Igbo Mass Readings for July 13 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 13 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 44:18-21, 23-29; 45:1-5
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
N’atụfughị oge, Juda kpụdebere Josef rịọ ya sị, “Biko onyenwe m, ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị, ka gị na nwodibo gị gbakọrịta izu. E wesokwana nwodibo gị iwe n’ihina ị dika Fero n’onwe ya.
Gị bụ nna m ukwu jụrụ ụmụodibo gị sị, ‘Ụnụ nwere nna mọbụ nwanne nwoke? Anyị wee zaghachi gị na anyị nwere nna merela agadi, na otu obere nwa nwoke ọ mụtara n’agadi.
E mechaa, ị gwakwara ụmụodibo gị ka ha kpọtara gị ya ka ị hụ ya anya. Mana ị gwara ụmụodibo gị sị, “Ọ bụrụ na nwanne ụnụ nke nta esoghị ụnụ bịa, a gaghị anabata ụnụ n’ihu m ọzọ.
Mgbe anyị laghachikwuuru nna anyị bụ nwodibo gị, anyị gwara ya ihe nnamukwu kwuru.” Mgbe nna anyị gwara anyị bịa zụta obere nri ọzọ, anyị zara ya na anyị agaghị eje.
Naanị ihe ga-eme ka anyị jee ya bụ ma nwanne anyị nke nta so anyị gaa, ọ bụghị otu ahụ, a gaghị anabatakwa anyị n’ihu gị ọzọ.
Nna anyị nwaodibo gị wee gwa anyị sị, ụnụ matara na nwunye m mụtaara m naanị ụmụ abụọ. Mgbe otu n’ime ha hapụrụ m, eweere m ya na ọ ghaghị ịbụ na anụọhịa adọgbuola ya’ Anya m ahụbeghị ya ọzọ.
Ọ bụrụ na ụnụ kpọrọkwuo nke a, o nwee ajọ ihe bịakwasara ya, ụnụ ga-eme ka m jiri mwute laa mmụọ n’isi awọ m’.
Mgbe ahụ Josef enwekwaghị ike ijideli onwe ya n’ebe ndị guzo n’akụkụ ya nọ, nke mere ka o nye iwu ka onye ọbụla si n’ebe ahụ pụọ. N’ihi ya o nweghị onye nọdebere ya nso mgbe o gosiri ụmụnne ya onwe ya.
O besiri akwa ike nke na o ruru ndị ljipt niile ntị; akụkọ ya rutekwara n’obi Fero. Josef gwara ụmụnne ya sị, “Abụ m Josef. Nna m ọ ka dị ndụ?”
Mana ụmụnne ya enweghị ike ịza ya ajụjụ a n’ihi oke egwu jidere ha n’ihu ya. N’ihi ya Josef gwara ụmụnne ya ka ha kpụdebe ya nso.
Mgbe ha bịara ya nso ọ sịrị ha, “Abụ m nwanne ụnụ nwoke Josef, onye ụnụ refuru n’ljipt. Ma ugbu a ụnụ enwela mwute n’obi, ụnụ atakwala onwe ụnụ ụta maka orire ụnụ rere m, n’ihina ọ bụ Chineke zitere m ebe a ka m wee chekwaa ndụ ụnụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 105:16-17, 18-19, 20-21.
Azịza: Chetanụ ọrụ ebube niile Onyenweanyị rụrụ.
1. Mgbe o mere ka ụganị daa n’ala ha,
mee ka nri ha niile gwụ,
o zipụrụ otu nwoke tupu ha eruo,
Josef, onye nke e rere dịka ohu. Azịza
2. Ha ji agbụ merụsịa ukwu ya ahụ,
ha were igwe nyanye ya n’olu;
Mgbe oge ruru, amụma Josef mere ka o siri kwuo,
okwu nke Onyenweanyị gbaara ya akaebe. Azịza
3. Eze wee nye iwu ka a tọhapụ ya.
Onye nke na-achị mba niile wee zọpụta ya,
o mere ya ọ bụrụ onyeisi ezinụụlọ ya,
onye na-elekọta akụnụụba ya anya. Azịza.
MBEKU – Luk 8:15
Alleluia, Alleluịa:
Añụrị ga-adịrị ndị nụrụ okwu Chineke, were ikwesi ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike, werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
Alleluịa.
OZIỌMA – 10:7-15
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, Ka ụnụ na-aga, na-ekwunụ sị, ‘Alaeze eluigwe adịla nso. Gwọọnụ ndị ọrịa kpọlitenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ndị ekpenta ka ha dị ọcha, chụpụkwanụ ajọ mmụọ.
Ụnụ natara n’efu, nyekwanụ n’efu. Ụnụ etinyela ọlaedo, mọbụ ọlaọcha, mọbụ ego ọbụla n’akpa ụnụ. Ụnụ ejila akpa ọbụla maka njem ụnụ, mọbụ uwe abụọ, mọbụ akpụkpọụkwụ, mọbụ mkpọ; n’ihina onye ọrụ tosịrị ụgwọ ọrụ ya.
Mgbe ụnụ banyere obodo mọbụ ogbe ọbụla, chọpụtanụ ezi mmadụ bi na ya, nọrọnụ n’ụlọ ya ruo mgbe ụnụ ga-ahapụ ebe ahụ. Mgbe ụnụ na aba n’ụlọ ọbụla, keleenụ ndị bi na ya sị, ‘Udo dịrị ụnụ’
Ọ bụrụ na ndị bi n’ụlọ ahụ tosịrị etosị, ka udo ụnụ dịịrị ha, ma ọ bụrụ na ha etosịghị etosị, ka udo ụnụ laghachiri ụnụ.
Ọzọkwa, ọ bụrụ na ezinụụlọ ọbụla jụrụ ịnabata ụnụ mọbụ gee ntị n’okwu ụnụ, tichapụnụ aja dị n’ọbụụkwụ ụnụ mgbe ụnụ na-ahapụ ụlọ ahụ mọbụ obodo ahụ.
N’ezie agwa m ụnụ, Chineke ga-emere ndị bi na Sodọm na Gomora ebere n’ụbọchị ikpe karịa ndị obodo ahụ.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.