Igbo Mass Readings for July 1 2027, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 1 2027, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 22:1-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
O ruru otu oge, Chineke nwalere Abraham. Ọ kpọrọ ya, “Abraham, Abraham!” Abraham azaa sị, “Anọ m ebe a.” Chineke gwara ya sị, “Were nwa gị nwoke, otu mkpụrụ nwa gị nwoke Aịzik nke ị hụrụ n’anya, gaa n’ala nke Moria”.
Ebe ahụ ị ga-eji ya chụọ aja nsureọkụ n’elu ugwu nke m ga-egosi gị”. N’isi ụtụtụ echi ya, Abraham jikwara ịnyịnya ibu ya, kpọrọ ụmụodibo ya abụọ tinyere onwe ya na nwa ya nwoke Aịzik.
O butere ukwu nkụ maka aja nsureọkụ ahụ wee malite njem ya n’ebe ahụ Chineke gwara ya. N’ụbọchị nke atọ, Abraham letịrị anya ya hụ ebe ahụ n’ebe dị anya sị ha, “nọdụnụ ebe a ụnụ na ịnyịnyaibu”.
Abraham wee gwa ụmụodibo ya; “Mụ na nwatakịrị a ga eje ebe ahụ fee Chineke, e mechaa anyị ga-alọghachikwute ụnụ”. Abraham were ukwu nkụ ahụ bụ maka aja nsureọkụ bo ya Aịzik, ma bute ọkụ na mma n’onwe ya.
Ha abụọ wee gaba. Aịzik wee kpọọ Abraham sị, “Nna m”. Abraham aza ya, “Ee nwa m” ọ sị ya, “Lee ọkụ na nkụ ebe a, ma olee nwaatụrụ a ga-eji chụọ aja nsureọkụ?” Abraham zaghachiri, nwa m, Chineke n’onwe ya ga-ewete nwaatụrụ maka aja nsureọkụ ahụ”.
Ha abụọ wee na-aga. Oge ha bịarutere n’ebe ahụ nke Chineke gosiri ya, Abraham wuru ekwuaja n’ebe ahụ, ma hazie nkụ ahụ.
Ọ bịa kee nwa ya nwoke Aịzik eriri tụkwasa ya n’elu nkụ ahụ n’ebe nchụaja. Abraham setịrị aka ya were mma ahụ igbu nwa ya nwoke. Ma mmụọọma nke Yahweh si n’Eluigwe kpọọ ya oku sị, “Abraham, Abraham” Ọ zara sị, “Anọ m ebe a”.
Mmụọọma ahụ sịrị ya, “Emetụkwala nwatakịrị ahụ aka ọbụla. Emerụkwala ya ahụ, n’ihina ugbu a ahụla m na ị hụrụ m n’anya”. Mgbe o lelitere anya ya elu, Abraham hụrụ otu ebule nke mpi ya konyere n’ọhịa.
Abraham weere ebule ahụ chụọ aja nsureọkụ n’ọnọdụ nwa ya nwoke. Abraham kpọrọ ebe a: “Yahweh wetere”. Ya mere e ji ekwu taa sị: n’elu ugwu, Yahweh ga-ewete.
Mmụọọma nke Yahweh si n’Eluigwe kpọọ Abraham nke ugboro abụọ sị: “Eji m onwe m añụ iyi, ọ bụ Yahweh na ekwu, n’ihina i mere nke a, n’ihina ị jụghị inye m otu nwa gị nwoke ị hụrụ n’anya, aga ma awụkwasa gị ngọzi, mee ka ụmụụmụ gị dị ụbara dịka kpakpando nke Eluigwe na mkpụrụ aja nke dị n’akụkụ mmiri.
Ụmụ gị ga-emeri ndịiro ha niile. Mba niile nọ n’elu ụwa ga-agọzi onwe ha site n’ụmụụmụ gị, n’ihina i rubeere m isi”. Abraham lọghachikwutere ụmụodibo ya, ha wee gaba obodo Biasheba; Abraham wee biri n’obodo Biasheba.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 115:1-2, 3-4, 5-6, 8-9
Azịza: A ga m aga ije n’ihu nke Dinwenụ, n’ala nke ndị dị ndụ
1. Ọ bụghị maka anyị, O Onyenweanyị, ọ bụghị maka anyị,
kama ka e nye aha gị otito
n’ihina ịkwụdosiriike n’ịhụnaanya gị na n’ihi eziokwu gị.
Maka gịnị ka ndị mba ọzọ ga-eji na-asị,
olee ebe Chineke ha nọ?
Azịza: A ga m aga ije n’ihu nke Dinwenụ, n’ala nke ndị dị ndụ
2. Chineke anyị nọ n’eluigwe,
na-eme ihe ọbụla masịrị ya.
Arụsị ha bụ ọlaọcha na ọlaedo,
ọrụ aka ndị mmadị.
Azịza: A ga m aga ije n’ihu nke Dinwenụ, n’ala nke ndị dị ndụ
3. Ha nwere ọnụ, ma ha anaghị ekwu okwu
Nwee anya, ma ha anaghị ahụ ụzọ.
Ha nwere ntị ma ha anaghị anụ ihe,
imi, ma ha anaghị anụ isi ihe.
Azịza: A ga m aga ije n’ihu nke Dinwenụ, n’ala nke ndị dị ndụ
4. Ndị niile mere ha na-adị ka ha,
otu ahụkwa ka ha ga-adị bụ ndị niile tụkwasịrịobi na ha.
O Izrel, tụkwasịobi n’Onyenweanyị,
ya bụ onye enyemaka na onye ogbugbo gị.
Azịza: A ga m aga ije n’ihu nke Dinwenụ, n’ala nke ndị dị ndụ
MBEKU – Col 3:16, 17
Alleluia, Alleluịa:
Na-enyenụ Chukwu Nna ekele site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi. Ka okwu nke Kristi biri n’ime ụnụ n’uju ya.
Alleluia.
OZIỌMA – 9:1-8
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu banyere n’ụgbọ, gafee n’ofe osimiri, bịaruo n’obodo ya. Mgbe ahụ, ha butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya nwụrụ anwụ nke dina n’elu akwa, mgbe Jesu hụrụ okwukwe ha, ọ gwara onye ọrịa ahụ sị: “Nwa m, obi sie gị ike, a gbagharala gị njọ gị niile!”
Ụfọdụ ndị odeakwụkwọ na-ekwukọrịta n’etiti onwe ha sị, “Nwoke a ekwuola arụ”. Ma Jesu maara ihe ha na-eche n’obi ha wee sị ha, “Gịnị mere ụnụ ji eche ihe ọjọọ n’obi ụnụ?
Olee nke ka mfe, ikwu, ‘a gbagharala gị njọ gị niile’ ka ọ bụ ị sị: ‘bilie ma gabakwa ije? lji mee ka ụnụ mara na Nwa nke mmadụ nwere ike ịgbaghara njọ n’elu ụwa, ọ gwara nwoke ahụ akụkụ ahọ ya nwụrụ anwụ sị, ‘Bilie, buru akwa gị laba.
O biliri laba n’ụlọ ya. Mgbe igwe mmadụ niile nọ ebe ahụ hụrụ nke a, egwu tụrụ ha. Ha nyere Chineke otito, onye nyere mmadụ ike dị otu a.
Igbo Mass Readings for July 2 2027, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for July 1 2027, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.