Igbo Mass Readings for May 4 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 4 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 13:13-25

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Pọl na ndị otu ya siri Pafọs jiri ụgbọmmiri ruo Pega nke dị n’ala Pamfilịa. Ebe a ka Jọn hapụrụ ha laghachi Jerusalem. Ha sikwara Pega ruo Antiọk nke dị n’ala Pisidia.

N’ụbọchị Sabat, ha banyere n’ụlọ nzukọ ndị Juu nọdụ ala. Mgbe a gụpụtachara ihe site n’Akwụkwọ Iwu Mosis na site n’Akwụkwọ ndị amụma, ndịisi ụlọ nzukọ ahụ zigaara ha ozi sị, “Ụmụnne anyị ọ bụrụ na ụnụ nwere okwu agbamume ụnụ ga-ekwu, bịanụ gwa anyị.

Pọl biliri feere ha aka ka ha gee ntị, bido kwube okwu sị, “Ndị Izrel ibe m, na ndị mba ọzọ, ndị na-atụ egwu Chineke nọ ebe a, geenụ m ntị. Chineke nke Izrel, họọrọ nnanna anyị ha, mee ka ha bụrụ oke mba oge ha bi n’ala ljipt.

O ji ike aka ya dupụta ha n’ala ahụ. O dikwara omume ha ihe dịka iri afọ anọ n’ọzara. O kpochapụrụ ndị bi n’obodo asaa dị n’ala Kenaan, were ala ha nye ndị Izrel, ka ihe nketa, ihe dịka narị afọ anọ na iri ise.

Ka nke a gachara, o nyere ha ndị ọkaikpe, dịka ndị ndu wee ruo oge nke Samuel onye amụma. Ha rịọrọ ya ka e nye ha eze, Chineke nye ha Sọl nwa Kish, onye si n’agbụrụ Benjamin, ka ọ bụrụ eze ha.

Ọ chịrị ha iri afọ anọ. Mgbe Chineke wepụrụ ya n’ọchịchị. Ọ kpọlitere Devid ka ọ bụrụ eze ha, onye ọ gbaara akaebe, sị, “Ahụla m Devid nwa Jese dịka ụdị mmadụ m chọrọ, onye ga-eme ihe niile bụ uche m.

Ọ bụ site na ụmụụmụ nwoke a ka Chineke si wetara ụmụ Izrel onye nzọpụta dịka o si kwe na nkwa. Tupu ọbịbịa ya, Jọn ekwusaarala ndị Izrel banyere mmirichukwu nke nchegharị.

Na ngwụcha ọrụ Jọn, o kwuru sị, “Onye ka ụnụ chere na m bụ? Abụghị m onye ahụ ụnụ na-atụ anya ya. Kama leenụ! Otu onye na-esochi m n’azụ, onye mụ etorughị ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.”

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 89: 2-3, 21- 22, 25, 27.

Azịza: Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe-ebeebe.

1. Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyi ebeebe-ebeebe;

bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ aga m na-ekwupụta ntụkwasịobi gị.

N’ihina ịhụnaanya gị ga-adị ebeebe,

ikwesị ntụkwasịobi gị ga-akwụdosi ike dịka igwe. Azịza

2. Ahọọrọla m nwodibo m bụ Devid,

eteela m ya mmanụ ka ọ bụrụ eze.

Aga m anọnyere ya oge niile,

enyemaka m ga-abụ ike ya. Azịza

3. Ịhụnaanya m na ịkwụdosiike m ga-anọnyere ya oge niile,

aga m enye ya mmeri oge niile n’ihi aha m.

Ọ ga-ebeku m sị, “Ị bụ nna m, Chineke m na onye enyemaka m.” Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Jesu asị Tọmọs, “I kwerela n’ihi na ị hụrụ m? Ngọzi ga-adịrị ndị na-ahụghị ma kwere.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 13:16-20.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere. Mgbe Jesu sachara ụkwụ ha, ọ sịrị ha, N’ịgwa ụnụ eziokwu odibo anaghị aka nna ya ukwu, nke onye e zitere na-aka onye zitere ya.

Ọ bụrụ na ụnụ maara ihe ndị a, ngọzi ga-adịrị ụnụ ma ụnụ na eme ha. Anaghị m ekwu maka ụnụ niile, Ama m ndị m họọrọ kama ọ bụ ka e mejupụta ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ sị, “Onye mụ na ya rikọrọ nri amalitela imegide m.”

Ana m agwa ụnụ nke a ugbu a tupu o mezuo, ka ọ ga-abụ mgbe o mezuru, ụnụ ekwere na-abụ m ihe m bụ. Ana m agwa ụnụ eziokwu, onye ọbụla nke nabatara onye m ga-ezite, nabatara m. Onye nabatara m, na- anabatakwa onye zitere m.”

Igbo Mass readings for May 5 2023, Fraịde n’ime Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for May 4 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Anọ n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Last Update: April 15, 2022