Igbo Mass Readings for January 26 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 26 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 10:19-25
Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru
Ụmụnna m, anyị nwere ntụkwasịobi ịbanye n’ebe nchụaja site n’ọbara Jesu, na site n’ụzọ ọhụrụ dị ndụ, nke o megheere anyị site n’akwa mkpuchi.
Ya bụ, site n’ahụ ya. Ebe anyị nwere nnukwu ụkọchukwu nke na-elekọta ụlọ Chineke, ngwanụ ka anyị were otu obi, okwukwe siri ike na obi anyị nke a sachapụrụla site n’ajọ akọnuuche bịa Chineke nso. Ka anyị werekwa ahụ anyị nke e jiri mmiri sachaa bịaruo ya nso.
Ka anyị jidesie olileanya ahụ nke anyị na-ekwupụta n’enweghị nkolopụ n’ihina onye ahụ kwere anyị nkwa kwesịrị ntụkwasịobi.
Ka anyị cheenụ otu anyị ga-esi na-akpalite ịhụnaanya na eziọrụ n’ebe ibe anyị nọ. Ka anyị gharanụ ịhapụ ịna-ezukọta ọnụ otu ụfọdụ si eme, kama, ka anyị na-agbarịtanụ ibe anyị ume, ọ kachakwa ugbu a ụbọchị na-erute nso.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 24:1, 2, 3-4, 5-6.
Azịza: Onyenweanyị, Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ ịhụ ihu gị
1. Chineke nwe ụwa na ihe niile dị na ya,
Ụwa na ndị niile bi n’ime ya;
Ọ bụ ya wukwasara ya n’elu mmiri.
Ọ bụ ya wuru ya n’elu osimiri. Azịza
2. Onye nwere ike ịrịgoro n’ugwu nke Onyenweanyị?
Onye nwere ike ịnọ n’ebe ya dị nsọ?
Onye aka ya na obi ya dị ọcha.
Onye anaghị etinye obi ya n’ihe efu,
Onye anaghị añụ iyi asị. Azịza
3. Onye dị otu a ga-anata ngozi n’aka Onyenweanyị,
Ọ ga-anatakwa eziomume n’aka Chineke onye nzọpụta ya. Azịza
4. Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ Onyenweanyị,
ndị na-achọ ihu Chineke nke Jekọb. Azịza
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Okwu gị bụ mpanaka na-edu m, bụrụkwa ịhe n’ụzọ m.
Alleluia.
OZIỌMA – 4:21-25
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Jesu jụrụ igwe mmadụ ahụ sị, “A na-ebute mpanaka ka e jiri efere kpuchie ya mọbụ ka a dọba ya n’okpuru akwa ndina? Ọ bụ ihe a na eme abụghị ịdọkwasị ya n’elu ihe ịdọkwasị ọkụ?
O nweghị ihe e zoro ezo nke na-agaghị apụta ihe; o nweghịkwa ihe e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe. Onye nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ”.
Ọ sịkwara ha, “Kpacharanụ anya n’ihe ụnụ na-anụ, n’ihina otu ụnuụ si meso ndị ọzọ ka a ga-esi meso ụnụ, ma meso ụnụ karịa. Onye ọbụla nwerenụ ka a ga agbakwunyere ọzọ; ma onye na-enweghị ihe o nwere, ọ bụladị ndị o nwere enwe, a ga-anapụ ya ha”.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.