Igbo Mass Readings for November 6 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 6 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 14:7-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
O nweghị onye n’ime anyị na-adị ndụ maka onwe ya, o nweghịkwa onye n’ime anyị na-anwụ maka onwe ya. Anyị dị ndụ, anyị dịịrị Dinwenụ, anyị nwụọ ọnwụ, anyị nwụụrụ Dinwenụ.
Ya bụ, ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Dinwenụ. Ihe mere Kristi ji nwụọ dịkwa ndụ ọzọ bụ nke a: Ka O were bụrụ Dinwenụ nke ndị dị ndụ na nke ndị nwụrụ anwụ.
Gịnị mere i ji ekpe nwanne gị ikpe, gịnị mekwara i ji eleda nwanne gị anya? Otu ọ dị, anyị niile ga-akwụ n’ihu oche ikpe Chineke. N’ihina e dere n’Akwụkwọ Nsọ sị, “Dịka m na-adị ndụ, Dinwenụ na-ekwu, ikpere niile ga-esekpuru m, ire niile ga-etokwa Chineke.
Ya mere, onye ọbụla n’ime anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe ya n’ihu Chineke.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 27: 1, 4, 13-14
Azịza: Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke Chineke n’ala ndị dị ndụ.
1. Dinwenụ bụ ihe na nzọpụta m
onye ka m ga-atụ egwu?
Dinwenụ bụ ide nke ndụ m
Onye ga-eyi m egwu. Azịza
2. Otu ihe ka m na-arịọ Dinwenụ,
Otu ihe ka m na-achọ
Ka m biri n’ụlọ nke Dinwenụ
Ụbọchị niile nke ndụ m
Ka m nweta ịdị ụtọ nke Dinwenụ
Ka m na-ahụ ya n’ụlọ nsọ ya. Azịza
3. Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke Chineke,
n’ala ndị dị ndụ.
Chekwube na Dinwenụ. Obi sie gị ike;
tụkwasị ya obi, chekwube na ya. Azịza
MBEKU – Jọn 10:27
Alleluịa, Alleluịa:
Atụrụ m na-anụ olu m Dinwenụ na-ekwu, amarakwa m ha, ha na-esokwa m.
Alleluịa.
OZIỌMA – 15:1-10.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Mgbe ahụ, ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ bịakwutere Jesu ịnụrụ okwu ya. Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ tamuru na-asị, “Nwoke a na-anabata ndị omenjọ sorokwa ha na-eri ihe.”
Jesu wee jiri ụkabụilu a gwa ha okwu sị, “Olee onye n’ime ụnụ nwere otu narị atụrụ, otu n’ime ha efuo, ọ ghara ịhụpụ iri itoolu na itoolu ndịọzọ gaa ịchọ otu ahụ furu efu ruo mgbe ọ ga-achọta ya?
Ma mgbe ọ chọtara ya, ọ na-atụkwasa ya n’ubu ya na-añụrị. Mgbe ọ lọtara ụlọ, ọ na-akpọkọ ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ñụrịa n’ihina achọtala m atụrụ m furu efu.’
N’otu aka ahụ agwa m ụnụ, oke ọñụ ga-adị n’eluigwe n’isi otu onye njọ chegharịrịnụ karịa n’isi mmadụ iri itoolu na itoolu ndị nchegharị na-adịghị mkpa.
Olee otu nwaanyị ga-enwe kọbọ iri, otu efulahụ ya, na-agaghị amụnye ọkụ mpanaka, zachasịa ụlọ ya nke ọma na-achọ ya wee ruo mgbe ọ chọtara ya.
Mgbe ọ chọtara ya, ọ ga-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘soronụ m ñụrịa ọñụ n’ihina achọtala m otu kọbọ m ahụ furu efu.’
N’otu aka ahụ, ana m agwa ụnụ, ndị Mmụọọma nke Chineke na-añụrị ọñụ n’isi otu onye njọ nke chegharịrịnụ.”
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.