Igbo Mass Readings for August 22 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 22 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 36:23-28

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel

Aga m edokwa aha ukwu m nsọ, bụ aha nke e metọchara n’etiti mba dị icheche ma bụrụkwa aha nke ụnụ metọsịrị n’etiti ha, mba ndị a niile ga-amara na m bụ Yahweh, Dinwenụ Chineke na-ekwu, mgbe m sitere n’aka ụnụ doghachi aha m nsọ n’ihu ha.

N’ihina aga m akpọpụta ụnụ n’etiti mba ndịọzọ, kpọkọta ụnụ ọnụ site n’obodo dị icheiche ma kpọbata ụnụ n’ala nke aka ụnụ.

Aga m awụkwasị ụnụ mmiri dị ọcha ka ụnụ wee dị ọcha site n’adịghị ọcha ụnụ niile na site n’ikpere arụsị ụnụ, a ga-awụchakwa ụnụ.

Aga m etinye n’ime ụnụ mkpụrụobi ọhụrụ, aga m etinyekwa n’ime ụnụ mmụọ ọhụrụ, ma wepụkwa n’ime ụnụ mkpụrụobi okwute ma nye ụnụ mkpụrụobi anụ ahụ.

Aga m etinye mmụọ m n’ime ụnụ ma mee ka ụnụ na-eso ụzọ m niile, meekwa ka ụnụ dobe iwu m niile. Ụnụ ga-ebi n’ala ahụ nke m nyere nna ụnụ ha, ụnụ ga-abụ ndị nke m, aga m abụ Chineke ụnụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 51:12-13, 14-15, 18-19

Azịza: Aga m awụkwasị ụnụ mmiri dị ọcha ma sachapụkwa njọ ụnụ niile.

1. Chineke kenye obi dị ọcha n’ime m

tinye n’ime m mmụọ ọhụrụ na nke siri ike,

Achụpụkwala m n’ihu gị,

anapụkwala m mmụọ nsọ gị. Azịza

2. Nyeghachikwa m añụrị nke nzọpụta gị,

were ezi mmụọ gị chedo m.

Aga m akụziri ndị ajọ mmadụ ụzọ gị,

Ka ndị njọ loọghachita azụ n’ebe ị nọ. Azịza

3. Ị naghị enwe mmasị ọbụla n’aja,

Aja nsureọkụ anaghị atọ gị ụtọ,

Aja a na-achụrụ Chineke bụ obi gbawara agbawa,

Ị naghị ajụ obi gbawara agbawa na nke loghara elogha. Azịza

MBEKU – 2 Thes 2:14

Alleluia, Alleluia:

Mụ na ndịeze na ndị ndụmọdụ nke ụwa, ndị na-arụgharịrị onwe ha ihe bibiri ebibi.

Alleluia

OZIỌMA – 22:1-14

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị mmadụ okwu n’ụkabụilu ọzọ sị, “A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere otu onyeeze nke kpọrọ oriri agbamakwụkwọ maka nwa ya nwoke.

O zipụrụ ụmụodibo ya ka ha gaa kpọọ ndị e ziri maka ya bụ oriri. Ma ha achọghị ịbịa. O zipụkwara ụmụodibo ya ndị ọzọ sị, “Gwanụ ndị niile a kpọrọ oriri, lee akwadochaala m ihe oriri.

E gbuola oke ehi na ụmụ ehi gbara abụba, ihe niile ezuole oke; bịazienụ maka oriri agbamakwụkwọ. Ndị ahụ a kpọrọ oriri gabara mkpa ha n’ihina ha akpọghị ya ihe ọ bụla.

Otu onye gabara n’ubi ya, nke ọzọ gaba ahịa, ebe ndịọzọ jidere ụmụodibo ya mee ha akaja, gbuokwa ha. Onyeeze ahụ were oke iwe, zipụ ndịagha ya.

Ha lara ndị ogbuọchụ ahụ niile n’iyi, gbakwaa obodo ha ọkụ. E mechaa ọ gwa ụmụodibo ya sị, “Akwadochaala m oriri agbamakwụkwọ, ma ndị a kpọrọ maka ya etosịghị etosị.

N’ihi nke a gazienụ n’agbata okporoụzọ niile. Kpọtanụ ndị niile ụnụ nwere ike ịhụ maka oriri agbamakwụkwọ a.”

Ụmụodibo ahụ wee gaa n’okporo ụzọ, kpọkọta ndị niile ha hụrụ ma ndị obi ọjọọ ma ndị ọma nke mere ka ụlọ ebe a na-eri oriri agbamakwụkwọ ahụ jupụta na ndị ọbịa.

Mgbe onyeeze ahụ batara ịhụ ndị ọbịa ahụ, ọ hụrụ otu nwoke nke eyighị uwe agbamakwụkwọ. Ọ jụrụ ya sị, “Enyi m olee otu I siri bata n’ebe a n’eyighị uwe agbamakwụkwọ?”

Okwughị okwu ọbụla. Onyeeze ahụ wee gwa ndị na-ejere ya ozi sị, “Keenụ ya agbụ, ụkwụ na aka, tụpụ ya n’ezi n’ime ọchịchiri, ebe ibe akwa na ịta ikiere eze ga-adị. N’ihina ọtụtụ ka a kpọrọ ma olemaole ka a họọrọ”.

Igbo Mass Readings for August 23 2024, Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for August 22 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume

Last Update: September 11, 2022