Igbo Mass Readings for September 12 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 12 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:1-7, 11-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt
Ugbu a banyere ihe ụnụ jụrụ gbasara nri a chụnyeere arụsị: anyị ma nke ọma na “anyị niile nwere mmụta.” Mmụta na-afụli mmadụ elu, ebe ịhụnaanya na-azụlite mmadụ.
Ya bụ, onye ọbụla na-eche na ya maara ihe, amatabeghị dịka o kwesịrị ịma. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ Chineke n’anya, Chineke na-amata onye ahụ n’ụzọ dị iche.
Banyere okwu iri ihe a chụrụ n’aja nye arụsị, anyị maara nke ọma “na ọ dịghị arụsị ọbụla dị ndụ n’eziokwu.” Anyị makwa nke ọma “na ọ dịghị Chineke ọzọ dịnụ, ma ọ bụghị naanị otu.”
Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ụmụ arụsị dị n’eluigwe na n’elu ụwa, ndị ụmụ mmadụ na-akpọ chi. Ọtụtụ “ndị bụ chi” na ọtụtụ “ndị nwe mmadụ” dịkwa.
Ma n’ebe anyị nọ naanị otu Chineke dị, bụ nna, onye ihe niile sitere n’aka ya; onye anyị onwe anyị na-adịrị ndụ.
Otu Dinwenụ anyị bụ Jesu Kristi, dịkwa, onye ihe niile sitere n’aka ya, onye anyị sitekwara na ya adị ndụ. Otu ọ dị, ọ bụghị mmadụ niile nwere ụdị nghọta nke a.
Ụfọdụ ndị ihe gbasara arụsị maara ahụ na-eri nri ndị a dịka a chụụrụ ya arụsị n’eziokwu; ma ebe ọ bụ na akọnuuche ha adịghị ike, ha na-emerụkwa ya.
N’ụzọ dị otu a, nwanna gị na-adịghị ike, onye Kristi nwụrụ n’ihi ya ewee site n’ihe mmụta gị laa n’iyi. Mgbe ọbụla ụnụ na-emehie megide ụmụnna ụnụ, na-emerụ akọnuuche ha, ụnụ na-emehie megide Kristi.
N’ihi nke a, ọ bụrụ na ihe oriri ga-eme ka nwanna m dahie n’okwukwe ya, agaghị m eri anụ ọzọ, ka m ghara ime ka nwanna m dahie.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 139:1-3, 13-14, 23-24
Azịza: Onyenweanyị, dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe.
1. Onyenweanyị i nyochaala m marakwa m!
Ị ma mgbe m nọdụrụ ala na mgbe m kwụ ọtọ;
ị na-anọ ebe dị anya mara ihe m bu n’uche
Ị mazuru omume m niile, mgbe m na-arụ ọrụ mọbụ mgbe m na-ezu ike. Azịza
2. Ọ bụ gị kere mmụọ m
Ọ bụkwa gị kpụrụ m n’afọ nne m
Ana m ekele gị maka ihe omimi ndị a,
Maka ihe ịtụnaanya dị n’okike i kere m,
nakwa ihe ebube dị n’aka ọrụ gị niile; Azịza
3. Chineke nyochaa m ka ị mara obi m!
nyochaa m ka ị chọpụta echiche m na-eche!
Ekwekwala ka m soro ụzọ ọjọọ,
na-edu m n’ụzọ nke ndụ ebeebe. Azịza
MBEKU – Jọn 14:23
Alleluia, Alleluia:
Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya, ọ ga-edobe okwu m. Nna m ga-ahụ ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya biri n’ime ya.
Alleluia
OZIỌMA – 6: 27-38
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ma ana m agwa ụnụ ndị na-anụ okwu m, hụnụ ndịiro ụnụ n’anya, meerenụ ndị kpọrọ ụnụ asị iheọma.
Ma na-agọzinụ ndị na-abụ ụnụ ọnụ, kpeerenụ ndị na-akparị ụnụ ekpere. Ọ bụrụ na onye ọbụla amaa gị ụra n’otu ntị, tụgharịara ya ibe ntị gị nke ọzọ.
Ọzọkwa, ọ bụrụ na onye ọbụla azọrọ gị uwe I yi n’ime, hapụkwara ya uwe mwụda gị. Nye onye ọbụla na-arịọ ihe n’aka gị.
Ọ bụrụ na onye ọbụla ewere ihe gị ụfọdụ n’aka ike, ajụla maka ya ọzọ. Na-emesonụ ndị mmadụ omume otu ụnụ ga-achọ ka ha meso ụnụ.
Ọ bụrụ na ndị ụnụ na-ahụ n’anya bụ naanị ndị hụrụ ụnụ n’anya, olee oke ihe otito ụnụ nwere n’ime ya? N’ihina ọ bụladị ndị omenjọ nwere ịhụnaanya n’ebe ndị hụrụ ha n’anya nọ.
Ọ bụrụ na ụnụ emee iheọma nye naanị ndị meere ụnụ iheọma, olee oke ihe otito ụnụ nwere n’ime ya? N’ihina ọ bụladị ndị omenjọ na-eme otu ahụ.
Ọ bụrụ na ndị ụnụ na-ebinye ihe bụ naanị ndị ụnụ nwere olileanya na ụnụ ga-anata n’aka ha, olee oke ihe otito ụnụ nwere n’ime ya?
Ọ bụladị ndị omenjọ na ebinye ndị omenjọ ibe ha ihe, nwere olileanya na ha ga-anataghachi ihe ha binyere.
Kama, hụnụ ndịiro ụnụ n’anya, mekwanụ iheọma, binyekwanụ mmadụ ihe, na-achọghị ọmụrụnwa, ụgwọ ọrụ ụnụ ga-ebu ibu, ụnụ ga-abụ ụmụ nke onye kacha dị elu.
N’ihina O nwere obiọma n’ebe mmadụ niile nọ, ma ndị nwere obi ekele ma ndị na-achọ naanị nke onwe ha.
Nweenụ obi ebere dịka Nna ụnụ nke eluigwe si nwee obi ebere. Ụnụ ekpela mmadụ ibe ụnụ ikpe ka a ghara ikpe ụnụ ikpe.
Ụnụ amakwala mmadụ ibe ụnụ ikpe ka a ghara ịma ụnụ ikpe, nweenụ obi mgbaghara ka e wee gbaghara ụnụ.
Gbasapụnụ aka nye, Chineke ga-enyeghachikwa ụnụ. Ọ ga-ebunye ụnụ iheọma n’akpa buru ibu, nke ayọgharịrị ihe dị n’ime ya, sụjue ya n’ọnụ, nke iheọma jupụtara, na awụpụ.
Chineke ga-adọba iheọma n’apata ụkwụ ụnụ abụọ. N’ihina ụdị akpa ụnụ ji tụnyere ndịọzọ ka a ga-eji tụnyere ụnụ.
Igbo Mass Readings for September 13 2024, Ncheta Jon Chrysostom dị Asọ, Bishọp na Dọktọ
Igbo Mass Readings for September 12 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.