Igbo Mass Readings for May 16 2024, Tọọzde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 16 2024, Tọọzde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 22:30-23:6-11

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Mgbe chi bọrọ, onyeisi ọchịagha chọsiri ike ka ọ mata isi okwu, na ihe mere ndị Juu ji bo Pọl ebubo. Ọ gwara ndịisi nchụaja na ndị nzukọ Sanhedrịn niile ka ha zukọọ.

Ọ bịa tọpụ Pọl agbụ, kpọta ya kwụba ya n’ihu ha. Mgbe Pọl chọpụtara na otu ụzọ n’ime nzukọ ahụ bụ ndị otu Sadusii, ndị ọzọ abụrụkwa ndị otu Farisii, o tiri mkpu n’ime ụlọ nzukọ ahụ, sị: “Ụmụnne m! Abụ m onye Farisii, na nwa ndị Farisii.

A na-ekpe m ikpe n’ebe a banyere olile anya anyị nwere n’ebe mbilite n’ọnwụ dị.” Mgbe o kwuchara okwu a, esemokwu dapụtara n’etiti ndị Farisii na ndị Sadusii. Ọgbakọ ahụ wee kewaa.

N’ihi na ndị Sadusii na-akuzi na mbilite n’ọnwụ, ma ọ bụ mmụọọma, ma ọ bụ mmụọ adịghị. Ma ndị Farisii kwekwara, na-akuzi na ihe ndị a dị. Oke mkpọtụ bịara dapụta, ụfọdụ ndị nkuzi iwu, ndị nọ n’otu ndị Farisii, guzooro ọtọ, kwado Pọl sị: “O nweghị ihe ọjọọ anyị hụrụ nwoke a mere!

Kedụkwanụ ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ, ma ọ bụ mmụọọma gwara ya okwu?” Esemokwu a bịara karịa, nke mere onyeisi ọchịagha bịara tụọ egwu na ha ga-adọkasị Pọl.

Ọ gwara ndị agha ya, ka ha banye n’igwe mmadụ ahụ, were ike napụta Pọl n’aka ha ziga ya n’ụlọ ndị agha. N’abalị sonụ, Dinwenụ kwụụrụ n’akụkụ Pọl, sị ya: “Obi sie gị ike! N’ihi na otu a i si kwupụta m na Jerusalem, ka ị ga-esi agbara m ama na Rom.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 16: 1-2, 5, 7-8, 10, 11.

Azịza: Chekwaba m, Chineke, n’ihi na Ị bụ ebe mgbaba m.

1. Chekwaba m, Chineke, n’ihi na Ị bụ ebe mgbaba m.

Agwara m Onyenweanyị sị,” Gịnwa bụ Chineke m,

Ihe ọma niile m nwere si n’aka gị bịa.” Azịza

2. Ana m eto Onyenweanyị bụ onye na-agbaziri m,

n’ime abalị, mmụọ m na-enye m ndụmọdụ;

Ana m eche echiche banyere Onyenweanyị mgbe niile,

n’ebe Ọ nọ n’aka nri m, egwu agaghị atụ m. Azịza

3. N’ihi nke a mkpụrụobi m nọ n’ọñụ,

mmụọ m na-enwe añụrị ahụ m na-ezukwa ike

n’enweghị nsogbu ọbụla.

N’ihina Ị gaghị agbahapụ mkpụrụobi m n’ala mmụọ,

ma ọ bụ kwe ka onye ị hụrụ n’anya ree ure. Azịza

4. Ị ga-akuziri m ụzọ nke ndụ,

ị ga-enye m añụrị na-enweghị ube n’ihu gị,

n’aka nri gị, aga m enwe añụrị dị ebeebe. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Jesu kwuru sị: “Nna m ga-ezitere ụnụ mmụọ Nsọ nke ga-anọnyere ụnụ ebeebe ebeebe.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 17: 20-26

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Jesu leliri anya n’eluigwe were kpee ekpere sị: “Ọ bụghị naanị ha ka m na-ekpere ekpere. Kama ana m ekpekwa ekpere banyere ndị sitere n’okwu ha wee kwere na m.

Ana m ekpekwa ekpere ka ha bụrụ otu. Nna, mee ka ha dịrị n’ime anyị, dịka gị onwe gị si dị n’ime m, mụ onwe m adị n’ime gị. Mee ka ha bụrụ otu, ka ụwa niile wee kwere na gị zitere m.

Otito nke i nyere m ka m nyere ha, ka ha wee bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu. Ka m biri n’ime ha, gị onwe gị ebiri n’ime m; ka ha bụrụ otu n’ụzọ zuru oke, ka ụwa wee kwere na ọ bụ gị zitere m, hụkwa ha n’anya dịka i si hụ m n’anya.

Nna achọrọ m ka ndị niile i nyere m soro m nọrọ n’ebe m nọ, ka ha nwee ike ịhụ otito nke i nyere m n’ịhụnaanya gị tupu ekee ụwa. Nna nke eziomume, Ụwa amatabeghị gị, ma ama m gị.

Ndị a makwa na ọ bụ gị zitere m. E mere m ka ha mata aha gị, aga m na-emekwa ya, ka ịhụnaanya nke i nwere n’ebe m nọ dịrị n’ime ha, mụ onwe m ebirikwa n’ime ha.

Igbo Mass readings for May 17 2024, Fraịde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Igbo Mass Readings for May 16 2024, Tọọzde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X
Scroll to Top

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.