Igbo Mass Readings for June 27 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 27 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 24:8-17
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke Abụọ nke Ndịeze
Jehoyakịn gbara afọ iri na asatọ oge o bidoro bụrụ eze, ma ọ chịrị na Jerusalem ọnwa atọ. Aha nne ya bụ Nehushta ada Elnatan, nke si Jerusalem. O mere ihe ọjọọ n’ihu nke Yahweh dịka nna ya.
N’oge ahụ, ndịagha Nebukadneza, eze Babịlọn bịara gbaa obodo ahụ gburugburu, ka ha buso ha agha. Ma Nebukadneza n’onwe ya banyere n’obodo ahụ oge ndịagha ya na-agba ya gburugburu.
Jehoyakịn eze Juda nyefere onwe ya, nne ya, ụmụodibo ya, ụmụ ya, na ndịisi ọrụ ya n’aka eze Babịlọn. Nebukadneza tinyere Jehoyakịn n’ụlọ mkpọrọ n’ime afọ asatọ nke ọchịchị ya.
Dịka Osebụrụwa si kwuo, Nebukadneza bukọọrọ akụ niile dị n’ụlọ Yahweh nke dị n’ụlọ onyeeze, nke Solomọn eze Izrel mere maka ụlọ Yahweh.
Nebukadneza chịkọọrọ Jerusalem, ụmụ eze niile, ndịagha, na ndị ọrụ niile na ndịagha ma ndị ọrụ nwere agba ọnụ ọgụ ha pụtara puku iri. Ọ chịkọkwaara ndị ọrụ aka na ndị ọrụ ọkpụụzụ nọ n’obodo ahụ.
O nweghị ndị fọdụrụ n’obodo belụsọ ndị ogbenye ọnụ ntụ. Nebukadeza wee kpọrọ Jehoyakịn kpọchie na Babịlọn.
O bukwaara nne eze, ndị nwunye ya, ndị ọrụ ya na ndị na-achị obodo wee si Jerusalem gaa Babịlọn. Eze Babịlọn bulatakwara na Babịlọn ndịagh ahụ niile dị puku asaa, ndị mmụọ ha siri ike maka agha, ya na otu puku bụ ndị ọrụ aka na ndị ọkpụ ụzụ.
Nebukadneza mere Matanaya, nwanne nna Jehoyakịn eze n’ọnọdụ ya, gụgharịa ya Zedekaya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 79:1-2, 3-5, 8, 9.
Azịza: Maka otito nke aha gị, Onyenweanyị, zọpụta anyị
1. Chineke, ndị amaghị gị abala ndị nke gị ọgụ
Ha emerụọla ụlọ gị dị nsọ;
ha etikpọọla Jerusalem,
ha ewerela ozu ụmụodibo gị
nye ụmụ nnụnụ ka ọ bụrụ nri ha,
ahụ ndị nke gị dị nsọ ka e nyere ụmụanụọhịa. Azịza
2. Ha kwafuru ọbara ha dịka mmiri na Jerusalem niile
Enwezighị ọbụladị otu onye ga-eli ozu ha.
Anyị abụrụla ihe ndị agbataobi anyị ji akpa ọchị,
mba niile gbara anyị gburugburu na-akparịzi anyị
Kedụ mgbe iwe gị ga-akwụsị O Onyenweanyị?
lwe gị dị ọkụ ọ ga-adị ebeebe? Azịza
3. Atala anyị ahụhụ maka njọ nnanna anyị ha mere;
Kama ka obiọma gị bịakwute anyị ọsọọsọ
n’ihina ha ewotuola anyị ala nke ukwuu. Azịza
4. Nyere anyị aka, O Chineke onye nzọpụta anyị
maka otito nke aha gị
zọpụta anyị ma gbagharakwa anyị njọ anyị, n’ihi aha gị! Azịza
MBEKU – 1 Pita 1:25
Alleluia, Alleluịa:
Okwu nke Onyenweanyị ga-adịgịde ruo mgbe ebighịebi”. Okwu a bụkwa oziọma ahụ nke a gbasaara ụnụ.
Alleluịa.
OZIỌMA – 7:21-29
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụghị onye nke na-akpọ m ‘Dinwenụ, Dinwenụ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche nke Nna m bi n’igwe.
N’ụbọchị ahụ, ọtụtụ ga-asị m, “Onyenweanyị, Onyenweanyị, Ọ bụ na anyị ebughị amụma n’aha gị, chụpụ ajọ mmụọ n’aha gị, ma rụkwa ọtụtụ ọrụ ebube n’aha gị?’
Mgbe ahụ, aga m agwa ha sị, ‘Amaghị m ndị ụnụ bụ, sinụ ebe m nọ pụọ, ụnụ ndị ajọ mmadụ’ “Onye ọbụla nke na-anụ okwu m ndị a, na-emekwa ha, dịka nwoke maara ihe, nke rụrụ ụlọ ya n’elu okwute; mmiri wee zoo, ide mmiri tojuo, ifufe bukwara ya ma ọ daghị n’ihina a tọrọ ntọala ya n’elu okwute.
Onye ọbụla nke na-anụ okwu ndị a, ma ọ naghị eme ha, dịka onye nzuzu nke rụrụ ụlọ ya n’elu aja; mmiri zoro, ide mmiri tojuo, ifufe bukwara ya, o wee daa.
Ọdịda nke ụlọ ahụ buru ibu nke ukwuu”. Mgbe Jesu kuzichara ihe ndị a, nkuzi ya tụrụ igwe mmadụ ahụ n’anya, n’ihina ọ naghị akụziri ha dịka ndị odeakwụkwọ ha, kama dịka onye nwezuru ike niile.
Igbo Mass Readings for June 28 2024, Fraịzde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for June 27 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.