Igbo Mass Readings for September 25 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 25 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Haggaị
N’afọ abụọ nke onyeeze Darius, n’ụbọchị mbụ nke ọnwa isii, okwu nke Yahweh sitere n’ọnụ onye amụma Hagaị bịakwutere Zerubabel nwa nke Shialtiel onyeisi ọchịchị nke Juda, ya na Jọshụa nwa nke Jehozadak onyeisi ụkọchukwu.
Yahweh nke igwe ndịagha kwuru nke a: “Ndị a na-ekwu na oge erubeghị iji rụgharịa ụlọnsọ nke Yahweh. Mgbe ahụ okwu nke Yahweh sitere n’ọnụ onye amụma Hagaị kwuru sị, “Ugbu a ọ bụ oge ụnụ ga-ebiri n’ụlọ ụnụ rụzichara nke ọma ebe ụlọ nke Yahweh na-adakpọsị?”
Ya bụ ugbu a, Yahweh nke igwe ndịagha kwuru nke a: “Cheenụ nke ọma banyere agwa ụnụ. Ụnụ akụọla nke ukwuu mana ụnụ aghọọla ntakịrị, ụnụ na-eri mana ụnụ anaghị eriju afọ, ụnụ na-añụ ma ụnụ anaghị añụju, ụnụ na-ekpuchi akwa oyi, mana ụnụ anaghị enweta ekpomọkụ.
Onye na-arụ ọrụ na-anata ụgwọ ya, ma ọ na-etinye ya n’akpa puru epu.” Yahweh nke igwe ndịagha kwuru nke a: “Cheenụ nke ọma banyere agwa ụnụ. Gaanụ n’elu ugwu, butenụ osisi were rụgharịa ụlọ ahụ, aga m enwe ọñụ na nke a werekwa gosi ebube m n’ebe ahụ,” ọ bụ Yahweh na-ekwu.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 149: 1-2, 3-4, 5-6, 9
Azịza: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.
1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,
Ka ọgbakọ ndị kwere na ya kweere ya ukwe otito
Ka Izrel ñụrịa ọñụ n’ihi onye kere ya,
Ka ụmụ Zayọn ñụrịa n’ihi onye eze ha.
Azịza: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.
2. Ka ha were ịgba egwu too aha ya,
Ka ha were ịgba na ụbọakwara gbaara ya egwu
N’ihina Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ,
O kpubela ndị umeala okpu nke mmeri.
Azịza: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.
3. Ka ndị nke ya ñụrịa na mmeri ha.
Ka ha daa n’ala n’ihu Chineke na-eto ya oge niile
Ka nnukwu ukwe otito Chineke jupụta n’ọnụ ha,
nke a bụ otito nke ndị nke ya kwere ekwe. Alleluia.
Azịza: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.
MBEKU – Ọrụndiozi 16:14
Allleluịa, Alleluịa:
Dinwenụ meghee obi anyị, k’anyị gee ntị n’okwu nke nwa gị.
Alleluịa.
OZIỌMA – 9:7-9
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Mgbe Herọd onye na-achị Galili nụrụ akụkọ maka ihe niile Jesu na-eme, o wee gbagwojuo ya anya, n’ihina ụfọdụ mmadụ na-ekwu na e sila n’ọnwụ kulie Jọn onye na-eme mmirichukwu, ma ụfọdụ na-asị na Elaịja apụtakwala ọzọ, ndịọzọ wee sị na otu n’ime ndị amụma mgbe ochie ebiliela.
Herọd weee sị, “Jọn ka m mere ka e bepụ isi, ma onye bụ onye a, m na-anụ ihe ndị a banyere ya?” O wee na-achọ ụzọ ọ ga-esi hụ Jesu.
Igbo Mass Readings for September 26 2025, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for September 25 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.