Igbo Mass Readings for June 26 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 26 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 16:1-12, 15-16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Seraị, nwunye Abram amụtabeghị nwa ọbụla, ma o nwere otu ohu nwaanyị bụ onye ljipt aha ya bụ Haga. Seraị gwara Abram sị ya, “Gee ntị ugbu a!
Ebe Yahweh dowere m na-amụtabeghị nwa, gakwuru ohu m nwaanyị. E leghị anya aga m esite na ya nweta ụmụ”. Abram nabatara okwu Seraị. Ya mere oge Abram birila n’ala Kenaan afọ iri, Seraị kpọọro Haga onye ljipt, ohu ya nwaanyị kpọnye Abram dịka nwunye ya.
Ọ bakwuru Haga, o wee tụrụ ime. Ma oge ọ hụrụ na ya atụrụla ime, nne ya ukwu enweghịkwa ihe ọbụla ọ bụ n’anya ya. Seraị wee gwa Abram sị, “Mkparị a e nyere m bịakwara gị!
Ọ bụ m bụ onye were nwa ohu m nwaanyị nye gị n’aka, ma ugbu a ọ hụla na ya atụrụla ime, o nweghịkwa ihe m bụ n’anya ya. Ka Yahweh bụrụ onye ikpe n’etiti mụ na gị”.
Abram gwara Seraị sị, “Ọ dị mma, nwa ohu gị nwaanyị nọ gị n’aka. Mee ya ihe I chere dị mma n’anya gị”. Ka o siri dị, Seraị kpasara ya nnukwu agwa ọjọọ nke mere o ji si n’ụlọ ya gbapụ.
Mmụọọma nke Yahweh hụrụ ya n’akụkụ otu isiiyi dị n’ime ịkpa isiiyi nke dị n’ụzọ gawara obodo nke Shọọ. Ọ jụrụ ya, “Haga, ohu nwaanyị Seraị, olee ebe i siri bịa, olee ebe ị na-eje?”
Ọ zara ya sị: “Ana magba ọsọ site n’ebe nne m ukwu Seraị nọ”. Mmụọọma nke Yahweh gwakwara ya sị, “Laghachi azụ n’ebe nne gị ukwu nọ ma rubere ya isi”.
Mmụọọma nke Yahweh gwakwara ya sị, “Aga m eme ka ụmụ ụmụ gị dị ụbara nke na a gaghị agụta ha ọnụ. N’oge ahụ mmụọọma nke Yahweh gwara ya sị! “Ugbu a, ị dị ime, ị ga-amụ nwanwoke, ị ga-akpọ ya Ishmel, n’ihina Yahweh anụla mkpu akwa gị na nsogbu gị.
Ọ ga abụ nwoke ga-adị ka ịnyịnya ibu ọhịa, ọ ga-eji aka ya megide onye ọbụla, aka onye ọbụla ga-emegidekwa ya. Ọ ga-ebi ndụ ya na agbanyeghị ihe ndị agbataobi ya ga-ekwu”.
Haga wee mụọrọ Abram nwa nwoke, Abram gụrụ nwa ya nwoke nke Haga mụtara Ishmel. Abram dị iri afọ asatọ na isii mgbe Haga mụụrụ ya Ishmel.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 106:1-2, 3-4, 4-5
Azịza: Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihina ọ dị mma.
1. Alleluia, nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihina ọ dị mma,
ịhụnaanya ya enweghị njedebe.
Onye ga-enwe ike ịgụta ọrụ ebube niile Onyenweanyị rụrụ ọnụ?
Onye ga-enwe ike inye ya otito zuru ezu? Azịza
2. Ngọzi dịrị ndị na-akwụba aka ọtọ,
ndị na-eme mma oge niile.
Cheta m O Osebụrụwa!
N’ihi ịhụnaanya i nwere n’ebe ndị nke gị nọ. Azịza
3. Bịakwute m dịka onye nzọpụta.
Ka m soro keta oke n’añụrị nke ndị ị họtara,
sorokwa na ọñụ nke mba ị họọrọ,
ka m wee nwee afọ ojuju n’ịbụ otu onye na ndị ga-eri ekpe gị. Azịza.
MBEKU – 1 Pita 1:25
Alleluia, Alleluịa:
Okwu nke Onyenweanyị ga-adịgịde ruo mgbe ebighịebi”. Okwu a bụkwa oziọma ahụ nke a gbasaara ụnụ.
Alleluịa.
OZIỌMA – 7:21-29
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụghị onye nke na-akpọ m ‘Dinwenụ, Dinwenụ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche nke Nna m bi n’igwe.
N’ụbọchị ahụ, ọtụtụ ga-asị m, “Onyenweanyị, Onyenweanyị, Ọ bụ na anyị ebughị amụma n’aha gị, chụpụ ajọ mmụọ n’aha gị, ma rụkwa ọtụtụ ọrụ ebube n’aha gị?’
Mgbe ahụ, aga m agwa ha sị, ‘Amaghị m ndị ụnụ bụ, sinụ ebe m nọ pụọ, ụnụ ndị ajọ mmadụ’ “Onye ọbụla nke na-anụ okwu m ndị a, na-emekwa ha, dịka nwoke maara ihe, nke rụrụ ụlọ ya n’elu okwute; mmiri wee zoo, ide mmiri tojuo, ifufe bukwara ya ma ọ daghị n’ihina a tọrọ ntọala ya n’elu okwute.
Onye ọbụla nke na-anụ okwu ndị a, ma ọ naghị eme ha, dịka onye nzuzu nke rụrụ ụlọ ya n’elu aja; mmiri zoro, ide mmiri tojuo, ifufe bukwara ya, o wee daa.
Ọdịda nke ụlọ ahụ buru ibu nke ukwuu”. Mgbe Jesu kuzichara ihe ndị a, nkuzi ya tụrụ igwe mmadụ ahụ n’anya, n’ihina ọ naghị akụziri ha dịka ndị odeakwụkwọ ha, kama dịka onye nwezuru ike niile.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.