Igbo Mass Readings for October 10 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 10 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:1-5
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Pọl dị Asọ degaara Galeshịa
Ewo! ụnụ ndị Galeshịa enweghị uche! Onye megharịrị ụnụ anya, ụnụ bụ ndị e mere ka ọnwụ Jesu Kristi n’elu obe bụrụ ihe were ụnụ anya?
Ka m jụọ ụnụ otu ihe: Ụnụ natara Mmụọ Nsọ site n’ịrụ ọrụ iwu chọọrọ ka ọ bụ site na nkuzi nke okwukwe?
Ụnụ dị oke nzuzu? Ụnụ malitere site n’ike nke Mmụọ Nsọ, ma ugbu a ụnụ na-akwusịzi n’ike nke anụahụ? Ụnụ tara ọtụtụ ahụhụ dị otu a n’efu?
Ọ bụrụ n’ezie na ọ bụ n’efu, ka m jụkwaa ụnụ ajụjụ ọzọ. Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere ụnụ, na ọrụ ebube ọ rụrụ n’etiti ụnụ, o mere ha n’ihi iwu ụnụ dobere ka ọ bụ n’ihina ụnụ nụrụ ma kwerekwa n’oziọma?
ABỤỌMA NA AZỊZA – Lk 1:69-70, 71-72, 73-75.
Azịza: Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel maka na ọ bịara leta ndị nke ya.
1. O welitere anyị Onyenzọpụta
site n’agbụrụ Devid nwodibo ya;
Otu o siri kwuo n’oge ochie
site n’ọnụ ndị amụma ya. Azịza.
2. Na a ga-azọpụta anyị site n’aka ndị iro anyị
na sitekwa n’aka ndị niile kpọrọ anyị asị,
Gosi ebere nke o kwere nnanna anyị ha na nkwa
bịa chetakwa ọgbụgbandụ ya dị nsọ. Azịza
3. Ọ ñụụrụ nnanna anyị bụ Abraham iyi,
Kwekwa nkwa na ya ga-azọpụta anyị n’aka ndị iro anyị
ka anyị nwee ike na-ekpere ya n’atụghị egwu ọbụla
N’ịdị nsọ na eziomume n’ihu ya
ụbọchị niile nke ndụ anyị. Azịza.
MBEKU – Ps. 19:9
Alleluịa, Alleluịa:
Okwu gị Onyenweanyị na-enye obi añụrị. Nkụzi gị bụ ihe e ji ahụ ụzọ
Alleluịa.
OZIỌMA – 11:5-13
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye n’ime ụnụ nwere enyi ga-agakwuru ya n’etiti abalị sị ya, ‘Enyi m, binye m ogbe achịcha atọ; n’ihina otu enyi m si n’ije pụta n’ụlọ m.
Enweghịkwa m ihe oriri ọbụla m ga-enye ya.’ Ma ọ ga-esi n’ime ụlọ zaghachi sị, ‘Esogbula m, anyị emechiela ụzọ ugbu a, mụ na ụmụaka m alabaala ụra, agaghị m enwe ike ikuli nye gị ihe ọbụla?’
Agwa m ụnụ, ọ bụ ezie na ọ gaghị ekuli nye ya ihe ọbụla n’ihina ọ bụ enyi ya, ma n’ihi nsogbu ya ọ ga-ekuli nye ya ihe ọbụla dị ya mkpa.
Ya mere agwa m ụnụ, rịọnụ, a ga-enye ụnụ, chọọnụ, ụnụ ga-achọta, kụọnụ aka, a ga-emeghere ụnụ.
N’ihina onye ọbụla na-arịọnụ na-arịọta, onye ọbụla na-achọnụ na-achọta, onye ọbụla na-akụ aka ka a ga-emeghere.
Kedụ nna n’etiti ụnụ nwa ya ga-arịọ azụ, o nye ya agwọ; mọbụ ọ rịọ ya akwa, o nye ya akpị?
Ọ bụrụ na ụnụ bụ ndị ọjọọ maara otu e si enye ụmụ ụnụ onyinye dị mma, nna ụnụ nke bi n’igwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya!”
Igbo Mass Readings for October 10 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for October 10 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.