Igbo Mass Readings for September 19 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 19 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15:1-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Ma ugbu a, ụmụnna m, achọrọ m ichetara ụnụ maka oziọma ahụ nke m ziri ụnụ na mbụ, nke ụnụ natakwara, nke okwukwe ụnụ na-akwụdosikwa ike na ya.

Ya bụ okwu nke oziọma ahụ, nke m kwusaara ụnụ, jisienụ ya ike. Ma ọ bụghị otu a, okwukwe ụnụ bụ ihe efu.

Ahanyere m n’aka ụnụ na mbụ ozi ahụ m natara idobe, ozi nke dị oke mkpa: na Kristi nwụrụ n’ihi mmehie anyị niile dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo; na e liri ya, ma Chineke mere ka o si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ, dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo; na O mere ka Sefas (ya bụ Pita) hụ ya anya: O mekwara ka ndịozi iri na abụọ ahụ hụ ya anya.

E mechaa, O mere ka ihe kariri narị mmadụ ise ndị ụmụnne anyị hụ ya anya n’otu mgbe. Ọtụtụ n’ime ha ka dị ndụ, mana ụfọdụ n’ime ha anwụọla.

E mechaa o bịakwutere Jemis, bịakwutekwa ndị ụmụazu niile. N’ikpeazụ dịka nwa a mụkworo amụkwo, O mekwara ka mụ onwe m hụ ya anya.

Mụ onwe m dịkarịchara nta n’etiti ụmụazụ, ekwesịghị m ka a kpọọ m nwaazụ, n’ihina esogburu m Nzukọ Chineke. Ma site n’amara nke Chineke, abụ m ihe m bụ.

Ọ pụtakwara ihe n’ọrụ m na amara ya nke O nyere m abụghị n’efu. Kama arụsiri m ọrụ ike karịchaa ụmụazụ ndịọzọ.

Ọ bụ ezie na ọ bụghị n’ike aka m kama site n’amara nke Chineke nyere m. Mọbụ m, mọbụ ndịọzọ, otu a ka anyị siri kwusaa, otu a ka ụnụ sikwara kwere.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 118:1-2, 16-17, 28

Azịza: Nyenụ Onyenweanyị ekele, n’ihina ọ dị mma.

1. Nye Onyenweanyị ekele n’ihina ọ dị mma

ịhụnaanya ya enweghị njedebe

ka ụmụ Izrel kwuo sị,

Ịhụnaanya ya enweghị njedebe. Azịza

2. Aka nri nke Onyenweanyị na-enwe mmeri

Aka nri nke Onyenweanyị ekulitele m

Mba, agaghị m anwụ, aga m adị ndụ,

ịgụpụta aka ọrụ niile nke Onyenweanyị. Azịza

3. Ị bụ Chineke m, ana m ekele gị,

ana m eto gị Chineke m.

Ana m ekele gị maka na ị nụrụ olu m,

ị bụkwa onye nzọpụta. Azịza

MBEKU – Jemis 1:21

Alleluia, Alleluia:

Werenụ nwayọọ nara okwu ahụ nke a kụrụla n’obi ụnụ dị ka mkpụrụ, nke pụrụ ịzọpụta mkpụrụobi ụnụ.

Alleluia

OZIỌMA – 7:36-50

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Otu onye Farisii kpọrọ Jesu oriri; O wee gaa n’ụlọ onye Farisii ahụ, nọdụ ala n’oche nri. Ma lee, otu nwaanyị nke bi n’obodo ahụ, bụ onye omenjọ; mgbe ọ matara na Jesu nọ n’oche nri n’ụlọ onye Farisii ahụ, o wetara otu ite e jiri nkume alabasta mee nke mmanụ otite juru n’ime ya.

Ka o guzoro n’ụkwụ Jesu na-ebe akwa, ọ na-ebesa anyammiri n’ụkwụ ya, werekwa ntụtụisi ya na-ehicha ha, sutụ ha ọnụ, werekwa mmanụ otite tee ha.

Ma mgbe onye Farisii ahụ kpọrọ Jesu oriri hụrụ nke a, o kwuru n’obi ya sị, “A sị na nwoke a bụ onyeamụma, Ọ gaara amata onye nwaanyị a na-akpatu ya aka bụ n’ihina ọ bụ onyenjọ.”

N’ịza nke a Jesu sịrị ya, “Saịmọn, o nwere ihe m ga-agwa gị.” Saịmọn azaa sị, “Onyenkuzi olee ihe ọ bụ?” “Otu onye na-ebinye ndị mmadụ ego nwere mmadụ abụọ ji ya ụgwọ.

Otu onye ji ya narị ego ise, onye ọzọ ji ya iri ego ise. Mgbe ha na-enweghị ike ịkwụli ụgwọ ha ji, nwoke ahụ gbagharala ha. N’ime mmadụ abụọ a olee nke ga-ahụ nwoke ahụ n’anya karịa?”

Saịmọn zara sị, “Eche m na ọ bụ onye ahụ ọ gbagharala nke ukwuu.” Jesu asị ya, “Ị zara nke ọma.” O wee tụgharịa n’ebe nwaanyị ahụ nọ bịa sị Saịmọn, “Ị hụla nwaanyị a?

Abatara m n’ụlọ gị ma I nyeghị m mmiri maka ụkwụ m ma nwaanyị a ejirila anyammiri ya saa ụkwụ m, ma werekwa ntụtụisi ya hichaa ha.

I sutụghị m ọnụ ọbụla, ma site na mgbe m batara n’ebe a, ọ kwụsịbeghị isutụ ụkwụ m ọnụ. I teghị m mmanụ n’isi, ma o werela mmanụ isiọma tee m n’ụkwụ.

Ya bụ, ana m agwa gị, a gbagharala ya ọtụtụ mmehie ya n’ihina o nwere ịhụnaanya dị ukwuu; ma onye ọbụla nwetara mgbaghara dị nta na-enwe ịhụnaanya dị nta.”

Jesu siri nwaanyị ahụ, “A gbagharala gị njọ gị niile. Mgbe ahụ ka ndị ya na ha nọ n’oche nri malitere ikwu n’etiti onwe ha sị, “onye bụ onye a nke na-agbaghara njọ?”

Ma Jesu sịrị nwaanyị ahụ, “Okwukwe gị azọọla gị; laa n’udo.”

Igbo Mass Readings for September 20 2024, Ncheta Andru Kim Taegọn, Pọl Chọng Hassang, na ndị Otu ha.

Igbo Mass Readings for September 19 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 12, 2022