Igbo Mass Readings for November 16 2023, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 16 2023, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:22-8:1

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe

N’ihina e nwere mmụọ nke nghọta n’ime Amamihe nke nwekwara ịdị asọ, ịdị iche, nwekwa ụdị dị iche n’ime ya, ọ dị ire. Amamihe na-akpagharị na-enweghị mgbochi, ọ na-achawapụta nke ọma; o nweghị atụtụ ọbụla, o ji onwe ya aka.

E nweghị ike imeri ya, o nwere obiọma, dị nkọ. Ọ na-amasị ndị mmadụ, na-akwụdosịike, bịa kwesị ntụkwasịobi, na-enweghị nchekasị ọbụla. O nwere ike niile, na-ahụzu ihe niile, na-aba n’ime mmụọ niile nwere nghọta, na-enweghị atụtụ na agbanyeghị otu ihe ọ bụ siri dị.

N’ihina amamihe na-agafe ọsọọsọ karịa ihe niile na-agafe agafe, n’ihina o nweghị atụtụ, Ọ na-abanye n’ime ihe niile. Ọ bụ ume nke ike Chineke, otito na-enweghị atụ pụtara ihe nke onye pụrụ ime ihe niile, ya mere o nweghị ihe ọbụla ruru inyi nwere oke n’ime ya.

N’ihina ọ bụ onyinyo nke ihe dị ebighịebi, ugegbe na-enweghị atụtụ nke akaọrụ Chineke na onyinyo obi ọma ya. Ọ bụ ezie na ọ dị otu mana o nwere ike ime ihe niile.

Ọ naghị agbanwo agbanwo n’onwe ya ma ọ na-eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ. Na ndụdụgandụ ọbụla, ọ na-aba n’obi ndị niile dị asọ, were na-eme ha ndị enyi nke Chineke na ndị amụma.

N’ihina Chineke na-ahụ onye na ebi n’amamihe n’anya. Maka na ọ mara mma karịa anyanwụ, ọ na amụke amụke karịa igwe kpakpando. E were ya tụnyere ihe, amamihe karịrị ya.

N’ihina ihe gachaa ọchịchịrị esobe, ma ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike imeri amamihe. Ike ọchịchị ya na-esi n’otu akụkụ ụwa ruo n’akụkụ nke ọzọ, Ọ na-eme ka ihe niile kwụrụ nke ọma.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 119: 89, 90, 91, 130, 135, 175

Azịza: Onyenweanyị Okwu gị na-adịgide ebeebe.

1. Onyenweanyị, Okwu gị na-adịgide ebeebe

Ọ kwụ chịm ka eluigwe. Azịza

2. Ịkwụdosiike gị na-adịgide ruo ndụdụgandụ niile

I kere ụwa meekwa ka ọ kwụdosiike. Azịza

3. Iwu gị niile dị ịtụnaanya

Ya mere na ana m asọpụrụ ha. Azịza

4. Okwu gị na-enye ihe,

ọ na-enye ndị umeala nghọta. Azịza

5. Mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị,

ma kuziere m ime uche gị. Azịza

6. Nye m ndụ ka m wee nwee ike ito gị

kwe ka iwu gị gbaa m ume. Azịza

MBEKU – Ps. 145:13.

Alleluịa, Alleluịa:

Onyenweanyị dị ntụkwasịobi n’okwu ya niile, omume ya niile jupụtara n’obi ebere.

Alleluịa.

OZIỌMA – 17:20-25.

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Mgbe ndị Farisii jụrụ Jesu oge alaeze Chineke ga-abịa, Ọ zara ha sị: “Alaeze nke Chineke agaghị eji akara a ga-eji achọpụta ya abịa.

Ha agaghịkwa asị: ‘Lee ya ebe a! mọbụ Lee ya ebe ahụ!’  N’ihina ịgwa ụnụ eziokwu alaeze nke Chineke nọ n’etiti ụnụ.”

Jesu gwakwara ndị na-eso ụzọ ya sị, ‘Oga na-abịa mgbe ụnụ ga-achọ ịhụ otu n’ime ụbọchị nke nwa nke mmadụ ma ụnụ agaghị ahụ ya.

Ndị mmadụ ga-asị ụnụ, “Lee ya ebe ahụ!” Mọbụ, “Lee ya ebe a!” ụnụ agala, ụnụ esokwala ha.

N’ihi dịka otu amụma si egbu, ọkụ ya achakee site n’otu akụkụ nke urukpu ruo n’akụkụ nke ọzọ, otu a ka nwa nke mmadụ ga-adị n’ụbọchị nke ya.

Ma ọ ga-ebu ụzọ taa ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ga-ajụkwa ya.

Igbo Mass Readings for November 17 2023

Last Update: October 16, 2022