Igbo Mass Readings for October 5 2023, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 5 2023, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:1-4, 5-6, 7-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Nehemiah
Mgbe ọnwa nke asaa bịara, ndị mmadụ niile gbakọrọ dịka otu onye, n’ime ogige dị n’ihu ọnụụzọama Mmiri. Ha gwara Ezra onye odeakwụkwọ ka o bute akwụkwọ iwu Mosis bụ nke Yahweh nyere ụmụ Izrel.
Ezra onye ụkọchukwu butere akwụkwọ iwu n’ihu ọgbakọ ahụ nwere ndị nwoke, ndị nwaanyị na ndị niile nwere ike ịghọta ihe a na-akọ, n’ụbọchị mbụ nke ọnwa asaa.
O chere ogige ahụ dị n’ihu ọnụụzọama Mmiri ihu, wee gụpụta akwụkwọ iwu ahụ bido n’isi ụtụtụ ruo n’etiti ehihie, n’ihu mmadụ niile. Onye ọbụla n’ime ha gere ntị nke ọma n’ihe a na-agụpụta n’akwụkwọ nke iwu a.
Ebe Ezra nọ gụpụta okwu ndị a bụ na nkwago osisi a rụrụ maka ya. Ezra kwụụrụ n’ihu ndị mmadụ ahụ niile, meghee akwụkwọ ahụ, mgbe o meghere ya, mmadụ niile kwụụrụ ọtọ.
Ezra gọziri Yahweh Chineke kachasị elu, ndị mmadụ niile nọ ebe ahụ chịliri aka ha abụọ elu zaa sị, “Amen, Amen.” Ha kpọrọ isi ala fee Chineke. Ka ndị mmadụ niile na-egekwa ntị, Ezra gụpụtara ihe e dere n’akwụkwọ iwu nke Chineke, kọwaakwa ya nke ọma nke na ndị mmadụ ghọtachara ya.
Nehemaya onyeisi ọchịchị obodo, Ezra onye ụkọchukwu na onye odeakwụkwọ, ha na ndị Levaị (ndị na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe agụpụtara na akwụkwọ) kuziiri ndị mmadụ kwuo sị, “Ụbọchị taa dị nsọ nye Yahweh Chukwu ụnụ, ya bụ ụnụ erula ụjụ, ụnụ ebela akwa, n’ihina ndị mmadụ bere akwa mgbe ha nụrụ okwu niile nke iwu a.”
Ọ gwakwara ndị mmadụ sị, “Laanụ, gaa rie anụ mara abụba, ñụọ mmanya dị ụtọ, ma werenụ ụfọdụ nye ndị enweghị ka ọ ha ha. Ụbọchị taa dị nsọ nye Chineke anyị. Ụnụ erula ụjụ n’ihina añụrị nke Chineke bụ ike ụnụ.”
Ndị Levaị kasikwara ndị mmadụ obi sị, “Nọrọnụ jụụ n’ihina ụbọchị taa dị nsọ, ụnụ erula ụjụ.” Ndị mmadụ niile jiri obi añụrị laba imejupụta ihe a gwara ha site n’iri na ịñụ na inyekwa ndị enweghị ka ọ ha ha ihe, maka na ha ghọtara okwu ndị ahụ a kọwaara ha nke ọma.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 19: 8, 9, 10, 11
Azịza: Iwu nke Onyenwenyị na-enye mkpụrụobi añụrị
1. Iwu nke Onyenwenyị zuru oke,
Ọ na-enye mkpụrụobi ndụ ọhụrụ:
Atụmaatụ Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasịobi,
Ọ na-enye ndị dị umeala amamihe. Azịza
2. Iwu nke Onyenweanyị kwụ ọtọ
ọ na-enye obi añụrị;
Iwu nke onyenweanyị pụtara ihe
ọ bụ ihe e ji ahụ ụzọ. Azịza
3. Ịtụ egwu Onyenweanyị bụ ihe dị mma:
ọ na-adị ebeebe,
Ikpe nke Onyenweanyị bụ eziokwu;
Ha niile kwụkwa ọtọ. Azịza
4. Ọ dị mkpa karịa ọlaedo:
ọ bụladị ọlaedo kacha mma;
Okwu ya dị ụtọ karịa mmanụ añụ,
Ọ bụladị mmanụ añụ a zara aza. Azịza
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Chawapụtanụ dịka ihe n’ụwa ụnụ na-ebutere ya okwu nke ndụ.
Alleluia
OZIỌMA – 10: 1-12
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe nke a gachara, Dinwenụ họpụtara mmadụ iri asaa ọzọ, zipụ ha abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa n’obodo ọbụla na n’ebe ọbụla ya onwe ya gaje ịbịa.
O wee gwa ha sị, “Owuwe ihe ubi buru ibu, ma ndị ọrụ dị olemaole. Ya mere, rịọnụ Nna ukwu nke owuwe ihe ubi, ka o zite ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya. Gabanụ; lee ana m ezipụ ụnụ dịka ụmụatụrụ n’etiti agụowuru.
Ụnụ ewela akpaego, mọbụ akpa ọbụla, mọbụ akpụkpọụkwụ. Ụnụ ekelekwala onye ọbụla n’ụzọ. Ụlọ ọbụla ụnụ banyere, burunụ ụzọ sị, ‘Udo dịrị ụlọ a!’
Ọ bụrụ na nwa nke udo nọ ebe ahụ, udo ụnụ ga-adakwasa ya, ma ọ bụrụ na ọ nọghị, udo ụnụ ga-alọghachitara ụnụ. Nọdụnụ n’otu ụlọ ahụ na-erinụ na-añụkwanụ ihe ọbụla ha nyere ụnụ, n’ihina onye ọrụ kwesịrị ụgwọ ọrụ ya.
Ụnụ esikwala n’ụlọ fere n’ụlọ. Mgbe ụnụ banyeere n’ụlọ ọbụla ha nabata ụnụ, rienụ ihe ọbụla ha chere ụnụ n’ihu: Gwọọnụ ndị ọrịa nọ n’obodo ahụ, gwanụ ndị obodo ahụ sị, ‘Alaeze Chineke abịaruola ụnụ nso.’
Ma mgbe ụnụ banyere n’obodo ọbụla, ndị obodo ahụ anabataghị ụnụ, gaanụ n’okporo ụzọ ya kwuo sị, ‘Ọ bụladị aja si n’obodo ụnụ nke takụrụ n’ụkwụ anyị, anyị na-ehichapụ ya ka ọ bụrụ ihe akaebe megide ụnụ.
Otu ọ dị, maranụ nke a, na-alaeze Chineke abịaruola ụnụ nso.” Agwa m ụnụ, a ga-egosi Sodọm ebere n’ụbọchị ahụ karịa obodo ahụ.”
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.