Igbo Mass Readings for September 26 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 26 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:2-11
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ecclesiastes
Ihe efu ka ihe efu, onyenkuzi okwu Chineke na-ekwu ihe efu ka ihe efu, ihe niile bụ ihe efu. Kedụ uru mmadụ na-erite na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya n’okpuru anyanwụ?
Ndụdụgandụ gaa ndụdụgandụ ọzọ abịa, mana ụwa dị ebighịebi. Anwụ na-awa na-ada were ọsọ na-agaghachikwa ebe o si awalite.
Ikuku na-esi na ndịda kuru gaa na mgbago ugwu, okirikiri okirikiri ka ọ na-aga, si n’ụzọ o si bịa na-alaghachikwa.
Mmiri niile na-ehuba n’oke osimiri, ma oke osimiri anaghị eju eju. Ebe a mmiri ndị a na-ekwoga ebe ahụ ka ha na-ekwoga mgbe niile, osimiri anaghị eju eju.
Ihe niile jupụtara na ndọgbu na ndọkasị ahụ, ọnụ mmadụ apụghị ịkọ ya, afọ agaghị eju anya n’ịhụ ihe, nke ọ na-eju ntị n’ịnụ ihe.
Ihe dịbu mbụ bụ ihe ga-adị n’ọdịniihu, ihe e merela mbụ ka a ga-emekwa ọzọ, O nweghị ihe dị ọhụrụ n’okpuru anyanwụ.
O nwere ihe e nwere ike ịsị, “Lee, nke a bụ ịhe ọhụrụ?” Ọ dịbụrịị adị nag boo, ọ dịrịla tupu oge nke anyị. Anaghị echeta ihe ndị garala aga, nke agbụrụ na-abịanụ ga-echeta ihe ndị ga-eme n’ọdịniihu ma ha mechaa.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 90:3-4, 5-6, 12-13, 14, 17.
Azịza: Onyenweanyị bido ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ ị bụ ebe nchedo m.
1. Ị na-akpọghachi mmadụ na ntụ site n’igwa ya sị
Laghachinụ ebe ụnụ si ụnụ mmadụ.
N’anya gị puku afọ dịka otu ụbọchị
Dịka ụnyahụ nke gaferelanụ
mọbụ otu nche abalị. Azịza.
2. I zachapụla mmadụ site na nrọ
Ha dịka ahịhịa na epulite n’ụtụtụ
mịa ifuru ma kpọnwụọ n’oge mgbede. Azịza.
3. Kuziere anyị ịmata ka ndụ anyị siri dị nkenke
Ka anyị were si otu a bụrụ ndị maara ihe.
Onyenweanyị medoo obi gị, iwe gị ọ ga-adị ọkpụ?
Meere ụmụodibo gị ebere. Azịza.
4. Ka ịhụnanya gị jupụta n’ime anyị ụtụtụ ọbụla,
Ka anyị were nwee ike ikwe ukwe
Ma nweekwa añụrị ụbọchị niile nke ndụ anyị.
Mee ka ịdịụtọ gị nọnyere anyị Onyenweanyị
Iji were kwado ọrụ nke anyị rụrụ.
Ma meekwa ka anyị nwee ọganiihu n’ihe niile anyị na-eme. Azịza.
MBEKU – Ọrụ Ndiozi 16:14
Allleluịa, Alleluịa:
Dinwenụ meghee obi anyị, k’anyị gee ntị n’okwu nke nwa gị.
Alleluịa.
OZIỌMA – 9:7-9
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Mgbe Herọd onye na-achị Galili nụrụ akụkọ maka ihe niile Jesu na-eme, o wee gbagwojuo ya anya, n’ihina ụfọdụ mmadụ na-ekwu na e sila n’ọnwụ kulie Jọn onye na-eme mmirichukwu, ma ụfọdụ na-asị na Elaịja apụtakwala ọzọ, ndịọzọ wee sị na otu n’ime ndị amụma mgbe ochie ebiliela.
Herọd weee sị, “Jọn ka m mere ka e bepụ isi, ma onye bụ onye a, m na-anụ ihe ndị a banyere ya?” O wee na-achọ ụzọ ọ ga-esi hụ Jesu.
Igbo Mass Readings for September 27 2024, Ncheta Vincent de Paul dị Asọ, Ụkọchukwu
Igbo Mass Readings for September 26 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.