Igbo Mass Readings for August 7 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 7 2025, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 20:1-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọnụọgụgụ
N’ọnwa nke mbụ, ọgbakọ Izrel niile rutere n’ọzara Zin. Ha maara ụlọikwu ha na Kadesh. Ebe ahụ ka Miriam nwụrụ. Ebe aụu ka e likwara ya. Ma n’ebe ahụ, ọgbakọ Izrel ahụghị mmiri ha ga-añụ.
Ya mere ha niile wee zukọọ megide Mosis na Erọn. Ha tamukwara ntamu sị, “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị sooro ụmụnne anyị nwụchaa n’ihu Yahweh.
Gịnị mere I ji kpọpụta anyị n’ịkpa ebe a ka anyị na ụmụ anụmaanụ anyị nwụfuo? Gịnị mere I ji si n’ljipt kpọpụta anyị n’ala nke a kpọrọ nkụ na-adịghị agba ahịhịa?
Ọka adịghị ya, osisi fiig adịghị ya, osiso vaịn adịghị nke mkpụrụ osisi Pomegranet na-adị ya. Nke kacha njọ, e nweghị mmiri ọñụñụ e ji akpọtu akpịrị!”
Mosis na Erọn wee si n’ihu ọgbakọ ahụ pụọ, jee guzo n’ọnụụzọ ụlọikwu nsọ ahụ. Ha hulatara kpudo ihu ha n’ala. Ebube Yahweh wee chawapụta ka ọkụ n’ihu ha.
Yahweh agwa Mosis sị, “were mkpara ahụ nke dị n’ihu igbe ọgbụgbandụ. Gị na Erọn mekwaa ka ọgbakọ lzrel niile zukọta. N’ebe ahụ n’ihu ha, ị ga-enye nkume ahụ iwu ka ọ gbapụta mmiri.
Ị ga-esikwa n’ụzọ dị otu a mee ka mmiri si na nkume gbapụtara ndị Izrel, ka ha na anụmaamụ ha niile ñụọ.” Mosis wee banye were mkpara ahụ dịka Yahweh nyere ya n’iwu.
Mosis na Erọn kpokọtara ọgbakọ ahụ niile n’ebe nkume ahụ dị. Mosis wee sị ha, “Geenụ ntị, ụnụ ndị nnupụisi! Anyị ga-esi na nkume a wepụtara ụnụ mmiri!”
Mosis welie mkpara ya elu kụọ na nkume ahụ ugboro abụọ, mmiri wee nupụta. Ndị Izrel niile na anụmaanụ ha ñụjukwara afọ.
Ma Yahweh baara Mosis na Erọn mba sị, “Gịnị mere ụnụ egosịghị na ụnụ nwere okwukwe siri ike na m, wee si na nke a bulie aha nsọ m elu n’ihu ụmụ Izrel?
N’ihi nke a ụnụ agaghị eduba ọgbakọ nke a n’ala ahụ m kwere ha na nkwa.” Ihe ndị a mere na mmiri Meriba. N’ebe ahụ, ndị Izrel tamuru ntamu megide Yahweh, o gosị ha ịdị nsọ ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 95: 1-2, 6-7, 8-9
Azịza: Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ
1. Bịanụ, ka anyị kweere Onyenweanyị ukwe ọñụ
ka anyị tisie mkpu ike tijere nkume nke nzọpụta anyị
Ka anyị bịa n’ihu ya nye ya ekele
were egwu na ukwe tobe ya. Azịza
2. Bịanụ, ka anyị fee Onyenweanyị kpọọrọ ya isi ala,
ka anyị sekpuo n’ihu Onyenweanyị onye kere anyị.
N’ihina ọ bụ Chineke anyị
anyi bụkwa ndị nke ya
igwe atụrụ ọ na-azụ. Azịza
3. Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya
Ụnụ akpọchila obi ụnụ dịka ụnụ mere na Meriba
na n’ụbọchị ahụ na Masa n’ ime ọzara.
Mgbe nnanna ụnụ ha nwalere m
mgbe ha nwalere m, na-agbanyeghị na ha hụrụ ihe m mereela ha. Azịza
MBEKU – 2 Kọr 5:19
Alleluia, Alleluia
Chineke sitere na Kristi na-eme ka ya na ụwa dị na mma; O tinyekwala n’aka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ.
Alleluia.
OZIỌMA – 16:13-23
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe Jesu bịaruru n’ obodo Sizeria Filipi, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-ekwu na nwa nke mmadụ bụ?” Ha sịrị ya “Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ Jọn onye na-eme mmirichukwu.
Ndị ọzọ na ekwu na ọ bụ Elaịja. Ma ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ Jeremaya mọbụ otu onye n’ime ndị amụma.” Ma ọ jụrụ ha sị, “Onye ka ụnụ na-ekwu na m bụ?”
Saịmọn Pita zara sị, “Ị bụ Kristi nwa nke Chukwu dị ndụ.” Jesu wee zaa ya sị, “Ị bụ onye gọziri agọzi Saịmọn nwa Jọna!
N’ihina ọ bụghị mmadụ kpugheere gị eziokwu nke a kama ọ bụ Nna m nke bi n’eluigwe. Ya bụ, agwa m gị, ngị bụ Pita, n’elu okwute a ka m ga arụkwasị nzukọ m, ọnụụzọ ọkụmmụọ agaghị emerinata ya.
Aga m achinye gị mkpịsịigodo nke Alaeze eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ n’ elu ụwa a ga ekekwa ya n’eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-atọpụ agbụ n’elu ụwa, a ga-atọpụkwa ya n’eluigwe.”
Mgbe ahụ ọ dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka na ntị ka ha ghara ịgwa onye ọbụla na ọ bụ ya bụ Kristi. Site n’oge ahụ, Jesu malitere igosị ndị na-eso ụzọ ya, na ya ga-agarịrị Jerusalem ebe ọ ga-ata ọtụtụ ahụhụ site n’aka ndị okenye, ndị isi nchụaja na ndị odeakwụkwọ.
A ga-egbu ya ma ọ ga-ekulikwa n’ụbọchị nke atọ.” Pita kpọọrọ ya jee n’akụkụ malite įịa ya ụta na-ekwu sị, “Chineke ekwela, Onyenweanyị ihe dị otu a agaghị eme gị.”
Ma Jesu tụgharịrị baara Pita mba sị, “Gaa m n’azụ ekwensu! Ị bụụrụ m ihe mgbochi! N’ihina uche gị abụghị nke Chineke, kama nke mmadụ.”
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.