Igbo Mass Readings for October 23 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 23 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:19-23

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom

Ana m ekwu dịka mmadụ, n’ihi adịghị ike nke anụahụ ụnụ. N’ihi nke a, otu ahụ ụnụ siri nyefee onwe ụnụ dịka ohu, n’aka adịghị ọcha na oke mmebi iwu maka ịrụ ọrụ ọjọọ, sinụ otu ahụ ugbu a nye ihe niile dị ụnụ n’ahụ n’ịrụ ọrụ eziomume, ka e wee doo ụnụ nsọ.

Mgbe ụnụ bụ ohu nke njọ, ụnụ amaghị ihe bụ eziomume. Uru gịnị ka ụnụ nwetara n’omume ndị ahụ ndị nke na-eme ụnụ ihere ugbu a ma na-edubakwa n’ọnwụ.

Ugbu a azọpụtarala ụnụ n’aka njọ, ụnl bụzi ohu Chineke. Ụgwọ ọrụ ụnụ ga-enweta bụ ịdị nsọ nke na-eweta ndụ ebeebe. Ụgwọ ọrụ nke njọ bụ ọnwụ, ma onyinye amara nke Chineke bụ ndụ ebeebe n’ime Dinwenụ anyị Jesu Kristi.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 1:1-2, 3, 4, 6

Azịza: Añụrị na-adịrị ndị chekwubere na Dinwenụ

1. Añụrị ga-adịrị nwoke ahụ

nke anaghị ezo ndụmọdụ onye ajọomume,

mọbụ na-akwụgharị n’ụzọ ndị omenjọ

mọbụ nọdụ n’otu ndị na-ekwutọ Chineke

Kama ọ na-enwe añụrị n’ebe iwu Onyenweanyị dị.

Azịza: Añụrị na-adịrị ndị chekwubere na Dinwenụ

2. Ọ dị ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,

nke na-amịpụta mkpụrụ ya n’oge ya,

nke akwụkwọ ya anaghị akpọnwụ akpọnwụ,

ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.

Azịza: Añụrị na-adịrị ndị chekwubere na Dinwenụ

3. Ọ dịghị otu a n’ebe ajọ mmadụ nọ;

Mba, n’ihina ha dịka afụrụ ọka nke ikuku na-ebugharị.

N’ihina Onyenweanyị na-echekwaba

ụzọ ndị eziomume

mana ụzọ ndị ajọ mmadụ na-eduba n’ịla n’iyi.

Azịza: Añụrị na-adịrị ndị chekwubere na Dinwenụ

MBEKU – Jọn 8:12

Alleluịa, Alleluịa

Abụ m ihe nke ụwa, Onyenweanyị na-ekwu, onye ọbụla na-eso m ga-enwe ihe nke ndụ.

Alleluịa.

OZIỌMA – 12:49-53

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Abịara m ịmụnye ọkụ n’elu ụwa, olee otu obi ga-adị m ma a sị na ọkụ ahụ enwurula ugbu a!

Enwere m mmirichukwu nke a ga-eme m: Ọ ga na-egbukwa m mgbu n’obi nke ukwuu ruo mgbe m mezuru ya.

Ụnụ chere na m bịara ịweta udo n’ụwa? Mba, agwa m ụnụ! kama abịara m iweta nkewa; n’ihina site ugbu a gaba, mmadụ ise bi n’otu ụlọ ga-ekewa, atọ, ga-emegide abụọ, abụọ ga-emegide atọ;

ha ga-ekewa, nna emegide nwa ya nwoke, nwa emegide nna ya, nne ga-emegide nwa ya nwaanyị, nwa ya nwaanyị emegide nne ya, nne dị emegide nwunye nwa ya, nwunye nwa ya emegide nne dị ya.

Igbo Mass Readings for October 24 2025, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for October 23 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.