Igbo Mass Readings for August 8 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 8 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 31:31-34
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Jeremiah
Lee oge na-abịa, ọ bụ Yahweh na-ekwu, mgbe mụ na ezinụụlọ Izrel na Juda ga-agba ndụ ọhụrụ. Ọ gaghị adịkwa ka ọgbụgbandụ nke mụ na nnanna ha n’ala ljipt, nke ha mebikwara n’agbanyeghị na m bụ nna ha ukwu, ọ bụ Yahweh na-ekwu.
Mana nke a bụ ọgbụgbandụ ga-adị n’etiti mụ na ụlọ Izrel mgbe ụbọchị ndị ahụ gafechara, ọ bụ Yahweh na-ekwu.
M ga-etinye iwu m n’ime ha, dekwaa ya n’ime obi ha: Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụ ndị nke m.
O nwekwaghị ka agbataobi mmadụ mọbụ nwanne mmadụ n’ụlọ Izrel kuziere onwe ha sị, ‘Maranụ Yahweh,’ n’ihina ha niile ga-amata m bido n’onye kacha nta n’etiti ha ruo n’onye kachasị elu, Yahweh kwuru nke a; n’ihina aga m agbaghara ha mmehie ha niile, agaghị m echetakwa mmehie ha ọzọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 51: 10-11,12-13, 16-17
Azịza: Chineke kenye obi dị ọcha n’ime m.
1. Chineke kenye obi dị ọcha n’ime m
tinye n’ime m mmụọ ọhụrụ na nke siri ike.
Achụpụkwala m n’ihu gị.
anapụkwala m mmụọ nsọ gị. Azịza
2. Nyeghachikwa m añụrị nke nzọpụta gị,
were ezi mmụọ gị chedo m.
Aga m akụziri ndị ajọ mmadụ ụzọ gị,
Ka ndị njọ lọghachita azụ n’ebe ị nọ. Azịza
3. Ị naghị enwe mmasị ọbụla n’aja,
Aja nsureọkụ anaghị atọ gị ụtọ,
Aja a na-achụrụ Chineke bụ obi gbawara agbawa,
Ị naghị ajụ obi gbawara agbawa na nke loghara elogha. Azịza
MBEKU – 2 Kọr 5:19
Alleluia, Alleluia
Chineke sitere na Kristi na-eme ka ya na ụwa dị na mma; O tinyekwala n’aka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ.
Alleluia.
OZIỌMA – 16:13-23
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe Jesu bịaruru n’ obodo Sizeria Filipi, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-ekwu na nwa nke mmadụ bụ?” Ha sịrị ya “Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ Jọn onye na-eme mmirichukwu.
Ndị ọzọ na ekwu na ọ bụ Elaịja. Ma ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ Jeremaya mọbụ otu onye n’ime ndị amụma.” Ma ọ jụrụ ha sị, “Onye ka ụnụ na-ekwu na m bụ?”
Saịmọn Pita zara sị, “Ị bụ Kristi nwa nke Chukwu dị ndụ.” Jesu wee zaa ya sị, “Ị bụ onye gọziri agọzi Saịmọn nwa Jọna!
N’ihina ọ bụghị mmadụ kpugheere gị eziokwu nke a kama ọ bụ Nna m nke bi n’eluigwe. Ya bụ, agwa m gị, ngị bụ Pita, n’elu okwute a ka m ga arụkwasị nzukọ m, ọnụụzọ ọkụmmụọ agaghị emerinata ya.
Aga m achinye gị mkpịsịigodo nke Alaeze eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ n’ elu ụwa a ga ekekwa ya n’eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-atọpụ agbụ n’elu ụwa, a ga-atọpụkwa ya n’eluigwe.”
Mgbe ahụ ọ dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka na ntị ka ha ghara ịgwa onye ọbụla na ọ bụ ya bụ Kristi. Site n’oge ahụ, Jesu malitere igosị ndị na-eso ụzọ ya, na ya ga-agarịrị Jerusalem ebe ọ ga-ata ọtụtụ ahụhụ site n’aka ndị okenye, ndị isi nchụaja na ndị odeakwụkwọ.
A ga-egbu ya ma ọ ga-ekulikwa n’ụbọchị nke atọ.” Pita kpọọrọ ya jee n’akụkụ malite įịa ya ụta na-ekwu sị, “Chineke ekwela, Onyenweanyị ihe dị otu a agaghị eme gị.”
Ma Jesu tụgharịrị baara Pita mba sị, “Gaa m n’azụ ekwensu! Ị bụụrụ m ihe mgbochi! N’ihina uche gị abụghị nke Chineke, kama nke mmadụ.”
Igbo Mass Readings for August 9 2024, Fraịde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for August 8 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.