Igbo Mass Readings for July 11 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 11 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:1, 3-4, 8-9
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Hosea
Mgbe Izrel bụ nwata ahụrụ m ya n’anya, esikwa m n’ljipt kpọpụta nwa m. Ma, ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije; ekuuru m ha n’aka m, ma ha amaghị na ọ bụ m gwọrọ ha, na-elekọta ha anya.
Ejiri m ịhụnaanya wee duo ha. Ebupụrụ m ha ibu arọ ha bu, hulata ala nye ha nri n’ọnụ. Kedụ ka m ga-esi hapụ gị O Ifrem? Kedụ ka m ga-esi gbahapụ gị O Izrel?
Kedụ ka m ga-esi mee gị ka Adam; mọbụ kpaso gị agwa ka Zaboim? Obi agaghị ekwe m ime ya n’ihina ebere na ịhụnaanya m siri ike n’ebe ị nọ.
Agaghị m ata ụnụ ahụhụ n’oke iwe m agaghịkwa m emebi Izrel ọzọ. N’ihina abụ m Chineke, abụghị m mmadụ, onye dị nsọ nọ n’etiti ụnụ, agaghị m abịa imebi gị ọzọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 80:2, 3, 15-16
Azịza: Onyenweanyị mee ka ihu gị chakwasa anyị, ka anyị wee nweta nzọpụta.
1. Gee ntị onye nche nke Izrel,
gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ!
Gị onye nọ n’ebe kachasị ihe niile elu,
chawapụta ihe gị. Azịza
2. Chineke nke igwe ndịagha,
Si n’eluigwe ledata anya ka ị hụ osisi vaịn a
Bịa Chekwaba mkpụrụ vaịn a i ji aka gị kụọ
Ka aka gị chekwaba nwoke ahụ ị họọrọ,
onye ahụ i nyere ike. Azịza
MBEKU – Luk 8:15
Alleluia, Alleluịa:
Añụrị ga-adịrị ndị nụrụ okwu Chineke, were ikwesi ntụkwasịobi na obi dị mma jidesie ya ike, werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
Alleluịa.
OZIỌMA – 10:7-15
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, Ka ụnụ na-aga, na-ekwunụ sị, ‘Alaeze eluigwe adịla nso. Gwọọnụ ndị ọrịa kpọlitenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ndị ekpenta ka ha dị ọcha, chụpụkwanụ ajọ mmụọ.
Ụnụ natara n’efu, nyekwanụ n’efu. Ụnụ etinyela ọlaedo, mọbụ ọlaọcha, mọbụ ego ọbụla n’akpa ụnụ. Ụnụ ejila akpa ọbụla maka njem ụnụ, mọbụ uwe abụọ, mọbụ akpụkpọụkwụ, mọbụ mkpọ; n’ihina onye ọrụ tosịrị ụgwọ ọrụ ya.
Mgbe ụnụ banyere obodo mọbụ ogbe ọbụla, chọpụtanụ ezi mmadụ bi na ya, nọrọnụ n’ụlọ ya ruo mgbe ụnụ ga-ahapụ ebe ahụ. Mgbe ụnụ na aba n’ụlọ ọbụla, keleenụ ndị bi na ya sị, ‘Udo dịrị ụnụ’
Ọ bụrụ na ndị bi n’ụlọ ahụ tosịrị etosị, ka udo ụnụ dịịrị ha, ma ọ bụrụ na ha etosịghị etosị, ka udo ụnụ laghachiri ụnụ.
Ọzọkwa, ọ bụrụ na ezinụụlọ ọbụla jụrụ ịnabata ụnụ mọbụ gee ntị n’okwu ụnụ, tichapụnụ aja dị n’ọbụụkwụ ụnụ mgbe ụnụ na-ahapụ ụlọ ahụ mọbụ obodo ahụ.
N’ezie agwa m ụnụ, Chineke ga-emere ndị bi na Sodọm na Gomora ebere n’ụbọchị ikpe karịa ndị obodo ahụ.
Igbo Mass Readings for July 12 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for July 11 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.