Igbo Mass Readings for May 30 2024, Tọọzde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 30 2024, Tọọzde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:2-5, 9-12

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Pita nke Mbụ

Dịnụ ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ka agụụ okwu Chukwu na-agụsi ụnụ ike dịka mmiri ara si agụ ụmụ a mụrụ ọhụrụ ka ọ ga-abụ site n’ịnụ ya ụnụ etoruo nzọpụta. N’ihina ụnụ edetụla obiọma nke Onyenweanyị ire.

Bịakwutenụ onye ahụ bụ okwute dị ndụ nke ndị mmadụ jụrụ ajụ nke Chineke họpụtara nyekwa ya nsọpụrụ. Bịanụ ka e were ụnụ dịka okwute dị ndụ wuo ụlọ nke Mmụọ Nsọ ebe ụnụ ga-eje ozi dịka ndị nchụaja dị nsọ na ndị na-achụaja nke mmụọ nke na-adị Chineke mma site na Jesu Kristi.

Ma ụnụ bụ agbụrụ a họtara ahọta ndị nchụaja nọ ọkwa eze mba dị nsọ ndị Chineke nwetaara onwe ya. Ụnụ onwe ụnụ bụ ndị e si n’ọchịchịrị kpọbata n’ihe nke ya dị ebube na-ekwupụta aka ọrụ ya n’ụwa niile.

N’oge mbụ ụnụ abụghị ndị nke Chineke. Mana ugbu a ụnụ bụ ndị nke ya. Mgbe ahụkwa ụnụ amaghị ebere Chineke ma ugbu a obi ebere ya erutela ụnụ aka.

Ndị m hụrụ n’anya ana m arịọ ụnụ ka ụnụ na eme omume dịka ndị ije na ndị ọbịa n’elu ụwa. Ụnụ esokwala eme ihe ọjọọ dị icheiche na-agụ ahụ ụnụ agụụ nke na-alụkwa ọgụ mgbe niile megide mkpụrụobi ụnụ.

Na-ebinụ ezi ndụ n’etiti ndị mba ọzọ ka ọ ga-abụ ha na-akpọ ụnụ ndị ọjọọ ha nwere ike site n’ezi ọrụ ụnụ niile nke ha na-elere anya too Chineke n’ụbọchị ọ ga-abịa.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 100: 1-2,3,4,5

Azịza: Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu nke Onyenweanyị.

1. Ụwa niile tijerenọ Onyenweanyị mkpu ọñụ,

Werenụ ọñụ fee Onyenweanyị ofufe

Werenụ iti mkpu ọñụ bịa n’ihu ya. Azịza

2. Maranụ na Onyenweanyị bụ Chineke,

ya kere anyị. Ọ bụkwa ya nwe anyị,

anyị bụ ndị nke ya, anyị bụkwa igwe atụrụ ya. Azịza

3. Werenụ ekele baa n’ọnụụzọ ama ya niile,

werenụ otito baa n’ogige ya niile;

kelenụ ya, gọziekwanụ aha ya. Azịza

4. N’ihina Onyenweanyị dị mma,

Ịhụnaanya ya na-adị ebeebe,

ntụkwasịobi ya na-adịgide bido na-ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Jesu gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa, onye ọbụla na-eso m agaghị aga n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ihe nke ndụ.”

Alleluia.

OZIỌMA – 10:46-52

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Mgbe Jesu na ndị na-eso ụzọ ya, na oke igwe mmadụ so ha na-ahapụ obodo Jeriko, Batimeus, onye arịrịọ kpuru isi nwa Timeus nọkwa n’akụkụ ụzọ.

Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jesu onye Nazaret na-agafe, ọ malitere iti mkpu, sị, “Jesu, Nwa Devid, mere m ebere!” Ọtụtụ baara ya mba, gwa ya ka o mechie ọnụ ya.

Kama o tisiri mkpu ike, sị, “Nwa Devid, meere m ebere!” Jesu kwụsịrị sị, “Kpọọnụ ya”. Ha akpọọ onye isi ahụ sị ya, “Obi sie gị ike; kulie, ọ na-akpọ gị”.

O wee chịfuo uwe ya, zọlie ije, bịakwute Jesu. Jesu jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị na-achọ ka m meere gị?” Onyeisi ahụ zara sị ya, Nna anyị, ka m hụ ụzọ. Jesu sị, “Gaba, okwukwe gị emeela ka ahụ dị gị mma”. Ozigbo ahụ ọ hụrụ ụzọ, ma malitekwa iso Jesu n’ije ya.

Ozigbo ahụ ọ hụrụ ụzọ, ma malitekwa iso Jesu n’ije ya.

Igbo Mass Readings for May 31 2024, Emume Nleta Vegin Marịa gara Ileta Elizabet

Igbo Mass Readings for May 30 2024, Tọọzde Izuụka nke Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 8, 2022