Igbo Mass Readings for July 20 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 20 2023, Tọọzde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:11-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ
Mana (mgbe Mosis nụrụ olu ahụ si n’ọhịa na-agba ọkụ, ọ) jụrụ Chineke sị, “Onye ka m bụ m ga-eji gakwuru Fero wee kpọpụta ụmụ Izrel n’ala ijipt?”
Chineke zara ya sị, “Aga, anọnyere gị, ma nke a bụ ihe ga-egosi gị na ọ bụ m zigara gị, mgbe i dupụtachara ụmụ Izrel site n’ala Ijipt, ụnụ ga-efe Chineke ofufe n’elu ugwu a”.
Mosis jụrụ Chineke sị, “Ọ bụrụ na m agwa ụmụ Izrel sị, ‘Chineke nke nnanna ụnụ ha zitere m n’etiti ụnụ’ ha jụọ m sị, ‘Gịnị bụ aha ya?’ Gịnị ka m ga-agwa ha?”
Chineke zara Mosis sị, “ABỤ M ONYE M BỤ”. Ọ gwakwara ya sị, “Gwa ụmụ Izrel nke a ‘Abụ m’ ziteere m ụnụ. Chineke gwakwara Mosis sị, “Gwa ụmụ Izrel nke a, ‘Yahweh, Chineke nke nnanna ụnụ ha, Chineke nke Abraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb, zitere m nye ụnụ’.
Nke a bụ aha m ebeebe, otu a ka a ga-esi na-echeta m site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ. Gaa ka ị kpọkọta ndị okenye Izrel ma gwa ha nke a.
‘Yahweh, Chineke nke nnanna ụnụ ha, Chineke nke Abraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb bịakwutere m sị m, “Elekwasịla m ụnụ anya wee hụ ihe a na-eme ụnụ n’ala Ijipt.
Ana m ekwe ụnụ nkwa na aga m akpọpụta ụnụ n’ahụhụ nke ljipt wee kpọbata ụnụ n’ala ndị Kenaan, ndị Hit, ndị Amọ, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus bụ ala nke jupụtara na mmiriara ehi na mmanụañụ”.
Ha ga-ege gị ntị, ma gị onwe gị na ndị okenye Izrel ga-agakwuru eze ndị ljipt gwa ya nke a, “Yahweh Chineke nke ndị Hibru abịakwutela anyị; ma ugbu a, anyị na arịọ gị ka ị hapụ anyị ka anyị gaa njem mkpụrụ ụbọchị atọ n’ime ọzara gaa chụọrọ Osebụrụwa Chineke anyị aja, Ama m na eze ndị ljipt agaghị ekwe ka ụnụ laa naanị ma e ji aka ike sochie ya.
Maka ihi nke a aga m esetịpụ aka m rụọ ọrụ dị ịtụnaanya megide ala ljipt. Nke ahụ mechaa ọ ga-ahapụzi ụnụ ka ụnụ laa.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 105:1, 5, 8-9, 24-25, 26-27
Azịza: Ọ na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebeebe.
1. Alleluịa, Nyenụ Chineke ekele, kpọkuonụ aha ya,
kwupụtaranụ mba niile ọrụ ebube ya!
Chetanụ ọrụ ebube niile ọ rụrụ,
ọrụ ịtụnaanya ya niile, na ikpe niile si n’ọnụ ya pụta. Azịza
2. Ọ na-akpachapụrụ ọgbụgbandụ ya anya ebeebe,
iwu nke o tiiri puku agbụrụ gara aga,
ọgbụgbandụ ya na Abraham gbara
na iyi nke ọ ñụụrụ Aịzik. Azịza
3. Onyenweanyị mere ndị nke ya ha mụta ọtụtụ ụmụ,
o mere ha dị ike karịa ndị na-emekpa ha ahụ.
Ọ gbanwere obi ha, ka ha wee kpọọ ndị nke ya asị,
ka ha na-aghọrọ ụmụodibo ya aghụghọ. Azịza
4. zigara nwodibo ya Mosis
ya na Erọn, onye nke ọ họọrọ.
Ebe ahụ, ha gosiri akara ya dị icheiche,
na ọrụ ebube dị icheiche n’ala Ham. Azịza.
MBEKU – Jọn 14:5
Alleluia, Alleluia:
Mụ onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla ga-abịakwute Nna ma ọ bụghị site na M.
Alleluia.
OZIỌMA – 11:28-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu kwuru sị, “Bịakwutenụ m, ụnụ niile ndị na-adọgbu onwe ụnụ n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, aga m enye ụnụ ezumike.
Nyaranụ ịnyagba nke m n’olu ụnụ; mụtakwanụ ihe n’omume m, n’ihina adị m nwaayọ dịkwa obi umeala. Ụnụ mee otu a, obi ụnụ ga-enweta ezumike. N’ihina ịnyagba m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.