Igbo Mass Readings for February 27 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 27 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:1-8

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Sịrak

Atụkwasịkwala obi gị n’akụnụụba gị, mọbụ na-asị, “Enwezuela m”. Ekwekwala ka ọchịchọ gị niile chịba gị. Esokwala agụụ niile nke obi gị. Asịkwala, “Onye nwere ike n’ebe m nọ?”

N’ihina Yahweh ga atarịrị gị ahụhụ maka nke a. Asịkwala, “Emeela m njọ, kedụkwanụ ihe mere m?” maka na iwe nke Yahweh ji nwayọọ abịa, Ejikwala ntụkwasịobi i nwere na mgbaghara njọ wee na-eme njọ na-atụkwasị n’elu njọ.

Ekwukwala sị, “Obiebere ya ebuka, Ọ ga-agbaghara ọtụtụ njọ m niile”. N’ihina ma ebere ma iwe bụ nke ya. Iwe ya na-adakwasị ndị mmehie.

Atụfukwala oge n’ịlaghachi azụ n’ebe Yahweh nọ, mọbụ na-ebugharị ya mgbe mgbe, maka na mberede, iwe nke Yahweh ga abịa. N’oge ahụhụ Ọ ga-ala gị n’iyi.

Atụkwasịkwala obi n’akụnụụba e nwetara n’ụzọ ezighị ezi, maka na ọ gaghị abara gị uru n’ụbọchị mbibi.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.: 1:1-2, 3, 4, 6.

Azịza: Añụrị na-adịrị ndị tụkwasịrị obi na Onyenweanyị.

1. Añụrị ga-adịrị nwoke ahụ nke anaghị eso

ndụmọdụ onye ajọomume,

mọbụ na-akwụgharị n’ụzọ ndị ome njọ,

mọbụ nọdụ n’otu ndị na-ekwutọ Chineke.

Kama ọ na-enwe añụrị n’ebe iwu Onyenweanyị dị;

ma na-achịgharị iwu ya n’obi ya ehihie na abalị. Azịza

2. Ọ dị ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,

nke na-amịpụta mkpụrụ ya n’oge ya,

nke akwụkwọ ya anaghị akpọnwụ akpọnwụ,

ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. Azịza

3. Ọ dịghị otu a n’ebe ndị ajọ mmadụ nọ;

Mba, n’ihina ha dịka afụrụ ọka nke ikuku na-ebugharị.

N’ihina Onyenweanyị na-echekwaba ụzọ ndị eziomume,

mana ụzọ ndị ajọ omume na-eduba n’ịla n’iyi. Azịza

MBEKU – Ps. 27:11

Alleluia, Alleluia:                                    

Kuziere m ụzọ gị, O Dinwenụ, Dube m n’ụzọ kwụ ọtọ.

Alleluia.

OZIỌMA – 9:41-50

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, n’ezie agwa m ụnụ onye ọbụla nke ga ekunye ụnụ otu iko mmiri ka ụnụ ñụọ n’ihina ụnụ bụ ndị nke Kristi, aghaghị ịnata ụgwọ ọrụ ya.

“Onye ọbụla ga-eme ka otu n’ime ụmụntakịrị ndị a kwere na m daba na njọ, ọ ga-akara onye ahụ mma ma a sị na a nyabara ya nnukwu nkume e ji egwe ọka n’olu, tụba ya n’ime osimiri.

Ọ bụrụ na aka gị abụọ ga-eme ka ị dahie ụzọ bepụ ya; ọ ga akara gị mma ịbụrụ ọrụsị banye na ndụ, karịa inwe aka gị abụọ wee baa n’ọkụmmụọ, n’ọkụ na-adịghị anyụanyụ.

Ọzọ, ọ bụrụ na ụkwụ gị ga eme ka ị dahie, gbupụ ya; ọ ga-akara gị mma ịba na ndụ na ngwọrọ, karịa inwe ụkwụ abụọ a tụba gị n’ọkụmmụọ.

Ọ bụrụkwa na anya gị ga-eme ka ị dahie, ghụpụ ya; ọ ga-akara gị mma inwe otu anya ma banye n’Alaeze Chineke, karịa inwe anya abụọ a tụba gị n’ọkụmmụọ, ebe ikpuru na-ata ha na-adịghị anwụ anwụ.

A dịghị emenyụkwa ọkụ ya emenyụ. N’ihina a ga-eji ọkụ ñụchaa onye ọbụla. Nnu bụ ihe dị mma, ma ọ bụrụ na nnu atụfuo ụtọ ya, kedụ ka a ga-esi mee ka ọ dị ụtọ ọzọ? Nweenụ nnu n’ime onwe ụnụ, ụnụ na ibe ụnụ dịkwa n’udo.”

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for February 27 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 8, 2022