Igbo Mass Readings for September 7 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 7 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:9-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Kolosi

Ya mere, site n’ụbọchị anyị nụrụ maka ya, anyị akwụsibeghị ikpere ụnụ ekpere. Anyị na-arịọ ka ụnụ jupụta n’amamihe nke uche ya, n’ime nghọta na amamihe nke mmụọ niile.

Biekwanụ ndụ kwesịrị Dinwenụ, nke jupụtara na mmasị ya na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ niile, na-abawanyekwa n’amamihe nke Chineke. Ka e jiri ike niile gbaa ụnụ ume dịka ebube nke ike ya siri dị.

Ka ụnụ jiri ọñụ nwee ndidi na ogologo ntachiobi, na-enye Nna ekele, onye mere ka anyị tosi iketa oke n’ihe nketa nke ndị nsọ nọ n’ebube.

Ọ zọpụtala anyị n’ike nke ọchịchịrị, bịa kpọfee anyị n’alaeze nke Nwa ya ọ hụrụ n’anya; onye anyị si na ya nwee nzọpụta nke bụ mgbaghara njọ niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 98:2-3, 3-4, 5-6

Azịza: Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya

1. Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya

O meela ka mba niile mata eziomume ya

O chetala ịhụnaanya ya na ịkwụdosiike ya

n’ebe ezinụụlọ nọ; Azịza.

2. Akụkụ ụwa niile

ahụla nzọpụta nke Chineke anyị

Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ,

Werenụ ukwe na mkpu ọñụ too ya. Azịza.

3. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe

werenụ ụbọ akwara na ihe egwu

dị icheiche tiere Onyenweanyị egwu!

Werenụ opi igwe na mpi

kwupụta na Onyenweanyị bụ eze. Azịza.

MBEKU – Jọn 8:12

Alleluia, Alleluia:        

Abụ m ihe nke ụwa, onye ọbụla na-eso m ga-enwe ihe nke ndụ.

Alleluia

OZIỌMA – 5:1-11

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Ka Jesu guzo n’ọdọmmiri Genesaret, oke igwe mmadụ zukọrọ na-adagide ya ka ha nụrụ okwu Chineke. Ọ hụrụ ụgbọmmiri abụọ n’ụsọ ọdọmmiri ahụ; ma ndị ọkụazụ esila n’ụgbọ ahụ pụọ na-asa ụgbụ ha.

Ka Jesu banyere n’ime otu ụgbọ ahụ nke bụ nke Saịmọn, Ọ gwara ya ka o si n’ala kwọpụ ụgbọmmiri ya ntakịrị. O wee nọdụ ala si n’ụgbọmmiri ahụ na-akụziri ndị mmadụ ihe.

Mgbe Jesu kwubiri okwu, Ọ gwara Saịmọn sị, “Nupu ụgbọ gị n’ogbummiri, wunye ụgbụ gị maka igbu azụ.”

Ma Saịmọn zara sị, “Nna anyị ukwu, anyị dọlịrị abalị niile n’enwetaghị ihe ọbụla, mana otu I siri kwu, aga m awụnye ụgbụ m niile.”

Mgbe ha mere nke a ha kụtara oke igwe azụ nke mere na ọ fọdụrụ ntakịrị ka ụgbụ ha dọkaa. Nke a mere ha ji kpọọ ndị ọkụazụ ibe ha nọ n’ụgbọmmiri nke ọzọ ka ha bịa nyere ha aka.

Ha bịara gbujuo ụgbọ abụọ ahụ azụ nke mere na ụgbọ ha malitere imikpu. Ma mgbe Saịmọn Pita hụrụ nke a, ọ dara n’ụkwụ Jesu na-ekwu sị, “Si n’ebe m nọ pụọ n’ihina abụ m onye njọ, O Dinwenụ m.”

N’ihina o juru Pita na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere. Otu a ka o mekwara Jemis na Jọn ụmụ Zebedi ndị ha na Saịmọn bụ ndị nnwekọ.

Jesu zara Saịmọn sị, “Ụjọ atụla gị, site ugbu a gaba, ị ga na-akụta mmadụ. Mgbe ha kwọpụtara ụgbọ ha n’elu ala, ha hapụrụ ihe niile sobe ya.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for September 7 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 12, 2022