Igbo Mass Readings for December 16 2027, Tọọzde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka December 16 2027, Tọọzde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị .

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 54:1-10

Ihe ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ onye amụma Aịzaya

Kwebe ukwe gị nwaanyị aga, gị bụ onye na amụtaghị nwa; kwesie ukwe ike ma werekwa olu ike tie mkpu, gị onye na-anọbeghị n’ihe ụfụ nke ịmụ nwa. N’ihi na ụmụnwaanyị na-amụtabeghị nwa ga-abawanye karịa ụmụ onye nọ na di, ọ bụ Yahweh na ekwu.

Mee ka ala ebe obibi gị buwanye ibu, gbatịakwa akwa I ji ekpuchigide ebe obibi gị, alakwala azụ, gbatịa eriri ya, mekwaa ka osisi ya sikwa ike n’ala. N’ihi na Ị ga-agbasa n’akụkụ ụwa niile, ụmụụmụ gị ga-achụpụ ọtụtụ mba n’obodo ha bichie na ha.

Atụkwala egwu ọbụla maka na ihere agaghị eme gị, kwụsie ike n’ihi na a gaghị emenye gị ihere, n’ihi na Ị ga echezo ihere mere gị mgbe Ị bụ agbọghọbịa; Ị gaghị echetakwa ụwa ọjọọ dịka nwaanyị ajadu.

N’ihina onye kere gị bụ di gị, aha ya bụ Chineke nke igwe ndịagha; Onye Nsọ nke Izrel bụ onye nzọpụta gị, aha ya bụ Chineke nke ụwa niile. N’ihi na Yahweh akpọọla gị, dịka nwaanyị e chezọrọ echezọ emewapụrụ obi na mmụọ, dịka nwaanyị a lụrụ ọhụrụ a chụpụrụ achụpụ, Osebụrụwa na-ekwu.

Naanị nwa obere oge ka m gbahapụrụ gị, manà aga m eji nnukwu obi ebere kpọghachi gị azụ. Maka nnukwu iwe nke m were naanị obere oge, ezoro m ihu m n’ebe Ị nọ, ma n’ihi ịhụnaanya m na enweghị njedebe, aga m emere gị ebere, ọ bụ Chineke onye nzọpụta gị na-ekwu.

Maka na n’ebe m nọ ihe a dịka n’oge nke Noa: dị ka m siri ñụọ iyi na mmiri nke Noa agaghị ekpochapụ ụwa ọzọ, ana m añụ iyi na a gaghị eweso gị iwe ọzọ ma ọ bụ baara gị mba.

Nnukwu ugwu nwere ike isi n’ebe ọ nọ pụọ, ma ọ bụ, e bugharịa obere ugwu, ma ịhụnaanya m n’ebe Ị nọ ga adigide, ma ọgbụgbandụ udo mụ na gị gbara agaghị enwe mmebi, Ọ bụ Yahweh onye nwere obi ebere n’ebe ị nọ kwuru nke a.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 30: 2-4, 5-6, 11-12, 13.

Azịza: Aga m eto gị O Chineke n’ihi na Ị zọpụtala m.

1. Aga m eto gị O Chineke n’ihi na Ị zọpụtala m,
Ị kweghị ka ndị iro m merie.
Chineke Ị zọpụtala m n’ala mmụọ,
Naanị m ka Ị zọpụtara na ndị dabara n’ọnụ ọnwụ. Azịza

2. Ụnụ ndị kwụdosiriike na Chineke kụọrọnụ ya egwu,
chetanụ ịdị nsọ ya, ma toonụ ya.
Iwe ya anaghị ete aka,
ma amara ya na-adịgide,
n’oge abalị ịkwa akwa na-adị,
ma ka chi bọrọ añụrị na-adị. Azịza

3. Nụrụ olu m, ma meere m ebere, Chineke,
Chineke bụrụ onye enyemaka m.
Ị meela ka irụ ụjụ m ghọọ ọñụ,
Chineke na Chukwu m, aga m eto gị ebeebe. Azịza

MBEKU

ALLELUỊA ALLELUỊA

Dozienụ ụzọ Onyenweanyị, Meenụ ka ụzọ ya kwụrụ ọtọ, mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta nke Chineke.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 7:24-30

Ihe ọgụgụ ewetara n’oziọma dị asọ nke Luk dere.

Mgbe ndị ozi Jọn lara, Jesu malitere ịgwa igwe mmadụ ahụ okwu banyere Jọn sị, “Olee ihe ụnụ gara ka ụnụ hụ n’ime ọzara? Ọ bụ ahịhịa nke ifufe na-efegharị? Gịnị ka ụnụ pụrụ ka ụnụ hụ?

Ọ bụ nwoke yi uwe dị lọrịlọrị? Lee, ndị yi oke uwe; ndị bi n’oke oriri na n’oke ọñụñụ bi n’obi ndị eze. Gịnịkwa ka ụnụ pụrụ ka ụnụ hụ? Ọ bụ Onyeamụma? Ee, asị m ụnụ, ọ bụ onye kariri onye amụma.

Ọ bụ maka onye a ka e ji dee sị, ‘Lee ana m ezipụ onye ozi m n’ihu gi, onye ga-edozi ụzọ gị tupu ọbịbịa gị’. Agwa m ụnụ: n’etiti ndị niile nwaanyị mụrụ, o nweghị onye ọbụla ka Jọn, ma onye dị karịrị nta n’alaeze Chineke ka ya ukwuu.”

Mgbe ha nụrụ nke a, ndị mmadụ niile na ndị ọnaụtụ nọ n’ebe ahụ bụ ndị e mere mmirichukwu nke Jọn kwere n’ezie na Chineke bụ onye eziomume; ma ndị Farisii na ndị ọkaiwu jụrụ imezu ebumnobi Chineke n’ebe ha onwe ha nọ. Ha ekweghịkwa ka Jọn mee ha mmirichukwu.

Igbo Mass Readings for December 17 2027, Tuezde Izuụka nke Atọ n’Oge Adventi

Igbo Mass Readings for December 16 2027, Tọọzde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.

Last Update: December 8, 2021