Igbo Mass Readings for September 11 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 11 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:12-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Kolosi

Dịka ndị Chineke họrọla, ndị dị nsọ, na ndị ọ hụrụ n’anya, yikwasanụ obi ebere, obiọma, umeala, ịdị nwayọọ na ndidi dịka uwe. Na-anagiderenụ ibe ụnụ.

Ọ bụrụ na onye ọbụla nwere mkpesa megide ibe ya, gbagharanụ onwe ụnụ. Dịka Onyenweanyị si gbaghara ụnụ, ụnụ kwesịkwara ịgbaghara onwe ụnụ.

Ma nke kacha ihe ndị a niile, yikwasanụ ịhụnaanya, nke na-ejikọta ihe niile ọnụ n’ịdịkọ n’otu nke zuru oke. Kweenụ ka udo nke Kristi na-enye na-achị n’obi ụnụ, nke e si na ya kpọbata ụnụ n’otu ahụ.

Na-enyekwanụ ekele. Ka okwu nke Kristi biri n’ime ụnụ n’uju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirita ibe ụnụ ihe, ma na-adụrịtakwa ibe ụnụ ọdụ.

Werekwanụ abụọma na ukwe nke mmụọ kweere Chineke ukwe ekele n’obi ụnụ. N’ihe ọbụla ụnụ na-eme mọbụ okwu, mọbụ omume, meenụ ha niile n’aha nke Dinwenụ Jesu. Na-enyekwanụ Chukwu Nna ekele site na ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 150: 1-2, 3-4, 5-6

Azịza: Ka ihe niile dị ndụ too Onyenweanyị, Alleluia!

1. Toonụ Chineke n’ime ụlọnsọ ya dị n’ụwa.

Toonụ ya n’ime ụlọnsọ dị n’eluigwe

Toonụ ya maka ọrụ ebube ya niile

Toonụ ya maka ịdị ukwuu ya kacha elu. Azịza

2. Were ụda opiigwe too ya.

Werenụ une na ụbọ too ya

Werenụ itiegwu na ịgbaegwu too ya

Werenụ ọja na ụbọakwara too ya. Azịza

3. Werenụ ụjaigwe too ya

Werenụ ajaigwe nke na-ada oke ụda too ya

Ka ihe niile dị ndụ too Onyenweanyị

Ka ha nye Onyenweanyị otito. Alleluia! Azịza

MBEKU – Jọn 14:23

Alleluia, Alleluia:

Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya, ọ ga-edobe okwu m. Nna m ga-ahụ ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya biri n’ime ya.

Alleluia

OZIỌMA – 6: 27-38

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ma ana m agwa ụnụ ndị na-anụ okwu m, hụnụ ndịiro ụnụ n’anya, meerenụ ndị kpọrọ ụnụ asị iheọma.

Ma na-agọzinụ ndị na-abụ ụnụ ọnụ, kpeerenụ ndị na-akparị ụnụ ekpere. Ọ bụrụ na onye ọbụla amaa gị ụra n’otu ntị, tụgharịara ya ibe ntị gị nke ọzọ.

Ọzọkwa, ọ bụrụ na onye ọbụla azọrọ gị uwe I yi n’ime, hapụkwara ya uwe mwụda gị. Nye onye ọbụla na-arịọ ihe n’aka gị.

Ọ bụrụ na onye ọbụla ewere ihe gị ụfọdụ n’aka ike, ajụla maka ya ọzọ. Na-emesonụ ndị mmadụ omume otu ụnụ ga-achọ ka ha meso ụnụ.

Ọ bụrụ na ndị ụnụ na-ahụ n’anya bụ naanị ndị hụrụ ụnụ n’anya, olee oke ihe otito ụnụ nwere n’ime ya? N’ihina ọ bụladị ndị omenjọ nwere ịhụnaanya n’ebe ndị hụrụ ha n’anya nọ.

Ọ bụrụ na ụnụ emee iheọma nye naanị ndị meere ụnụ iheọma, olee oke ihe otito ụnụ nwere n’ime ya? N’ihina ọ bụladị ndị omenjọ na-eme otu ahụ.

Ọ bụrụ na ndị ụnụ na-ebinye ihe bụ naanị ndị ụnụ nwere olileanya na ụnụ ga-anata n’aka ha, olee oke ihe otito ụnụ nwere n’ime ya?

Ọ bụladị ndị omenjọ na ebinye ndị omenjọ ibe ha ihe, nwere olileanya na ha ga-anataghachi ihe ha binyere.

Kama, hụnụ ndịiro ụnụ n’anya, mekwanụ iheọma, binyekwanụ mmadụ ihe, na-achọghị ọmụrụnwa, ụgwọ ọrụ ụnụ ga-ebu ibu, ụnụ ga-abụ ụmụ nke onye kacha dị elu.

N’ihina O nwere obiọma n’ebe mmadụ niile nọ, ma ndị nwere obi ekele ma ndị na-achọ naanị nke onwe ha.

Nweenụ obi ebere dịka Nna ụnụ nke eluigwe si nwee obi ebere. Ụnụ ekpela mmadụ ibe ụnụ ikpe ka a ghara ikpe ụnụ ikpe.

Ụnụ amakwala mmadụ ibe ụnụ ikpe ka a ghara ịma ụnụ ikpe, nweenụ obi mgbaghara ka e wee gbaghara ụnụ.

Gbasapụnụ aka nye, Chineke ga-enyeghachikwa ụnụ. Ọ ga-ebunye ụnụ iheọma n’akpa buru ibu, nke ayọgharịrị ihe dị n’ime ya, sụjue ya n’ọnụ, nke iheọma jupụtara, na awụpụ.

Chineke ga-adọba iheọma n’apata ụkwụ ụnụ abụọ. N’ihina ụdị akpa ụnụ ji tụnyere ndịọzọ ka a ga-eji tụnyere ụnụ.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for September 11 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 12, 2022