Igbo Mass Readings for October 30 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 30 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:31-39

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom

Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwusa! Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, onye ga-emegide anyị? Ọ bụrụ na Chineke ahapụghị otu Nwa ya, kama nyefee ya n’ọnwụ n’ihi anyị, ọ bụ na Ọ gaghị enye anyị ihe ndị nke na-akpa anyị?

Onye ga-ebo ndị Chineke họpụtara ebubo? Ọ bụrụ na Chineke atọpụla ha, onye pụrụ ịma ha ikpe? Ọ bụ Jesu Kristi? Mba! Ọ bụghị naanị na ọ nwụrụ n’ihi anyị ma O si n’ọnwụ bilie nọrọ n’aka nri Chineke na-arịọtara anyị arịrịọ.

Onye ga-ekewapụ anyị n’ịhụnaanya nke Kristi? Ọ bụ mkpagbu ka ọ bụ oke ntaramahụhụ? Ọ bụ nsogbu ka ọ bụ oke ụnwụ? Ọ bụ ịgba ọtọ ka ọ bụ ihe ize ndụ, ka ọ bụ ụjọ mmaagha?

Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo: “Anyị nọ n’ihe ize ndụ nke ọnwụ n’ihi gị ogologo ụbọchị niile, ndị mmadụ na-agụkwa anyị dịka atụrụ a ga-egbu egbu. Ee, kama n’ihe ndị a niile anyị kariri dike ọgụ site n’aka onye ahụ hụrụ anyị n’anya.

N’ihina o weela m anya na, ma ọnwụ mọbụ ndụ, mọbụ ndị mmụọọma mọbụ ụmụ mmụọ dị icheiche ndị na-achị n’elu na ụwa, mọbụ ike ọchịchị dị icheiche, mọbụ ihe dị ugbu a mọbụ ihe ga-abịa, mọbụ ihe dị elu, mọbụ ihe dị omimi, mọbụ ihe ọbụla ọzọ e kere eke apụghị ikewapụ anyị n’ịhụnaanya Chineke nke dị n’ime Jesu Kristi Onyenweanyị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 109:21-22, 26-27, 30-31

Azịza: Onyenweanyị, zọpụta m n’ihi ịhụnaanya gị.

1. Onyenweanyị chekwaba m n’ihi aha gị

zọpụta m ebe ịhụnaanya gị dị ukwuu!

Ebe m bụzi onye ogbenye na onye ike gwụrụ,

Obi m nọ na nnukwu ihe mgbu; Azịza

2. Nyere m aka Onyenweanyị Chineke m,

zọpụta m ebe ị hụrụ m n’anya;

ma mee ka ha mata na gịnwa mere ya,

na ọ bụ gị Onyenweanyị mere ya. Azịza

3. Aga m eji oke olu nye Onyenweanyị ekele

ma tookwa ya n’ọgbakọ

n’ihi ị haziri nchekwaba nke onye ogbenye ahụ

n’ebe ndị ahụ gaara ama ya ikpe ọnwụ nọ. Azịza

MBEKU – 2 Tim 1:10

Alleluịa, Alleluịa

Onye nzọpụta anyị Jesu Kristi emebiela ọnwụ, wetara anyị ndụ site n’oziọma ya.

Alleluịa.

OZIỌMA – 13:31-35

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

N’otu oge ahụ ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere Jesu sị ya, “Si n’ebe a pụọ n’ihina Herod na-achọ igbu gị.”

Ọ gwara ha, “Gaanụ gwa nkịta ọhịa ahụ, lee ana m achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, na-agwọkwa nrịanrịa dị icheiche taa na echi, ma ụbọchị nke atọ aga m arụzu ọrụ m.

Otu o si na-adi, aghaghị m ịga ebe m na-aga taa na echi na ụbọchị na-esota ya, n’ihina o kwesịghị ka e gbuo onye amụma ebe ọzọ na-abụghị na Jerusalem.”

O Jerusalem, Jerusalem ndị na-egbu ndị amụma, na-ejikwa okwute atụgbusi ndị Chineke ziteere ya! Ugboro ole ka m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị dịka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya abụọ ma ụnụ ekwegị!

Lee a na-ahapụ ụlọ ụnụ! ma agwa m ụnụ, ụnụ agaghị ahụ m anya ọzọ ruo mgbe ụnụ ga-asị, “Ngọzi na-adịrị onye bịara n’aha Dinwenụ.”

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for October 30 2025, Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: October 16, 2022