Igbo Mass Readings for October 3 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 3 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 19:21-27

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Job

Meerenụ m ebere, meerenụ m ebere, O! ụnụ ndị enyi m, n’ihina aka nke Chineke emetụla m. Gịnị kpatara ụnụ ji achụ m dịka Chineke? Gịnị mere anụahụ m adịghịzi ụnụ mma?

A sị nnọọ na e deturu okwu m ọ ga-adị m mma! Ma a sị na e dere ya n’akwụkwọ! Ma a sị na e ji mkpịsị edide igwe, bie ya n’okwute ka ọ nọrọ ebeebe!

N’ihina amaara m na onye mgbapụta m dị ndụ, mana e mesịa ọ ga-eguzoro n’elu ụwa; ma mgbe e sichara otu a mebie akpụkpọahụ m, mgbe ahụ aga m eji ọnọdụ ahụ hụ Chineke, Onye m ga-ahụ n’akụkụ m, ọ bụ ya ka anya m ga-ahụ, ọ bụghị onyeọzọ. Obi m na-ada mba n’ime m!

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 27:7-8,8-9,13-14

Azịza: Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke Chineke n’ala ndị dị ndụ.

1. Onyenweanyị nụrụ mkpu akwa m!

Meere m ebere! Zaa m!

Mkpụrụobi m na-ekwu maka gị sị

Chọba ihu nke Onyenweanyị.

Onyenweanyị ana m achọ ihu gị. Azịza

2. Onyenweanyị ana m achọ ihu gị

Ezonarịla m ihu gị

Ejila iwe chụpụ nwodibo gị

Ọ bụ gị bụ onye enyemaka m, agbahapụla m. Azịza

3. Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke Chineke

n’ala ndị dị ndụ.

Chekwube na Dinwenụ.

Obi sie gị ike, tụkwasị ya obi, chekwube na ya. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Chawapụtanụ dịka ihe n’ụwa ụnụ na-ebutere ya okwu nke ndụ.

Alleluia

OZIỌMA – 10: 1-12

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Mgbe nke a gachara, Dinwenụ họpụtara mmadụ iri asaa ọzọ, zipụ ha abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa n’obodo ọbụla na n’ebe ọbụla ya onwe ya gaje ịbịa.

O wee gwa ha sị, “Owuwe ihe ubi buru ibu, ma ndị ọrụ dị olemaole. Ya mere, rịọnụ Nna ukwu nke owuwe ihe ubi, ka o zite ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya. Gabanụ; lee ana m ezipụ ụnụ dịka ụmụatụrụ n’etiti agụowuru.

Ụnụ ewela akpaego, mọbụ akpa ọbụla, mọbụ akpụkpọụkwụ. Ụnụ ekelekwala onye ọbụla n’ụzọ. Ụlọ ọbụla ụnụ banyere, burunụ ụzọ sị, ‘Udo dịrị ụlọ a!’

Ọ bụrụ na nwa nke udo nọ ebe ahụ, udo ụnụ ga-adakwasa ya, ma ọ bụrụ na ọ nọghị, udo ụnụ ga-alọghachitara ụnụ. Nọdụnụ n’otu ụlọ ahụ na-erinụ na-añụkwanụ ihe ọbụla ha nyere ụnụ, n’ihina onye ọrụ kwesịrị ụgwọ ọrụ ya.

Ụnụ esikwala n’ụlọ fere n’ụlọ. Mgbe ụnụ banyeere n’ụlọ ọbụla ha nabata ụnụ, rienụ ihe ọbụla ha chere ụnụ n’ihu: Gwọọnụ ndị ọrịa nọ n’obodo ahụ, gwanụ ndị obodo ahụ sị, ‘Alaeze Chineke abịaruola ụnụ nso.’

Ma mgbe ụnụ banyere n’obodo ọbụla, ndị obodo ahụ anabataghị ụnụ, gaanụ n’okporo ụzọ ya kwuo sị, ‘Ọ bụladị aja si n’obodo ụnụ nke takụrụ n’ụkwụ anyị, anyị na-ehichapụ ya ka ọ bụrụ ihe akaebe megide ụnụ.

Otu ọ dị, maranụ nke a, na-alaeze Chineke abịaruola ụnụ nso.” Agwa m ụnụ, a ga-egosi Sodọm ebere n’ụbọchị ahụ karịa obodo ahụ.”

Igbo Mass Readings for October 4 2024, Ncheta Francis nke Assisi dị Asọ

Igbo Mass Readings for October 3 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: October 15, 2022