Igbo Mass Readings for July 18 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 18 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 26:7-9, 12, 16-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Isaiah
Ụzọ nke onye eziomume kwụ ọtọ; ịna-eme ka ụzọ nke ọ na-aga na ya dị larịị. N’usoro ikpe gị anyị chekwubere na gị O Osebụrụwa; ncheta nke aha gị bụ ihe mmụọ anyị na-achọ.
Mkpụrụobi m na-achọ gị n’abalị, mmụọ m na-achọsi gị ike. N’ihina mgbe ikpe gị pụtara ihe n’elu ụwa, ndị bi n’ụwa ga-amụta eziomume.
O Osebụrụwa! ị ga-enye anyị udo n’ihina ị na-akwụ onye ọbụla ụgwọ ka ọrụ ya siri dị. O Chineke! ha kpọkuru gị mgbe ha nọ na nsogbu; ha kpọkuru gị n’ekpere mgbe ị na-ata ha ahụhụ, I meela ka anyị tie mkpu akwa dị ka nwaanyị ime na-eme.
Anyị dị ime, ime mere anyị, ma ihe anyị mụpụtara bụ so ikuku. O nweghị ọrụ mgbapụta ọbụla anyị rụrụ n’ụwa, o nweghị ndị ga-ebi n’ụwa a mụrụ.
Ndị nke gị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ, ahụ ha ga ekulite. Ụnụ ndị nọ n’ili bilienụ kwebenụ ukwe añụrị! Dịka igirigi si ayọsa n’ala, otu ahụ ka Osebụrụwa ga-esi nyeghachi ndị nwụrụ anwụ ndụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 102:12-14, 15-17-18-20
Azịza: Onyenweanyị sitere n’eluigwe na-ele ụwa anya.
1. Mana gị Onyenweanyị na-achị ebeebe;
ndụdụgandụ niile na-echeta gị
Kulie ka i meere Zayọn ebere,
n’ihina oge ebere erugo izi ya amara gị.
Ụmụodibo gị hụrụ ya n’anya,
n’agbanyeghị na e tikpọọla ya. Azịza
2. Mba niile ga-atụ aha nke Onyenweanyị egwu,
ndịeze ụwa niile ga-asọpụrụ otito gị;
N’ihina Onyenweanyị ga-arụgharị Zayọn;
Mekwaa ka ahụ ebube ya.
Ọ ga-aza ekpere ndị ogbenye,
ọ gaghị ajụ arịrịọ ha. Azịza
3. Ka e debaa ihe ndị a n’akwụkwọ maka agbụrụ ndị ga-abịa n’ihu,
ka ndị niile amụbeghị amụ were nwee ike too Onyenweanyị
Onyenweanyị sitere n’ebe nke ya dị asọ were ledata anya,
O sitere n’eluigwe na-ele ụwa anya
Ka o were nụrụ ude ndị nọ na mkpọrọ na-asụ,
ka o were tọhapụ ndị a mara ikpe ọnwụ. Azịza
MBEKU – Jọn 14:5
Alleluia, Alleluia:
Mụ onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla ga-abịakwute Nna ma ọ bụghị site na M.
Alleluia.
OZIỌMA – 11:28-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu kwuru sị, “Bịakwutenụ m, ụnụ niile ndị na-adọgbu onwe ụnụ n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, aga m enye ụnụ ezumike.
Nyaranụ ịnyagba nke m n’olu ụnụ; mụtakwanụ ihe n’omume m, n’ihina adị m nwaayọ dịkwa obi umeala. Ụnụ mee otu a, obi ụnụ ga-enweta ezumike. N’ihina ịnyagba m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”
Igbo Mass Readings for July 19 2024, Fraịde n’ime Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for July 18 2024, Tọọzde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.