Igbo Mass Readings for June 1 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 1 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 42:15-25
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Sịrak
Ugbu a, ka m chetara ụnụ aka ọrụ nke Onyenweanyị, wee kọọrọ ụnụ ihe m jiri anya m hụ. Site n’okwu ya a ka Onyenweanyị si kee ihe niile. Ihe o kere na-erubere ya isi. Anyanwụ na-achakwasị ihe niile. N’ezie, ọrụ nke Onyenweanyị jupụtara n’ebube ya.
Onyenweanyị enyeghị ndị nke ya dị nsọ ike ikwupụtacha ọrụ ịtụnaanya niile nke ya bụ onye pụrụ ime ihe niile rụrụ, iji mee ka ụwa niile kwụsịe ike n’ebube ya. Ọ na-enyocha ụmị ahụ enweghị njedebe. Ọ na-ahụ obi mmadụ, marakwa ihe nzuzo na ihe aghụghọ dị na ha. Maka na Onyekachaelu mazu ihe niile.
Ọ ghọtara ihe ịrịbaama nke oge dị icheiche nke ọma. Ọ na-ekwupụta ihe niile gara aga na ihe niile ga-adị n’ihu, na-ekpughekwa ụkpụrụ nke ihe niile e zoro ezo. O nweghị otu mkpụrụ echiche Ọ maghị, nke Ọ na-enwe otu mkpụrụ okwu zoro ezo n’ebe Ọ nọ.
O dobere usoro ebube niile nke amamihe ya. Ọ dị site n’ebighịebi ruo n’ebighịebi. O nweghị ihe e nwere ike ịgbakwunye mọbụ wepụ na ya. O nweghị mkpa maka onye ndụmọdụ ọbụla.
Lee ka aka ọrụ ya niile siri maa mma, na-eto akpịrị. Lee ka ha si amụkesị n’anya. Ihe ndị a niile ga-adịrị gawa ebighịebi, maka igbo mkpa ọbụla. Ha niile na-eruwere ya isi. Ihe niile dị abụọ abụọ, oke na nne, ihu na azụ. O nweghi ihe Onyenweanyị kere ezughị oke.
Otu na-eme ka mma nke ọzọ zuo oke. Aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe akwọọ aka nri. Onye hụzurula ebube nke Chineke?.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.: 33:2-3, 4-5, 6-7, 8-9.
Azịza: Ọ bụ site n’okwu ọnụ nke Onyenweanyị ka O jiri kee eluigwe niile.
1. Werenụ ụbọ akwara too Chineke;
werenụ une kụọrọ ya egwu,
kweerenụ Chineke ukwe ọhụrụ
werenụ ike ụnụ niile kweere Onyenweanyị ukwe mmeri. Azịza
2. N’ihina okwu nke Onyenweanyị bụ eziokwu,
Ọ na-akwụdosiike n’ọrụ ya niile.
Ọ hụrụ eziomume na ikpe nkwụmọtọ n’anya.
Ịhụnaanya ya jupụtara n’ụwa. Azịza
3. Ọ bụ site n’okwu ọnụ nke Onyenweanyị ka O jiri kee eluigwe niile.
O ji ụfụrụ ya kee ihe niile dị n’ime ya.
Ọ bụ ya kekwara osimiri niile. Chịkọta ha ọnụ otu ebe,
kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọajụ dị ukwuu. Azịza
4. Tụọnụ Chineke egwu, ụnụ ndị niile bi n’ụwa,
ka ndị niile bi n’ụwa sọpụrụ ya.
N’ihina O kwuru okwu, ụwa wee dị,
O nyere iwu, ihe niile e kere eke wee dị. Azịza
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Jesu gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa, onye ọbụla na-eso m agaghị aga n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ihe nke ndụ.”
Alleluia.
OZIỌMA – 10:46-52
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Mgbe Jesu na ndị na-eso ụzọ ya, na oke igwe mmadụ so ha na-ahapụ obodo Jeriko, Batimeus, onye arịrịọ kpuru isi nwa Timeus nọkwa n’akụkụ ụzọ.
Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jesu onye Nazaret na-agafe, ọ malitere iti mkpu, sị, “Jesu, Nwa Devid, mere m ebere!” Ọtụtụ baara ya mba, gwa ya ka o mechie ọnụ ya. Kama o tisiri mkpu ike, sị, “Nwa Devid, meere m ebere!” Jesu kwụsịrị sị, “Kpọọnụ ya”.
Ha akpọọ onye isi ahụ sị ya, “Obi sie gị ike; kulie, ọ na-akpọ gị”. O wee chịfuo uwe ya, zọlie ije, bịakwute Jesu. Jesu jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị na-achọ ka m meere gị?”
Onyeisi ahụ zara sị ya, Nna anyị, ka m hụ ụzọ. Jesu sị, “Gaba, okwukwe gị emeela ka ahụ dị gị mma”. Ozigbo ahụ ọ hụrụ ụzọ, ma malitekwa iso Jesu n’ije ya.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.