o mere gị, kama, ihe niile o mere bụ maka ọdịmma nke gị.
O liri ndụ ya mgbe o gburu Goliat, Yahweh siri n’aka ya nye Izrel nnukwu mmeri. Mgbe ị hụrụ ihe o mere, obi tọrọ gị ụtọ. Gịnị mere ị ga-eji egbu onye aka ya dị ọcha, site n’igbu Devid enweghị ihe o mere?”
Ihe Jonatan gwara Sọl juru ya afọ. O wee ñụọ iyi n’aha Yahweh na ya agaghị egbu Devid. Jonatan kpọrọ Devid, kọọrọ ya ihe niile. E mechaa, ọ kpọjere ya Sọl. Devid wee gbawakwara Sọl odibo dịka na mbụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 56:2-3, 9-10, 10-12, 13-14
Azịza: Na Chineke ka m tụkwasara obi m, anaghị m atụ egwu ọbụla.
1. Meere m ebere, Chineke, mgbe ndị mmadụ na-ebuso m agha,
ụbọchị niile ka ha na-ebu agha megide m
Ndịiro m na-eyi m egwu ụbọchị niile
ọtụtụ ndị mmadụ na-abịa ibuso m agha. Azịza
2. Ị marala nsogbu m
Were karama cheta anya mmiri m
Mgbe ahụ ndịiro m ga-alaghachi azụ
Ozigbo m rịọrọ enyemaka. Azịza
3. Amaara nke a: Chineke nọnyere m
Na Chineke onye m na-eto okwu ya
Na Chineke ka m tụkwasara obi m, anaghị m atụ egwu ọbụla.
Gịnị ka mmadụ nwere ike ime m? Azịza
4. Aga m emejupụta nkwa niile m kwere gị Chineke,
aga m enye gị onyinye ekele m,
N’ihina ị zọpụtala m n’ọnwụ
Ka m wee gaa ije n’ihu nke Onyenweanyị n’ala ndị dị ndụ. Azịza
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Ana m eche Onyenweanyị, mkpụrụobi m na-eche ya, na nkwa ya ka m nwere nchekwube.
Alleluia.
OZIỌMA – 3:7-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Jesu na ndị na-eso ụzọ ya siri ebe ahụ pụọ, gaa n’akụkụ osimiri. Oke igwe mmadụ siri na Galili sobe ya; sikwa na Judia, na Jerusalem, Idumịa na ala dị n’ofe osimiri Jọdan, ruo obodo ndị dị Taya na Sidọn nso, mgbe ha nụrụ ihe niile o mere.
Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha doziere ya otu ụgbọ mmiri, ka oke igwe mmadụ ahụ ghara ịkpagbu ya; n’ihina ọ gwọọla ọtụtụ mmadụ, nke mere na ndị niile nwere ọrịa dị icheiche ji achọsi ike ka ha metụ ya aka.
Ma oge ọbụla ndị mmụọ ọjọọ ji hụrụ ya, ha na-ada n’ala n’ihu ya na-eti mkpu sị, “Ị bụ Nwa Chineke!” Jesu nyesiri ha iwu ike ka ha ghara ime ka a mata ya.
Igbo Mass Readings for January 19 2024, Fraịde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for January 18 2024, Tọọzde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.